Ezikiel 5:1-17

  • Ezikiel mere ihe gosiri na a ga-ebibi Jeruselem (1-17)

    • Ezikiel onye amụma ga-akpụ isi ya ma kee ntutu ya ụzọ atọ (1-4)

    • Ndị Jeruselem na-eme ihe ọjọọ karịa mba ndị gbara ha gburugburu (7-9)

    • Ụzọ ahụhụ atọ a tara ndị na-enupụ isi (12)

5  “Gịnwa bụ́ nwa nke mmadụ, were mma agha dị nkọ mere agụba. Kpụọ isi gị na afụ ọnụ gị, jirikwa ihe e ji atụ̀ ihe kee ntutu gị ụzọ atọ.  Ụbọchị ole ị ga-anọchibido obodo a zuo, ị ga-anọ n’ime ya gbaa otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ntutu gị ahụ ọkụ.+ Ị ga-achịrịkwa otu ụzọ n’ụzọ atọ ọzọ, na-egbu ya mma agha gbaa obodo a gburugburu.+ Ị ga-aghasasịkwa otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ikpeazụ ka ikuku buru ya. M ga-amịrịkwa mma agha chụwa ha.+  “Chịrị ole na ole n’ime otu ụzọ n’ụzọ atọ ahụ fọrọnụ, jirikwa uwe gị fụchie ha.  Sikwa na nke ahụ fọrọnụ chịrị ụfọdụ chịba n’ọkụ ka ọkụ rechapụ ha. Ọkụ ga-esi na ha gazuo ebe niile n’Izrel.+  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Ebe a bụ Jeruselem. Emeela m ka ọ dịrị n’etiti mba dị iche iche. Ala dị iche iche gbakwara ya gburugburu.  Ma, ndị bi na ya emeghị ihe ndị m kpebiri. Ha edebeghịkwa iwu m. Ha na-eme ihe ọjọọ karịa mba na ala ndị gbara ha gburugburu.+ Ha ajụla ihe ndị m kpebiri. Ha anaghịkwa edebe iwu m.’  “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: ‘Unu na-enye nsogbu karịa mba niile gbara unu gburugburu. Unu anaghị edebe iwu m. Unu anaghị eme ihe m chọrọ,* kama, unu na-eme ihe mba ndị gbara unu gburugburu chọrọ.+  N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Jeruselem, m ga-emesi gị ike.+ M ga-atakwa gị ahụhụ. M ga-emekwa gị ihe ndị a n’ihu mba dị iche iche.+  M ga-eme gị ihe m na-emetụbeghị ndị ọ bụla nakwa ihe m na-agaghị eme ihe yiri ya ọzọ. M ga-eme gị ihe a n’ihi arụ niile ị kpara.+ 10  “‘“Ndị nna bi n’ime gị ga-eri ụmụ ha.+ Ụmụ ga-erikwa ndị nna ha. M ga-ata ndị bi n’ime gị ahụhụ, chụsasịakwa ndị gị niile fọrọnụ ebe niile.”’+ 11  “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, m ga-ajụ unu, ebe ọ bụ na unu ji arụsị unu niile na-asọ oyi na arụ niile unu kpara merụọ ụlọ nsọ m.+ Agaghị m emere unu ebere.* Agaghịkwa m enwere unu ọmịiko.+ 12  Ma ọrịa na-efe efe ma ụnwụ ga-ala otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ime unu n’iyi. A ga-eji mma agha gbuo otu ụzọ n’ụzọ atọ ọzọ gburugburu obodo a.+ M ga-achụsasị otu ụzọ n’ụzọ atọ fọrọnụ ebe niile. M ga-amịrịkwa mma agha chụwa ha.+ 13  M mechaa ha ihe a iji gosi na iwe ji m, obi ga-ajụrụ m. Iwe m ga-adajụ, obi ga-adịkwa m mma.+ Ha ga-amarakwa na mụnwa, bụ́ Jehova, kwuru ihe ndị a n’ihi na m chọrọ ka a na-efe naanị m.+ 14  “‘Jeruselem, m ga-eme ka ị tọgbọrọ nkịtị. Mba ndị gbara gị gburugburu na ndị niile na-agafe agafe ga-ejikwa gị na-abụ ndị ọzọ ọnụ.+ 15  Mgbe m ga-eji iwe na ọnụma kpee ndị bi na gị ikpe ma taa ha ezigbo ahụhụ, mba ndị gbara gị gburugburu ga na-achị ha ọchị, na-akwa ha emo.+ Ị ga-abụkwa ihe atụ e ji adọ ndị ọzọ aka ná ntị. Ihe m ga-eme gị ga-emekwa ka egwu jide mba ndị ahụ. Ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, kwuru ihe a. 16  “‘M ga-eji ụnwụ sụọ ndị bi na gị akwụ ka à ga-asị na a gbara ha akụ́ nke ga-ebibi ha.+ M ga-eme ka ụnwụ ahụ sie ike nke na a gaghị enwe ebe a ga-esi na-enweta nri.*+ 17  M ga-eme ka ụnwụ na ajọ anụ ọhịa+ mee gị ihe. Ihe ndị a ga-emekwa ka ị gbara aka nwa. M ga-ejikwa ọrịa na-efe efe na mma agha mee gị ihe.+ Ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, kwuru ihe a.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “kpebiri.”
Na Hibru, “Anya m agaghị emere unu ebere.”
Na Hibru, “m ga-agbajisị osisi unu ji ekonye achịcha.” O nwere ike ịbụ osisi e ji ekowe achịcha ka ọ ghara imebi.