Ezikiel 23:1-49

  • Ụmụnne abụọ ndị hapụrụ di ha gaa na-akwa iko (1-49)

    • Ohola na ndị Asiria na-akwa iko (5-10)

    • Oholiba na ndị Babịlọn nakwa ndị Ijipt na-akwa iko (11-35)

    • Ahụhụ a ga-ata ụmụnne abụọ ahụ (36-49)

23  Jehova gwara m okwu ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, e nwere ụmụ nwaanyị abụọ otu nne ji.+  Ha malitere ịgba akwụna n’Ijipt.+ Ha bidoro ịgba akwụna mgbe ha bụ ụmụ agbọghọ. N’ebe ahụ ka a nọ pịa ha aka n’ara. A pịrị ha aka n’ara n’oge ha na-amabeghị nwoke.  Aha nke okenye bụ Ohola,* aha nke ntakịrị abụrụ Oholiba.* Ha ghọrọ ndị nke m, mụọkwara m ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. Ohola bụ Sameria,+ Oholiba abụrụ Jeruselem.  “Ohola malitekwara ịgba akwụna+ mgbe ọ bụ nke m. Ọ na-agụsi ya ike ka ya na ndị Asiria, bụ́ ndị agbata obi ya,+ ha na ya na-eme enyi, dinaa.+  Ha bụ ndị gọvanọ ndị yi uwe na-acha anụnụ anụnụ na ndị osote onye na-achị achị. Ha niile bụcha ụmụ okorobịa mara mma, ndị ịgba ịnyịnya doro anya.  Ọ nọ na-agba akwụna, ya na ndị niile kacha mma n’ụmụ nwoke ndị Asiria ana-edina. O jikwa arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi* merụọ onwe ya,+ ya bụ, arụsị nke ndị ahụ ọ na-agụsi ya ike ka ya na ha dinaa.  Ọ hapụghị akwụna ọ malitere ịgba n’Ijipt, n’ihi na ha na ya dinara mgbe ọ bụ nwa agbọghọ. Ha pịkwara ya aka n’ara mgbe ọ na-amabeghị nwoke. Ha nọkwa na-achụ ya ka ha na ya dinaa.*+  Ọ bụ ya mere m ji nyefee ya n’aka ndị ya na ha na-eme enyi, ya bụ, ndị Asiria,+ ndị ọ na-achọsi ike ka ya na ha dinaa. 10  Ha gbara ya ọtọ,+ kpụrụ ụmụ ya ndị nwoke na ụmụ ya ndị nwaanyị,+ jirikwa mma agha gbuo ya. Ụmụ nwaanyị makwa ya ka onye ọjọọ. Ndị Asiria takwara ya ahụhụ. 11  “Mgbe nwanne ya nwaanyị bụ́ Oholiba hụrụ ihe ọ na-eme, ịkwa iko gụsiwere ya ike, akwụna nke ya akarịzie nke nwanne ya nwaanyị.+ 12  Ọ nọ na-achọsi ike ka ya na ndị Asiria, bụ́ ndị agbata obi ya, dinaa,+ ya bụ, ndị gọvanọ na ndị osote onye na-achị achị. Ha na-eyi uwe mara ezigbo mma, na-agbakwa ịnyịnya. Ha niile bụcha ụmụ okorobịa mara mma. 13  Mgbe o merụrụ onwe ya, m hụrụ na ha abụọ na-akpa otu àgwà.+ 14  Ma ọ nọ na-agbakwu akwụna. Ọ hụrụ ụmụ nwoke ndị Kaldia a tụrụ n’ahụ́ ụlọ. E ji ihe na-acha uhie uhie* tụọ ha. 15  Ha kere ájị̀ n’úkwù, keekwa ogologo ákwà n’isi. Ha yiri ndị dike n’agha. Ha niile yiri ndị Babịlọn, ndị a mụrụ n’ala ndị Kaldia. 16  Ozugbo ọ hụrụ ha, ọ malitere ịchọ ka ya na ha kwaa iko. O zikwara ndị mmadụ ka ha gaa Kaldia zie ha ozi.+ 17  Ndị Babịlọn nọkwa na-abịa, ha na ya ana-akwa iko n’àkwà* ya. Mgbe ha merụchara ya, ọ* jụrụ ha maka na ha na-asọzi ya oyi. 18  “Ebe ọ nọ na-agba akwụna n’asọghị anya, na-agbakwa onwe ya ọtọ,+ ihe ya sọwara m oyi, mụ ajụ ya otú m* jụrụ nwanne ya nwaanyị.+ 19  Ọ nọ na-agba akwụna n’ike n’ike,+ nke na o chetara mgbe ọ bụ nwa agbọghọ nọrọ n’Ijipt na-agba akwụna.+ 20  Ọ na-agụ ya agụụ ka ya na ndị ha na ya na-eme enyi dinaa. Ọ na-akpa àgwà ka ndị iko ụmụ nwoke ihe ha ji bụrụ nwoke yiri nke jakị na nke ịnyịnya. 21  Oholiba, ị na-achọsi ike ịna-eme omume rụrụ arụ i mere mgbe ị bụ nwa agbọghọ, n’oge ị nọ n’Ijipt+ ha ana-apị gị aka n’ara.+ 22  “N’ihi ya, Oholiba, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru gbasara gị, sị, ‘M ga-eme ka ndị gị na ha na-eme enyi mee gị ihe,+ ya bụ, ndị ihe ha sọwara gị* oyi gị ajụ ha. M ga-esi ná mpaghara niile kpọta ha ka ha mee gị ihe.+ 23  Ndị m ga-akpọta bụ ndị Babịlọn+ na ndị Kaldia niile,+ ndị Pikọd+ na Shoa na Koa, ha na ndị Asiria niile. Ha niile bụ ụmụ okorobịa mara mma. Ha bụ ndị gọvanọ na ndị osote onye na-achị achị, ndị dike n’agha na ndị a na-akwanyere ùgwù.* Ha niile na-agba ịnyịnya. 24  Ha na ìgwè ndị agha ga-eji ụgbọ ịnyịnya agha ndị ụkwụ ha na-eme mkpọtụ bata lụso gị agha. Ha ga-ejikwa ọta ukwu na ọta nta na okpu agha. Ha ga-agba gị gburugburu lụso gị agha. M ga-enyekwa ha ikike ka ha kpee gị ikpe. Ha ga-ekpekwa gị ikpe otú masịrị ha.+ 25  M ga-ewesa gị iwe. Ha ga-ejikwa ezigbo iwe mee gị ihe. Ha ga-ebepụ ma imi gị ma ntị gị. A ga-ejikwa mma agha gbuo ndị gị fọrọ afọ. Ha ga-akpọrọ ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwaanyị. Ọkụ ga-erepịakwa ndị gị fọrọ afọ.+ 26  Ha ga-eyipụ gị uwe gị,+ jichiekwa ọmarịcha ihe ndị i ji achọ mma.+ 27  M ga-eme ka ị kwụsị omume rụrụ arụ ị na-eme nakwa akwụna+ ị malitere ịgba n’Ijipt.+ Ị ga-akwụsị ile ha anya. Ị gaghịkwa echeta Ijipt ọzọ.’ 28  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Obere oge ugbu a, m ga-enyefe gị n’aka ndị ị kpọrọ asị, ndị ị* jụrụ maka na ha na-asọ gị oyi.+ 29  Ha ga-eji obi ọjọọ napụ gị ihe niile ị tara ahụhụ nweta,+ gbaakwa gị ọtọ, gị aghara iyi uwe ọ bụla. A ga-eme ka a mara iko ị na-akwa na omume rụrụ arụ ị na-eme nakwa akwụna ị na-agba.+ 30  A ga-eme gị ihe ndị a n’ihi na ị na-achụ mba dị iche iche dị ka nwaanyị akwụna.+ I jirikwala arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi merụọ onwe gị.+ 31  Ị na-akpa àgwà ka nwanne gị nwaanyị.+ M ga-ewerekwa iko ya nye gị.’+ 32  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Ị ga-aṅụ ihe nwanne gị nwaanyị ṅụrụ, ya bụ, ihe dị n’iko dị ogologo ma saa mbara.+ A ga na-achị gị ọchị, na-akwakwa gị emo, n’ihi na ihe dị n’iko ahụ hiri nne.+ 33  Ị ga-aṅụ ihe dị n’iko nwanne gị nwaanyị bụ́ Sameria, ṅụjuo afọ. Ị ga-aṅụrọ anya, rujuokwa uju afọ. Ihe a ga-eme gị ga-eju ndị mmadụ anya. Ị ga-atọgbọrọkwa nkịtị. 34  Ị ga-aṅụ ihe dị n’iko ahụ, ṅụkpọọ ya.+ Iko ahụ ga-akụri, gị ataa mpekere ya. Ị ga-adọpụkwa ara gị abụọ. “Ọ bụ mụnwa kwuru ya.” Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.’ 35  “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Ebe ọ bụ na i chefuola m, o nweghịkwa ihe i ji m kpọrọ,*+ ị ga-ata ahụhụ maka omume rụrụ arụ ị na-eme nakwa maka akwụna ị na-agba.’” 36  Jehova gwaziri m, sị: “Nwa nke mmadụ, m chọrọ ka ị gwa Ohola na Oholiba+ na ikpe mara ha, gwakwa ha arụ niile ha na-akpa. 37  Ha na-akwa iko,*+ ọbara dịkwa ha n’aka. Ọ bụghị naanị na ha na arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi na-akwa iko, kamakwa, ha na-akpọ ụmụ ha mụụrụ m ọkụ iji chụọrọ arụsị dị iche iche àjà, arụsị ndị a ejirikwa ha mere nri.+ 38  Ihe ọzọ ha mere m bụ na ha merụrụ ụlọ nsọ m n’otu ụbọchị ahụ ha ji ụmụ ha chụọ àjà. Ha mebikwara ụbọchị izu ike m. 39  Mgbe ha ji ụmụ ha chụchaara arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi àjà,+ ha bịara n’ụlọ nsọ m n’otu ụbọchị ahụ ma merụọ ya.+ Ihe a ka ha mere n’ime ụlọ nsọ m. 40  Ha ziri mmadụ ozi ka ọ gaa ebe dị anya kpọọ ndị mmadụ ka ha bịa.+ Mgbe ndị ahụ ọ kpọrọ nọ na-abịa, gịnwa bụ́ Oholiba sara ahụ́, tee uri anya, jirikwa ihe dị iche iche e ji achọ mma chọọ onwe gị mma.+ 41  Ị nọdụkwara ọdụ n’otu ọmarịcha oche,+ nke a dọsara tebụl n’ihu ya.+ I dosakwara insens m+ na mmanụ m+ n’elu tebụl ahụ. 42  A nụkwara mkpọtụ ìgwè mmadụ na-ejighị ihe akpọrọ ihe nọ n’ụlọ nsọ m na-eme. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị aṅụrụma e si n’ala ịkpa kpọrọ bịa. Ha gbanyekwara ụmụnne abụọ ahụ ọla n’aka, kpuwekwa ha okpueze mara mma. 43  “M kwuziri banyere nwaanyị ahụ ahụ́ gwụrụla n’ihi ịkwa iko, sị: ‘Ọ ka ga na-agba akwụna.’ 44  Ndị mmadụ nọ na-abịakwute ya otú e si abịakwute nwaanyị na-agba akwụna. Ọ bụ otú ahụ ka ha si na-abịakwute Ohola na Oholiba, bụ́ ụmụ nwaanyị na-eme omume rụrụ arụ. 45  Ma, ọ bụ ndị ezi omume ga-ekpe ya* ikpe e kwesịrị ikpe ndị na-akwa iko+ na ndị na-egbu mmadụ.*+ A ga-ekpe ha ikpe maka na ha bụ ụmụ nwaanyị na-akwa iko, ọbara dịkwa n’aka ha.+ 46  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘A ga-akpọkọta ndị agha ka ha bịa lụso ha agha. Ha ga-emekwa ha ihe ga-eju ndị mmadụ anya, bukọrọkwa ihe ha.+ 47  Ndị agha ahụ ga-atụ ha nkume,+ jirikwa mma agha ha gbuo ha. Ha ga-egbu ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị,+ gbaakwa ụlọ ha ọkụ.+ 48  M ga-emekwa ka a kwụsị ime omume rụrụ arụ n’obodo a. Ụmụ nwaanyị niile ga-amụta ihe n’ihe mere unu. Ha agaghịkwa eme omume rụrụ arụ unu na-eme.+ 49  Ndị agha ahụ ga-ata unu ahụhụ maka omume rụrụ arụ unu na-eme nakwa maka ofufe unu na-efe arụsị unu dị iche iche na-asọ oyi. Unu ga-amarakwa na m bụ Ọkaakaa Onyenwe unu bụ́ Jehova.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ohola pụtara “Ụlọikwuu Ya.”
Oholiba pụtara “Ụlọikwuu M Dị n’Ime Ya.”
Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
Ma ọ bụ “kwaa iko.”
Ma ọ bụ “ọbara ọbara.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Na Hibru, “ndị a na-akpọ òkù.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Na Hibru, “ị gbakụtala m azụ.”
Ya bụ, ha hapụrụ Chineke, gaa fewe arụsị.
Ọ ga-abụ Oholiba ka a na-ekwu gbasara ya.
Ma ọ bụ “na-awụfu ọbara.”