Ezikiel 16:1-63

  • Chineke hụrụ Jeruselem n’anya (1-63)

    • Chineke nyeere Jeruselem aka mgbe ọ dị ka nwa a jụrụ ajụ (1-7)

    • Chineke chọrọ Jeruselem mma, ha agbaakwa ndụ ịbụ di na nwunye (8-14)

    • Jeruselem hapụrụ di ya kwawa iko (15-34)

    • A tara Jeruselem ahụhụ maka iko ọ kwara (35-43)

    • Jeruselem na-eme ka Sameria na Sọdọm (44-58)

    • Chineke chetara ndụ ya na Jeruselem gbara (59-63)

16  Jehova gwara m okwu ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, gwa Jeruselem arụ niile ọ na-akpa.+  Kwuo sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gwara Jeruselem, sị: “N’ala ndị Kenan ka i si. Ọ bụkwa ebe ahụ ka a mụrụ gị. Nna gị bụ onye Amọraịt,+ nne gị abụrụ onye Het.+  N’ụbọchị a mụrụ gị, e bepụghị alọ otubo gị. E jighị mmiri saa gị ahụ́ ka ị dị ọcha. E teghị gị nnu, a fụchighịkwa gị ákwà.  E nweghị onye meteere gị ebere sị ka ya meere gị otu n’ime ihe ndị a. E nweghị onye nweere gị ọmịiko. Kama, n’ụbọchị a mụrụ gị, a tụsara gị n’ala nkịtị n’ihi na a kpọrọ gị* asị.  “‘“Mgbe m na-agafe ebe ị nọ, m hụrụ ka ọbara juru gị ahụ́, gị ana-agba lịkalịka. Ka ọbara juru gị ahụ́, m sịrị gị: ‘Ị ga-adị ndụ!’ M sịkwara gị mgbe ahụ ọbara juru gị ahụ́, ‘Dịrị ndụ!’  M mere ka ị dị ọtụtụ ka ahịhịa puru n’ọhịa. I mechakwara tolite ma dị ogologo, yirikwa ihe kacha mma e ji achọ mma. Ị kpụrụ ara abụọ. Ntutu isi gị tojukwara etoju. Ma, ị ka gba ọtọ n’eyighị ihe ọ bụla.”’  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Mgbe m na-agafe hụ gị, m chọpụtara na i toruola inwe onye ga na-agwa gị na ị dị ya n’obi. Ọ bụ ya mere m ji jiri uwe m kpuchie gị,+ kpuchiekwa ọtọ gị. M ṅụụrụ gị iyi, mụ na gị agbaa ndụ, gị abụrụkwa nke m.  M jikwa mmiri saa gị ahụ́, sachapụ ọbara dị gị n’ahụ́, teekwa gị mmanụ.+ 10  M yiwekwara gị uwe a kpara ihe, nye gị akpụkpọ ụkwụ e ji akpụkpọ anụ* rụọ, fụọkwa gị ezigbo ákwà linin n’isi ma jiri ákwà dị oké ọnụ kpuchie gị. 11  M jikwa ihe e ji achọ mma chọọ gị mma, gbanye gị ọla aka n’aka, yinyekwa gị ihe olu n’olu. 12  M gbanyekwara gị ọla imi n’imi, gbanye gị ọla ntị ná ntị, kpuwekwa gị okpueze mara mma n’isi. 13  I jikwa ọlaedo na ọlaọcha na-achọ onwe gị mma. E jikwa ezigbo ákwà linin na ákwà dị oké ọnụ kwaa uwe gị. I nwekwara uwe a kpara ihe. Nri gị bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, mmanụ aṅụ, na mmanụ. I tokwara, maa mma, bụrụ asampete.+ I mechakwara ruo eruo ịbụ eze nwaanyị.’” 14  “‘Aha gị deweziri ude ná mba dị iche iche+ n’ihi mma ị mara, maka na mma gị zuru okè n’ihi na m yiwere gị ebube m dị ka uwe.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.” 15  “‘Ma mma ị mara mechara buwe gị isi,+ gị ebido gbawa akwụna n’ihi ude aha gị na-ede.+ Gị na onye ọ bụla na-agafe agafe na-akwa iko.+ I sikwa otú ahụ na-enye ha onwe gị. 16  Ị chịịrị ụfọdụ n’ime uwe gị ndị mara mma, jiri ha chọọ ebe ndị dị elu ị rụrụ mma. Ị nọkwa ebe ndị ahụ na-agba akwụna.+ Ụdị ihe ndị ahụ ekwesịghị ịdị. E kwesịghịkwa ime ha ọzọ. 17  Ihe i ji achọ mma, ndị e ji ọlaedo na ọlaọcha m nyere gị rụọ, ka i ji kpụọrọ onwe gị arụsị ndị yiri ụmụ nwoke, gị na ha ana-akwa iko.+ 18  I ji uwe gị ndị a kpara ihe kpuchie ha,* jirikwa mmanụ m na insens m na-achụrụ ha àjà.+ 19  M nyere gị nri, ya bụ, ntụ ọka e gwere nke ọma, mmanụ, na mmanụ aṅụ. Ma, i ji ha chụọrọ arụsị ndị ahụ àjà ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma.*+ Ihe a ka i mere n’eziokwu.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.” 20  “‘I ji ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwaanyị ị mụụrụ m+ na-achụrụ arụsị ndị ahụ àjà.+ Akwụna ị na-agba ó zubereghị gị? 21  Ị na-egbu ụmụ m. Ị na-akpọ ha ọkụ, jiri ha na-achụrụ arụsị ndị ahụ àjà.+ 22  Ka ị na-akpa arụ a niile, na-agba akwụna, i chetaghị oge ị bụ nwata, mgbe ị gba ọtọ n’eyighị ihe ọ bụla, ọbara ejukwa gị ahụ́, gị ana-agba lịkalịka. 23  Ị ga-ata ezigbo ahụhụ n’ihi ihe ọjọọ a niile i mere.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a. 24  ‘Ị rụụrụ onwe gị ebe dị mkputamkpu, rụọkwara onwe gị ebe dị elu n’ámá ọ bụla. 25  Ị rụrụ ebe ndị dị elu n’ebe anya ndị mmadụ kacha aga n’okporo ámá ọ bụla. I mekwara ka mma ị mara bụrụ ihe rụrụ arụ, n’ihi na ị na-enye onye ọ bụla na-agafe agafe onwe gị,*+ na-agba akwụna gị n’esepụghị aka.+ 26  Ị gakwuuru ụmụ nwoke ndị Ijipt,+ ndị agbata obi gị ara ịkwa iko na-agba,* gị na ha ana-akwa iko. I jikwa akwụna ị na-agba n’esepụghị aka na-akpasu m iwe. 27  Ma, m ga-eweli aka m mee gị ihe. M ga-eselatakwa aka ná nri m na-enye gị.+ M ga-ahapụkwa ụmụ nwaanyị ndị Filistia, ndị kpọrọ gị asị,+ ndị omume rụrụ arụ ị na-eme na-awụ akpata oyi n’ahụ́,+ ka ha mee gị ihe ọ bụla masịrị ha.* 28  “‘Ebe ọ bụkwa na iko ị na-akwa anaghị eju gị eju, ị gakwuuru ụmụ nwoke ndị Asiria,+ gị na ha ana-akwa iko. Ma, nke gị na ha ejughịkwa gị afọ. 29  N’ihi ya, ị gbaara akwụna ruo n’ala ndị na-azụ ahịa,* ruokwa n’ala ndị Kaldia.+ Ma, nke gị na ha ejughịkwa gị afọ. 30  N’eziokwu, obi gị enweela nsogbu* n’ihi ihe a niile i mere, ya bụ, ịna-eme ka akwụna na-enweghị onye ọ na-asọ anya.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a. 31  Ma, mgbe ị rụụrụ onwe gị ebe dị mkputamkpu n’ebe anya ndị mmadụ kacha aga n’okporo ámá ọ bụla, rụọkwa ebe ndị dị elu n’ámá ọ bụla, i meghị ka akwụna n’ihi na i kweghị ka a na-akwụ gị ụgwọ. 32  Ị bụ nwaanyị na-akwa iko nke na-ahapụ di ya gakwuru ndị ọzọ, ya na ha ana-edina.+ 33  A na-enye ndị akwụna niile onyinye,+ ma, ọ bụ gịnwa na-enye ndị niile gị na ha na-eme enyi onyinye.+ Ị na-enyekwa ha aka azụ ka ha si ebe niile bịakwute gị ka gị na ha kwaa iko.+ 34  Otú i si agba akwụna dị iche n’otú ụmụ nwaanyị ndị ọzọ si agba. E nweghị onye gbatụrụla ụdị akwụna a ị na-agba. Ị na-akwụ ndị ọzọ ụgwọ, ma, hanwa anaghị akwụ gị. Akwụna nke gị dị iche.’ 35  “N’ihi ya, onye akwụna,+ nụrụ ihe Jehova kwuru. 36  Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Ebe ọ bụ na ara ịkwa iko na-agba gị, gị emeekwa ka ndị enyi gị na arụsị niile rụrụ arụ, ndị na-asọ oyi* ị na-efe,+ hụ ihe i ji bụrụ nwaanyị, gị ejirikwa ọbara ụmụ gị chụọrọ arụsị ndị ahụ àjà,+ 37  n’ihi ya, m ga-akpọkọta ndị enyi gị niile, bụ́ ndị ị na-eme obi ụtọ, kpọkọtakwa ndị niile ị hụrụ n’anya na ndị niile ị kpọrọ asị. M ga-esi ebe niile ha nọ kpọkọta ha ka ha lụso gị agha, gbaakwa ihe i ji bụrụ nwaanyị n’anwụ. Ha ga-ahụkwa gị ka ị gba ọtọ.+ 38  “M ga-ata gị ahụhụ a na-ata ụmụ nwaanyị hapụrụ di ha na-akwa iko+ nakwa ụmụ nwaanyị na-egbu mmadụ.*+ M ga-ejikwa iwe na ọnụma gbuo gị.+ 39  M ga-enyefe gị n’aka ndị enyi gị. Ha ga-akwatu ebe ndị dị mkputamkpu ị rụrụ, kwatuokwa ebe ndị dị elu ị rụrụ.+ Ha ga-eyipụ gị uwe gị,+ chịrị ọmarịcha ihe i ji achọ mma.+ Ha ga-agba gị ọtọ, gbaakwa gị n’anwụ. 40  Ha ga-akpọkọta ìgwè mmadụ ka ha lụso gị agha.+ Ha ga-atụ gị nkume,+ jirikwa mma agha ha gbuo gị.+ 41  Ha ga-agba ụlọ gị dị iche iche ọkụ,+ nọrọkwa n’ihu ọtụtụ ụmụ nwaanyị mee gị ihe m kpebiri. M ga-akwụsị akwụna ị na-agba.+ Ị ga-akwụsịkwa ịkwụ ndị ọzọ ụgwọ. 42  M ga-eme ka iwe m na-ewesa gị dajụọ.+ M ga-akwụsịkwa iwesa gị iwe dị ọkụ.+ M ga-anọ jii. Agaghịzi m ewere gị iwe.’ 43  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Ebe ọ bụ na i chetaghị oge ị bụ nwa agbọghọ,+ i wee mee ihe a niile kpasuo m iwe, m ga-eme ka i jiri isi gị buru ihe i metara. Ị ga-akwụsị omume ọjọọ ị na-eme, kwụsịkwa arụ niile ị na-akpa. 44  “‘Ndị mmadụ ga na-asị na ị bụ ome ka nne ya.”+ 45  Ị na-eme ka nne gị. Nne gị kpọrọ ma di ya ma ụmụ ya asị. Ị na-emekwa ka ụmụnne gị ndị nwaanyị. Ha kpọrọ di ha na ụmụ ha asị. Nne unu bụ onye Het, nna unu abụrụ onye Amọraịt.’”+ 46  “‘Nwanne gị nwaanyị nke tọrọ gị bụ Sameria.+ Ya na ụmụ ya ndị nwaanyị*+ bi n’ebe ugwu obodo gị.* Nwanne gị nwaanyị nke ị tọrọ bụ Sọdọm.+ Ya na ụmụ ya ndị nwaanyị+ bikwa n’ebe ndịda obodo gị.* 47  Ọ bụghị naanị na ị nọ na-akpa àgwà ka ha, na-akpakwa arụ ndị ha na-akpa, kama, o teghị aka, gị emewe omume ọjọọ karịrị nke ha na-eme.+ 48  Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, Sọdọm nwanne gị nwaanyị na ụmụ ya ndị nwaanyị emerubeghị ihe gị na ụmụ gị ndị nwaanyị na-eme. 49  Ihe Sọdọm bụ́ nwanne gị nwaanyị mere bụ: Ya na ụmụ ya ndị nwaanyị+ dị mpako.+ Ha nwere nri n’ụba.+ E nweghịkwa ihe na-echegbu ha n’ihi na ahụ́ ruru ha ala.+ Ma, ha enyereghị ndị na-ata ahụhụ na ndị ogbenye aka.+ 50  Ha akwụsịghị ịdị mpako.+ Ha nọkwa n’ihu m na-akpa arụ dị iche iche.+ N’ihi ya, m kpebiri ikpochapụ ha.+ 51  “‘Ndị Sameria+ emerughịkwa ọkara mmehie i mere. Ị nọ na-akpa arụ dị iche iche karịrị nke ha kpara. Arụ niile ị na-akpa mere ka o yie ka ụmụnne gị ndị nwaanyị hà bụ ndị ezi omume.+ 52  Ugbu a, a ga-emechu gị ihu ebe ọ bụ na i mere ka o yie ka ụmụnne gị ndị nwaanyị hà bụ ndị ezi omume.* Ha bụ ndị ezi omume karịa gị n’ihi na mmehie ndị ị na-eme jọrọ njọ karịa nke ha. N’ihi ya, a ga-emechu gị ihu, ihere ga-emekwa gị n’ihi na i mere ka ụmụnne gị ndị nwaanyị yie ndị ezi omume.’ 53  “‘M ga-akpọkọta ndị ha a dọọrọ n’agha, ya bụ, Sọdọm na ụmụ ya ndị nwaanyị a dọọrọ n’agha nakwa Sameria na ụmụ ya ndị nwaanyị a dọọrọ n’agha. M ga-akpọkọtakwa ndị nke gị niile a dọọrọ n’agha+ 54  ka e wee mechuo gị ihu. Ihere ga-emekwa gị n’ihi ihe i mere, ya bụ, obi ị kasiri ha. 55  Ụmụnne gị ndị nwaanyị, bụ́ Sọdọm na Sameria, ga-adịghachi otú ha dị na mbụ, ha na ụmụ ha ndị nwaanyị. Gịnwa na ụmụ gị ndị nwaanyị ga-adịghachikwa otú unu dị na mbụ.+ 56  E kwesịghị ịnụ gbasara Sọdọm bụ́ nwanne gị nwaanyị n’ọnụ gị n’ụbọchị ị dị mpako, 57  tupu a gbaa ihe ọjọọ ị na-eme n’anwụ.+ Obodo ndị dị na Siria na obodo ndị gbara ya gburugburu, obodo ndị dị na Filistia+ nakwa ndị niile gbara gị gburugburu na-akwa gị emo. 58  Ị ga-eji isi gị buru ihe si n’omume ọjọọ ị na-eme na arụ ị na-akpa.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.” 59  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘M ga-ata gị ahụhụ ihe i mere,+ n’ihi na i meghị ihe ị ṅụrụ n’iyi, si otú ahụ mebie ọgbụgba ndụ mụ na gị.+ 60  Ma, mụnwa ga-echeta ndụ mụ na gị gbara n’oge ị bụ nwa agbọghọ. Mụ na gị ga-agbakwa ndụ ga-adịru mgbe ebighị ebi.+ 61  Ị ga-echeta ihe i mere, ihere ga-emekwa gị+ mgbe ị ga-anabata ụmụnne gị ndị nwaanyị, ma ndị tọrọ gị ma ndị ị tọrọ. M ga-akpọnyekwa gị ha ka ha bụrụ ụmụ gị, ma ọ bụghị n’ihi ndụ mụ na gị gbara.’ 62  “‘Mụ na gị ga-agbakwa ndụ. Ị ga-amarakwa na m bụ Jehova. 63  Ị ga-echetazi ihe i mere. Ihere ga-emekwa gị imeghe ọnụ gị+ mgbe m ga-ekpuchiri gị mmehie n’agbanyeghị ihe niile i mere.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Ma ọ bụ “akpụkpọ anụ sil.”
Ya bụ, arụsị ndị ahụ yiri ụmụ nwoke.
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Na Hibru, “ị na-ajaghere onye ọ bụla na-agafe agafe ụkwụ gị.”
Na Hibru, “ndị agbata obi gị ahụ́ ha gbara agba.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
Na Hibru, “n’ala Kenan.”
O nwere ike ịbụ, “N’eziokwu, m na-ewesa gị ezigbo iwe.”
Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
Na Hibru, “na-awụfu ọbara.”
Ọ ga-abụ ime obodo ndị dị ya nso ka a na-ekwu ebe a.
Na Hibru, “n’aka ekpe gị.”
Na Hibru, “n’aka nri gị.”
Ma ọ bụ “ebe ọ bụ na ị na-agbachitere ụmụnne gị ndị nwaanyị.”