Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Diuterọnọmi

Isi

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Ndị Izrel si n’Ugwu Horeb pụọ (1-8)

    • A họpụtara ndị isi na ndị ikpe (9-18)

    • Ndị Izrel nupụrụ isi na Kedesh-bania (19-46)

      • Ha ekweghị abanye n’ala ahụ (26-33)

      • Ha emerighị ndị Kenan (41-46)

  • 2

    • Ndị Izrel gagharịrị n’ala ịkpa afọ iri atọ na asatọ (1-23)

    • Ndị Izrel meriri Saịhọn Eze Heshbọn (24-37)

  • 3

    • Ndị Izrel meriri Ọg Eze Beshan (1-7)

    • E kere ala dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Jọdan (8-20)

    • A gwara Joshụa ka ọ ghara ịtụ egwu (21, 22)

    • Mosis agaghị abanye n’ala ahụ (23-29)

  • 4

    • A gwara ndị Izrel ka ha rubere Chineke isi (1-14)

      • Unu echefula ihe ndị Chineke mere (9)

    • Jehova chọrọ ka a na-efe naanị ya (15-31)

    • E nweghị Chineke ọzọ ma e wepụ Jehova (32-40)

    • Obodo mgbaba ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Jọdan (41-43)

    • Iwu Mosis nyere ndị Izrel (44-49)

  • 5

    • Ndụ Jehova na ndị Izrel gbara na Horeb (1-5)

    • E chetaara ndị Izrel Iwu Iri ahụ (6-22)

    • Ndị Izrel tụrụ egwu n’Ugwu Saịnaị (23-33)

  • 6

    • Jiri obi gị niile hụ Jehova n’anya (1-9)

      • “Nụrụ, Izrel” (4)

      • Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịkụziri ụmụ ha ihe (6, 7)

    • Echefula Jehova (10-15)

    • Anwala Jehova ọnwụnwa (16-19)

    • Ihe ndị Izrel ga-akọrọ ụmụ ha (20-25)

  • 7

    • Mba asaa ndị Izrel ga-ebibi (1-6)

    • Ihe mere Chineke ji họrọ ndị Izrel (7-11)

    • Irube isi ga-eme ka ihe gaziere ndị Izrel (12-26)

  • 8

    • E chetaara ndị Izrel ihe ọma Jehova meere ha (1-9)

      • “Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ” (3)

    • Unu echefula Jehova (10-20)

  •   9

    • Ihe mere e ji nye ndị Izrel ala ahụ (1-6)

    • Ndị Izrel kpasuru Jehova iwe ugboro anọ (7-29)

      • Nwa ehi ọlaedo (7-14)

      • Mosis rịọchiteere ha arịrịọ (15-21, 25-29)

      • Ugboro atọ ọzọ ha kpasuru Chineke iwe (22)

  • 10

    • Mosis wapụtara mbadamba nkume abụọ ọzọ (1-11)

    • Ihe Jehova chọrọ (12-22)

      • Tụọ egwu Jehova, hụkwa ya n’anya (12)

  • 11

    • Unu ahụla otú Jehova si dị ukwuu (1-7)

    • Otú Ala Nkwa ahụ dị (8-12)

    • Uru irube isi ga-abara ndị Izrel (13-17)

    • Ndị Izrel kwesịrị ime ka okwu Chineke bamie n’obi ha (18-25)

    • ‘Ngọzi na ọbụbụ ọnụ’ (26-32)

  • 12

    • Ndị Izrel ga-efe Chineke n’ebe ọ họọrọ (1-14)

    • Ndị Izrel nwere ike iri anụ, ma ha agaghị eri ọbara (15-28)

    • Unu ekwela ka a rata unu ife chi ọzọ (29-32)

  • 13

    • Ihe a ga-eme ndị chọrọ ime ka ndị Izrel fee chi ọzọ (1-18)

  • 14

    • Ihe ndị a na-ekwesịghị ime mgbe a na-eru uju (1, 2)

    • Anụ ndị dị ọcha e nwere ike iri na ndị na-adịghị ọcha (3-21)

    • A ga-enye Jehova otu ụzọ n’ụzọ iri (22-29)

  • 15

    • Ná ngwụcha afọ asaa ọ bụla, ndị Izrel ga-akagbu ụgwọ e ji ha (1-6)

    • Inyere ndị ogbenye aka (7-11)

    • N’afọ asaa ọ bụla, a ga-ahapụ ndị ohu ka ha nwere onwe ha (12-18)

      • A ga-eji ihe kpọpuo ohu ntị (16, 17)

    • A ga-edo anụ ọ bụla e bụ ụzọ mụọ nsọ (19-23)

  • 16

    • Ememme Ngabiga; Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko (1-8)

    • Ememme Izu (9-12)

    • Ememme Ụlọ Ndò (13-17)

    • Ịhọpụta ndị ikpe (18-20)

    • Ihe a na-ekwesịghị ife ofufe (21, 22)

  • 17

    • E kwesịghị iji ihe nwere nkwarụ achụ àjà (1)

    • Ihe a ga-eme onye fere chi ọzọ (2-7)

    • Ihe a ga-eme ma okwu sie ike ikpebi (8-13)

    • Ihe eze ndị Izrel kwesịrị ime (14-20)

      • Eze ga-edepụtara onwe ya Iwu Chineke (18)

  • 18

    • Òkè ndị nchụàjà na ndị Livaị (1-8)

    • Ime mgbaasị adịghị mma (9-14)

    • Onye amụma nke dị ka Mosis (15-19)

    • Otú e si amata ndị amụma ụgha (20-22)

  • 19

    • Ikpe ọbara ịma mmadụ nakwa obodo mgbaba (1-13)

    • E kwesịghị iwela ihe e ji kpaa ókè azụ (14)

    • Ịgba akaebe mgbe a na-ekpe ikpe (15-21)

      • A ga-eji akaebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ bie okwu (15)

  • 20

    • Iwu e nyere ndị Izrel gbasara ịga agha (1-20)

      • Ndị na-agaghị aga agha (5-9)

  • 21

    • Ihe a ga-eme ma ọ bụrụ na a maghị onye gburu mmadụ (1-9)

    • Ihe onye Izrel ga-eme ma ọ chọọ ịlụ nwaanyị a dọtara n’agha (10-14)

    • Ihe ruuru ọkpara (15-17)

    • Ihe a ga-eme nwa na-eme isi ike (18-21)

    • Onye a kwụwara n’osisi bụ onye a bụrụ ọnụ (22, 23)

  • 22

    • Ihe mmadụ ga-emere anụmanụ onye agbata obi ya (1-4)

    • Nwaanyị ekwesịghị iyi ákwà nwoke (5)

    • Imere ụmụ anụmanụ ebere (6, 7)

    • Ịrụbichi ihe n’elu ụlọ (8)

    • Ihe ndị na-ekwesịghị ịgakọ (9-11)

    • Ndị Izrel ga-adụnye ihe dị yọrị yọrị n’isi ákwà ha (12)

    • Iwu e nyere gbasara inwe mmekọahụ na-ekwesịghị ekwesị (13-30)

  • 23

    • Ndị na-ekwesịghị iso n’ọgbakọ Chineke (1-8)

    • Ihe ndị Izrel ga-eme ka ebe ha mara ụlọikwuu dị ọcha (9-14)

    • Ihe a ga-eme ohu gbapụrụ n’aka nna ya ukwu (15, 16)

    • E nweghị onye Izrel ga-abụ akwụna (17, 18)

    •  Ịna ọmụrụ nwa na imezu nkwa (19-23)

    • Ihe onye na-agafe n’ubi mmadụ nwere ike iri (24, 25)

  • 24

    • Alụmdi na nwunye na ịgba alụkwaghịm (1-5)

    • E kwesịrị iji ndụ kpọrọ ihe (6-9)

    • Ichebara ndị ogbenye echiche (10-18)

    • Iwu e nyere gbasara iwere ihe fọrọ n’ubi (19-22)

  • 25

    • Ọnụ ụtarị ole e nwere ike ịpịa mmadụ (1-3)

    • Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha ọka (4)

    • Mmadụ ikuchi nwunye nwanne ya nwoke (5-10)

    • A gaghị anwụchi nwoke na-alụ ọgụ n’ihe o ji bụrụ nwoke (11, 12)

    • Ezigbo ihe e ji atụ̀ ihe (13-16)

    • Ndị Izrel kwesịrị ibibi ndị Amalek (17-19)

  • 26

    • Ndị Izrel ga-enye mkpụrụ mbụ ha (1-11)

    • Otu ụzọ n’ụzọ iri a ga-enye n’afọ nke atọ (12-15)

    • Ndị Izrel bụụrụ Jehova ndị pụrụ iche (16-19)

  • 27

    • A ga-ede Iwu ahụ na nkume (1-10)

    • Ndị ga-eguzo n’Ugwu Gerizim na n’Ugwu Ịbal (11-14)

    • Ọnụ a ga-abụ ndị mere ihe ọjọọ (15-26)

  • 28

    • Ihe ọma ndị ga-abịara ndị rubere isi (1-14)

    • Ihe ọjọọ ndị ga-eme ndị nupụrụ isi (15-68)

  • 29

    • Ndụ Chineke na ndị Izrel gbara na Moab (1-13)

    • A dọrọ ndị Izrel aka ná ntị ka ha ghara inupụ isi (14-29)

      • Ihe ndị e zoro ezo na ndị nke e mere ka a mata (29)

  • 30

    • Ndị Izrel ga-alọghachikwute Jehova (1-10)

    • Iwu Jehova esighị oké ike (11-14)

    • Ndị Izrel ga-ahọrọ ndụ ma ọ bụ ọnwụ (15-20)

  • 31

    • Mgbe oge Mosis ga-anwụ ruwere (1-8)

    • Mgbe a ga na-agụrụ ndị Izrel Iwu ahụ (9-13)

    • E mere Joshụa onye ndú (14, 15)

    • E buru amụma na ndị Izrel ga-enupụ isi (16-30)

      • Abụ a ga-akụziri ndị Izrel (19, 22, 30)

  • 32

    • Abụ Mosis (1-47)

      • Jehova bụ Oké Nkume anyị (4)

      • Ndị Izrel chefuru Oké Nkume ha (18)

      • “Ọ bụ m ga-abọ ọbọ” (35)

      • “Unu mba niile, soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ” (43)

    • Mosis ga-anwụ n’Ugwu Nibo (48-52)

  • 33

    • Mosis gọziri ebo dị iche iche (1-29)

      • Ogwe aka Jehova “nke na-adịru mgbe ebighị ebi” (27)

  • 34

    • Jehova gosiri Mosis ala ahụ (1-4)

    • Mosis nwụrụ (5-12)