Daniel 3:1-30

  • Eze Nebukadneza ji ọlaedo kpụọ otu nnukwu ihe (1-7)

    • O nyere iwu ka a kpọọrọ ihe ahụ isiala (4-6)

  • E kwuru na ndị Hibru atọ ekweghị erube isi (8-18)

    • “Anyị agaghị efe chi gị dị iche iche” (18)

  • A tụbara ha ná nnukwu ọkụ (19-23)

  • Chineke napụtara ha n’ọkụ (24-27)

  • Eze toro Chineke ndị Hibru (28-30)

3  Eze Nebukadneza ji ọlaedo kpụọ otu nnukwu ihe nke dị kubit iri isii* n’ogologo nakwa kubit isii* n’obosara. Ọ kwụwara ya na mbara ala Dura nke dị n’ógbè* Babịlọn.  Eze Nebukadneza wee zie ozi ka a kpọkọta ndị setrap,* ndị prifekt,* ndị gọvanọ, ndị ndụmọdụ, ndị na-echekwa akụ̀, ndị ikpe, ndị na-enyere ndị ikpe aka, na ndị niile na-elekọta ógbè* dị iche iche ka ha bịa ememme maka nnukwu ihe ahụ Eze Nebukadneza kwụwara.  N’ihi ya, ndị setrap,* ndị prifekt,* ndị gọvanọ, ndị ndụmọdụ, ndị na-echekwa akụ̀, ndị ikpe, ndị na-enyere ndị ikpe aka, na ndị niile na-elekọta ógbè* dị iche iche zukọtara ka e mee ememme maka nnukwu ihe ahụ Eze Nebukadneza kwụwara. Ha guzoro n’ihu nnukwu ihe ahụ Nebukadneza kwụwara.  Oti mkpu eze tiri mkpu, sị: “Ndị dị iche iche, ndị si ná mba dị iche iche, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche, a na-enye unu iwu  na mgbe unu nụrụ ụda opi, ọjà, ụbọ zita, une, ụbọ akwara, nnukwu ọjà, na ụdị ngwá egwú niile ọzọ, daanụ n’ala kpọọrọ ihe ahụ Eze Nebukadneza ji ọlaedo kpụọ isiala.  Onye ọ bụla na-adaghị n’ala kpọọ isiala, a ga-atụba ya ozugbo ná nnukwu ọkụ a kwanyere.”+  N’ihi ya, ozugbo mmadụ niile nụrụ ụda opi, ọjà, ụbọ zita, une, ụbọ akwara, na ụdị ngwá egwú niile ọzọ, ndị niile, ndị si ná mba dị iche iche, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche dara n’ala kpọọrọ ihe ahụ Eze Nebukadneza ji ọlaedo kpụọ isiala.  N’oge ahụ, ụfọdụ ndị Kaldia bịara bo ndị Juu ebubo.*  Ha gwara Eze Nebukadneza, sị: “Eze, ị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. 10  Eze, i nyere iwu na onye ọ bụla nke nụrụ ụda opi, ọjà, ụbọ zita, une, ụbọ akwara, nnukwu ọjà, na ụdị ngwá egwú niile ọzọ ga-ada n’ala kpọọrọ ihe ahụ i ji ọlaedo kpụọ isiala. 11  I nyekwara iwu na onye ọ bụla nke na-adaghị n’ala kpọọ isiala, a ga-atụba ya ná nnukwu ọkụ ahụ a kwanyere.+ 12  Ma, e nwere ndị Juu ị họpụtara ka ha na-elekọta ógbè* Babịlọn. Aha ha bụ Shedrak, Mishak, na Abednego.+ Eze, ụmụ nwoke a erubereghị gị isi. Ha anaghị efe chi gị dị iche iche ofufe, ha ekweghịkwa akpọrọ ihe ahụ i ji ọlaedo kpụọ isiala.” 13  Nebukadneza jizi iwe na ọnụma nye iwu ka a kpọta Shedrak, Mishak, na Abednego. E wee kpọta ụmụ nwoke a n’ihu eze. 14  Nebukadneza sịrị ha: “Shedrak, Mishak, na Abednego, ọ̀ bụ eziokwu na unu anaghị efe chi m dị iche iche ofufe+ nakwa na unu ekweghị akpọrọ ihe m ji ọlaedo kpụọ isiala? 15  Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-ada n’ala kpọọrọ ihe ahụ m kpụrụ isiala ma unu nụ ụda opi, ọjà, ụbọ zita, une, ụbọ akwara, nnukwu ọjà, na ụdị ngwá egwú niile ọzọ, nsogbu adịghị. Ma ọ bụrụ na unu ajụ ịkpọrọ ya isiala, a ga-atụba unu ozugbo ná nnukwu ọkụ ahụ a kwanyere. Olee chi ga-anapụtali unu n’aka m?”+ 16  Shedrak, Mishak, na Abednego zara eze, sị: “Nebukadneza, e nweghị ihe ọzọ anyị ga-agwa gị n’okwu a. 17  Eze, ọ bụrụ na a ga-atụba anyị n’ime ọkụ ahụ, Chineke anyị na-efe ofufe ga-anapụtali anyị ná nnukwu ọkụ ahụ nakwa n’aka gị.+ 18  Ma, ọ bụrụgodị na ọ gaghị anapụta anyị, eze, mara na anyị agaghị efe chi gị dị iche iche, anyị agaghịkwa akpọrọ ihe ahụ i ji ọlaedo kpụọ isiala.”+ 19  Nebukadneza wee wesa Shedrak, Mishak, na Abednego nnukwu iwe. Ihu ya wee gbarụọ.* O nyeziri iwu ka e mee ka nnukwu ọkụ ahụ a kwanyere dịkwuo ọkụ okpukpu asaa karịa otú ọ na-adịbu. 20  O nyere ụfọdụ ndị dike so ná ndị agha ya iwu ka ha kee Shedrak, Mishak, na Abednego agbụ ma tụba ha ná nnukwu ọkụ ahụ. 21  N’ihi ya, e kere ụmụ nwoke ahụ agbụ mgbe ha ka yi ákwà ha, uwe mwụda ha, okpu ha, na uwe niile ha yi, ma tụba ha ná nnukwu ọkụ ahụ. 22  N’ihi otú eze si jiri iwe nye iwu ahụ, a kwanyekwuru ọkụ n’ọkụ ahụ, ya adị ọkụ gafee ókè. Ire ọkụ ahụ wee regbuo ndị dike ahụ kpụụrụ Shedrak, Mishak, na Abednego tụba n’ọkụ ahụ. 23  Ma ụmụ nwoke atọ a, ya bụ, Shedrak, Mishak, na Abednego, bu agbụ e kere ha daba ná nnukwu ọkụ ahụ. 24  Ụjọ jideziri Eze Nebukadneza, ya ebilie n’ike jụọ ndị ọkwá ha gbagotere ná ndị na-ejere ya ozi, sị: “Ọ́ bụghị ụmụ nwoke atọ ka anyị kere agbụ tụba n’ime ọkụ?” Ha zara eze, sị: “Eze, ọ bụ mmadụ atọ.” 25  Ọ sịrị: “Lee, m na-ahụ ụmụ nwoke anọ ka ha na-ejegharị n’ime ọkụ ahụ, e nweghịkwa ihe ọ bụla na-eme ha. Onye nke mere ha anọ yiri chi.” 26  Nebukadneza bịara nso n’ọnụ ụzọ ebe a kwanyere nnukwu ọkụ ahụ, sị: “Shedrak, Mishak, na Abednego, unu ndị ohu Chineke Onye Kacha Elu,+ pụtanụ, bịanụ ebe a!” Shedrak, Mishak, na Abednego wee si n’ime ọkụ ahụ pụta. 27  Ndị setrap,* ndị prifekt,* ndị gọvanọ, na ndị ọkwá ha dị elu na-ejere eze ozi, bụ́ ndị zukọtara n’ebe ahụ,+ hụrụ na ọkụ ahụ emeghị ụmụ nwoke ahụ ihe ọ bụla n’ahụ́.+ O reghịdị otu mkpụrụ ntutu dị ha n’isi, ákwà ha achagharịghị, ha esighịkwa anwụrụ ọkụ anwụrụ ọkụ. 28  Nebukadneza kwuziri, sị: “Ka e too Chineke Shedrak, Mishak, na Abednego,+ onye zitere mmụọ ozi ya wee napụta ndị ohu ya. Ha tụkwasịrị Chineke ha obi ma jụ ime ihe eze kwuru. Ha kwetara ịnwụ kama ha ga-efe chi ọzọ ma ọ bụ kpọọrọ chi ọzọ na-abụghị Chineke ha isiala.+ 29  N’ihi ya, ana m eti iwu na ndị ọ bụla, ndị si ná mba ọ bụla, ma ọ bụ ndị na-asụ asụsụ ọ bụla, bụ́ ndị kwujọrọ Chineke Shedrak, Mishak, na Abednego, a ga-abọkasị ha. A ga-ejikwa ụlọ ha mere ebe ọhaneze ga na-aga mposi;* n’ihi na e nweghị chi ọzọ nwere ike ịnapụta mmadụ ka Chineke a.”+ 30  Eze wee bulie Shedrak, Mishak, na Abednego n’ọkwá* n’ógbè* Babịlọn.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ihe dị ka mita 27 (amaụkwụ 88). Gụọ B14.
Ihe dị ka mita 2.7 (amaụkwụ 8.8). Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ná mpaghara.”
Ma ọ bụ “mpaghara.”
Ma ọ bụ “mpaghara.”
Ma ọ bụ “kwutọọ ndị Juu.”
Ma ọ bụ “mpaghara.”
Ma ọ bụ “Otú o si ele ha anya gbanwere kpamkpam.”
O nwere ike ịbụ, “ebe a na-ekpofu ahịhịa; ikpo nsị.”
N’Arameik, “mee ka ihe na-agaziri” ha.
Ma ọ bụ “ná mpaghara.”