Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Daniel

Isi

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Ndị Babịlọn nọchibidoro Jeruselem (1, 2)

    • E nyere iwu ka a zụọ ụmụaka si n’ezinụlọ eze (3-5)

    • A nwalere ụmụaka Hibru anọ (6-21)

  • 2

    • Eze Nebukadneza rọrọ nrọ nyere ya nsogbu (1-4)

    • E nweghị onye ma ihe nke nwere ike ịkọ nrọ ahụ (5-13)

    • Daniel rịọrọ Chineke ka o nyere ya aka (14-18)

    • O toro Chineke maka ime ka ọ mata ihe nzuzo ahụ (19-23)

    • Daniel kọọrọ eze nrọ ahụ (24-35)

    • Ihe nrọ ahụ pụtara (36-45)

      • Nkume nke nọchiri anya alaeze ga-egwepịa ihe a kpụrụ akpụ (44, 45)

    • Eze kwanyeere Daniel ùgwù (46-49)

  • 3

    • Eze Nebukadneza ji ọlaedo kpụọ otu nnukwu ihe (1-7)

      • O nyere iwu ka a kpọọrọ ihe ahụ isiala (4-6)

    • E kwuru na ndị Hibru atọ ekweghị erube isi (8-18)

      • “Anyị agaghị efe chi gị dị iche iche” (18)

    • A tụbara ha ná nnukwu ọkụ (19-23)

    • Chineke napụtara ha n’ọkụ (24-27)

    • Eze toro Chineke ndị Hibru (28-30)

  • 4

    • Eze Nebukadneza kwetara na Chineke bụ eze kachanụ (1-3)

    • Eze rọrọ otu osisi ná nrọ (4-18)

      • Oge asaa ga-agafe mgbe e gbutuchara osisi ahụ (16)

      • Chineke na-achị n’alaeze ndị mmadụ (17)

    • Daniel kọwara nrọ ahụ (19-27)

    • Amụma ahụ mezuru nke mbụ ya n’isi eze (28-36)

      • Isi akpakọghị eze ọnụ ruo oge asaa (32, 33)

    • Eze toro Chineke nke eluigwe (37)

  • 5

    • Eze Belshaza mere oriri (1-4)

    • Mkpịsị aka dere ihe n’ahụ́ ájá (5-12)

    • A kpọrọ Daniel ka ọ kọwaa ihe ahụ e dere (13-25)

    • Ihe e dere pụtara na Babịlọn ga-ada (26-31)

  • 6

    • Ndị isi ndị Peshia kpaara Daniel nkata (1-9)

    • Daniel akwụsịghị ikpe ekpere (10-15)

    • A tụbara Daniel n’olulu ọdụm (16-24)

    • Eze Darayọs toro Chineke Daniel (25-28)

  • 7

    • Daniel hụrụ anụ ọhịa anọ n’ọhụụ (1-8)

      • Obere mpi dị mpako pulitere (8)

    • Onye Ochie malitere ikpe ikpe (9-14)

      • E chiri nwa nke mmadụ eze (13, 14)

    • A kọwaara Daniel ihe ọhụụ ọ hụrụ pụtara (15-28)

      • Anụ ọhịa anọ ahụ bụ ndị eze anọ (17)

      • Ndị nsọ ga-enweta alaeze (18)

      • Mpi iri ma ọ bụ eze iri ga-achịwa (24)

  • 8

    • Daniel hụrụ ebule na mkpi n’ọhụụ (1-14)

      • Obere mpi buliri onwe ya elu (9-12)

      • Ọ ga-adịru ụbọchị 2,300, mgbede na ụtụtụ (14)

    • Gebriel kọwara ọhụụ ahụ (15-27)

      • Ihe ebule na mkpi ahụ pụtara (20, 21)

      • Eze ihu ya na-emenye ụjọ chịwara (23-25)

  • 9

    • Daniel kpere ekpere kwupụta mmehie ha (1-19)

      • Jeruselem ga-atọgbọ chakoo afọ 70 (2)

    • Gebriel bịakwutere Daniel (20-23)

    • E buru amụma banyere izu 70 (24-27)

      • Mezaya ga-abịa ma izu 69 gachaa (25)

      • A ga-egbu Mezaya (26)

      • A ga-ebibi obodo ahụ na ebe nsọ (26)

  •  10

    • Onye ozi Chineke bịakwutere Daniel (1-21)

      • Maịkel nyeere mmụọ ozi aka (13)

  • 11

    • Eze Peshia na eze Gris (1-4)

    • Eze ugwu na eze ndịda (5-45)

      • Onye na-ana ụtụ ga-agagharị (20)

      • E bibiri Onyeisi ọgbụgba ndụ ahụ (22)

      • A ga-eto chi nke obodo ndị a rụsiri ike (38)

      • Eze ugwu na eze ndịda ga-enurịta ibe ha aka (40)

      • Akụkọ si n’ebe ọwụwa anyanwụ na n’ebe ugwu ga-enye ya nsogbu (44)

  • 12

    • “Oge ọgwụgwụ” na ihe ndị ga-esochi ya (1-13)

      • Maịkel ga-ebili (1)

      • Ndị ma ihe ga-enwu ka ìhè (3)

      • Eziokwu a ga-amụta ga-ehi nne (4)

      • Daniel ga-ebili nweta òkè ya (13)