Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom 4:1-25
4 Ebe ọ dị otú ahụ, oleezi uru anyị ga-asị na Ebreham, nna nna anyị, onye anyị si n’agbụrụ ya, ritere?
2 Dị ka ihe atụ, a sị na ọ bụ ọrụ Ebreham rụrụ mere e ji kpọọ ya onye ezi omume, ọ gaara enwe ihe ọ ga-eji na-anya isi, ma ọ gaghị anya isi n’ihu Chineke.
3 Gịnị ka ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ kwuru? O kwuru, sị: “Ebreham nwere okwukwe na Jehova,* e jiri maka ya kpọọ ya onye ezi omume.”+
4 A naghị ewere ụgwọ a ga-akwụ onye rụrụ ọrụ ka imere ya amara, kama a na-ewere ya ka ụgwọ e ji ya eji.
5 Ma ọ bụrụ na mmadụ anaghị arụ ọrụ, ma ya enwee okwukwe n’Onye na-akpọ onye ajọ omume onye ezi omume, a ga-akpọ onye ahụ onye ezi omume n’ihi okwukwe ya.+
6 Devid kwukwara banyere ụdị obi ụtọ onye Chineke kpọrọ onye ezi omume na-enwe n’agbanyeghị na ọ bụghị ọrụ ọ rụrụ mere e ji kpọọ ya onye ezi omume. Ọ sịrị:
7 “Ndị a gbaghaara ihe ọjọọ ha mere na ndị e kpuchiri* mmehie ha na-enwe obi ụtọ.
8 Onye Jehova* na-agaghị agụkọrọ mmehie ya na-enwe obi ụtọ.”+
9 Ọ̀ bụ naanị ndị e biri úgwù na-enwe obi ụtọ a, ka ndị a na-ebighị úgwù hà na-enwekwu ya?+ N’ihi na anyị na-ekwu na “e ji maka okwukwe Ebreham nwere kpọọ ya onye ezi omume.”+
10 Oleezi mgbe a kpọrọ ya onye ezi omume? Ọ̀ bụ mgbe o birila úgwù, ka ọ̀ bụ mgbe ọ na-ebibeghị úgwù? Ọ bụghị mgbe o birila úgwù, kama ọ bụ mgbe ọ na-ebibeghị úgwù.
11 Chineke gwara ya ka o bie úgwù. Úgwù o biri bụ ihe àmà+ gosiri na okwukwe o nwere mere ka ọ bụrụ onye ezi omume mgbe ọ na-ebibeghị úgwù. O si otú ahụ bụrụ nna ndị niile nwere okwukwe+ n’agbanyeghị na ha bụ ndị a na-ebighị úgwù, Chineke wekwaara ha ka ndị ezi omume;
12 Ebreham bụkwa nna ndị e biri úgwù. Ọ bụghị naanị nna ndị e biri úgwù, kama ọ bụkwa nna ndị nwere okwukwe ka ya. Nna anyị Ebreham+ nwere okwukwe ahụ mgbe ọ na-ebibeghị úgwù.
13 N’ihi na ihe mere e ji kwe Ebreham ma ọ bụ nwa* ya nkwa na ọ ga-eketa ụwa+ abụghị na o mere ihe e kwuru n’iwu, kama ọ bụ n’ihi okwukwe ya nke mere o ji bụrụ onye ezi omume.+
14 N’ihi na ọ bụrụ na ọ bụ ndị na-eme ihe e kwuru n’iwu ga-enweta ihe ahụ e kwere ná nkwa, ọ baghịzi uru mmadụ inwe okwukwe, nkwa ahụ enweghịkwa isi.
15 N’eziokwu, imebi Iwu ahụ* na-eme ka Chineke wesa mmadụ iwe.+ Ma n’ebe iwu na-adịghị, mmebi iwu anaghị adị.+
16 N’ihi ya, e kwere Ebreham nkwa ahụ n’ihi okwukwe ya. E sikwa otú ahụ gosi amara Chineke.+ N’ihi ya, o doro anya na ndị niile bụ́ ụmụ* ya ga-enweta ihe ahụ e kwere ná nkwa.+ Ọ bụghị naanị ndị na-eme ihe e kwuru n’Iwu ahụ* ga-enweta ya, kamakwa ndị nwere ụdị okwukwe Ebreham nwere, onye bụ́ nna anyị niile.+
17 (Ọ bụ otú e dere ya, sị: “Emeela m ka ị bụrụ nna ọtụtụ mba.”)+ Nkwa a Chineke kwere ga-emezurịrị, Ebreham nwekwara okwukwe na Chineke, onye na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ, onye na-akpọkwa ihe ndị na-adịghị adị ka à ga-asị na ha dị adị.*
18 Ọ bụ eziokwu na e nweghị ihe mere ọ ga-eji nwee olileanya, ma n’ihi ihe ọ na-atụ anya ya, o nwere okwukwe na ya ga-abụ nna ọtụtụ mba otú e kwuru ya, sị: “Otú ahụ ka ụmụ* gị ga-adị ọtụtụ.”+
19 Ọ daghị mbà n’okwukwe n’agbanyeghị na o chere banyere ahụ́ ya nke e nwere ike ikwu na ọ nwụọla (ebe ọ dị ihe dị ka otu narị afọ),+ o chekwara banyere Sera onye na-enweghịzi ike ịdị ime.*+
20 Ma n’ihi nkwa Chineke kwere, o nwere okwukwe nke mere na o nweghị obi abụọ. Kama okwukwe ya mere ka o sie ike, ya esi otú ahụ nye Chineke otuto.
21 Obi sikwara ya ezigbo ike na Chineke ga-emeli ihe o kwere ná nkwa.+
22 N’ihi ya, “a kpọrọ ya onye ezi omume.”+
23 Ma, ọ bụghị naanị n’ihi ya+ ka e ji dee na “a kpọrọ ya onye ezi omume,”
24 kama ọ bụkwa n’ihi anyịnwa ndị a ga-akpọkwa ndị ezi omume, n’ihi na anyị kweere n’onye si n’ọnwụ kpọlite Jizọs Onyenwe anyị.+
25 E nyefere Jizọs ka e gbuo ya n’ihi mmehie anyị,+ a kpọlitekwara ya n’ọnwụ ka e wee kpọọ anyị ndị ezi omume.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “a gbaghaara.”
^ Na Grik, “mkpụrụ.”
^ Ya bụ, Iwu Mosis.
^ Na Grik, “mkpụrụ.”
^ Ya bụ, Iwu Mosis.
^ O nwere ike ịbụ, “onye na-eme ka ihe na-adịghị adị dịrị.”
^ Na Grik, “mkpụrụ.”
^ Na Grik, “onye akpa nwa ya nwụrụ anwụ.”