Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Kọlọsi 4:1-18

  • Ọdụ Pọl dụrụ ndị nna ukwu (1)

  • “Na-ekpenụ ekpere mgbe niile” (2-4)

  • Na-egosinụ na unu ma ihe ma unu na ndị na-abụghị ụmụnna nọrọ (5, 6)

  • Ekele ikpeazụ (7-18)

4  Ndị nna ukwu, na-emesonụ ndị ohu unu otú ziri ezi na otú dị mma, ebe unu ma na unu nwekwara Nna Ukwu n’eluigwe.+  Na-ekpenụ ekpere mgbe niile.+ Unu echefukwala ịna-ekpe ya. Na-ekelekwanụ Chineke.+  Na-ekpekwanụ ekpere maka anyị+ ka Chineke megheere anyị ụzọ ka anyị na-ekwusa okwu ya na ihe nzuzo dị nsọ gbasara Kraịst, nke mere e ji tụọ m mkpọrọ.+  Na-ekpekwanụ ekpere ka m na-ekwusa ya otú ndị mmadụ ga na-aghọta ya, dị ka m kwesịrị isi na-ekwusa ya.  Mgbe unu na ndị na-abụghị ụmụnna nọ, na-akpanụ àgwà otú na-egosi na unu ma ihe. Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa.*+  Ka okwu unu na-atọ ụtọ mgbe niile ka ihe e tinyere nnu.+ Ọ ga-eme ka unu mara otú unu ga-esi azaghachi onye ọ bụla.+  Tikikọs+ ga-agwa unu ihe niile gbasara m. Ọ bụ nwanna m m hụrụ n’anya na onye ozi a tụkwasịrị obi na ohu ibe m n’ihe gbasara Onyenwe anyị.  M na-ezitere ya unu ka ọ gwa unu otú anyị mere, kasiekwa unu obi.  M na-ezite ya na Onesịmọs+ nwanna m, onye a tụkwasịrị obi, onye m hụrụ n’anya, onye obodo unu. Ha ga-agwa unu ihe niile na-eme ebe a. 10  Arịstakọs,+ onye mkpọrọ ibe m, na-ekele unu. Mak,+ nwa nwanne Banabas, na-ekelekwa unu. (Mak a bụ onye m gwara unu ka unu nabata+ ma ọ bịa ịhụ unu.) 11  Jizọs, onye a na-akpọ Jọstọs, na-ekelekwa unu. Ndị a niile bụ ndị Juu.* Naanị ndị a bụ ndị ọrụ ibe m maka Alaeze Chineke. Ha na-akasikwa m nnọọ obi.* 12  Epafras,+ onye unu na ya nọbu, ohu Kraịst Jizọs, na-ekele unu. Ọ na-ekpesi ekpere ike mgbe niile maka unu, ka unu wee kwụrụ chịm n’ikpeazụ ka ndị tozuru etozu, na-ekwenyesikwa ike n’ihe niile gbasara uche Chineke. 13  M na-agba akaebe na ọ na-agba ezigbo mbọ maka unu nakwa maka ndị nọ na Leodisia na ndị nọ na Haịrapọlis. 14  Luk,+ onye anyị hụrụ n’anya, onye na-agwọ ọrịa, na-ekele unu. Dimas+ na-ekelekwa unu. 15  Keleerenụ m ụmụnna ndị nọ na Leodisia. Keleekwaranụ m Nimfa na ọgbakọ na-ezukọ n’ụlọ ya.+ 16  Unu gụchaa akwụkwọ ozi a, zigaranụ ya ọgbakọ ndị Leodisia ka ha gụọ.+ Gwakwanụ ha ka ha zitere unu nke m zigaara ha ka ununwa gụọ. 17  Gwakwanụ Akịpọs,+ sị: “Na-agba mbọ ka ị rụchaa ọrụ Onyenwe anyị gwara gị rụọ.” 18  Mụnwa bụ́ Pọl na-ekele unu. Ọ bụ m ji aka m na-ede+ ekele a. Burunụ mkpọrọ a tụrụ m+ n’uche. Ka Chineke meere unu amara.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “Na-azụtaranụ onwe unu oge.”
Na Grik, “ndị e biri úgwù.”
Ma ọ bụ “Ha na-agba m nnọọ ume.”