Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Hibru 11:1-40

  • Ihe okwukwe pụtara (1, 2)

  • Ndị nwere okwukwe (3-40)

    • Onye na-enweghị okwukwe agaghị emeli ihe dị Chineke mma (6)

11  Okwukwe bụ ezigbo obi ike e nwere na ihe ndị a na-ele anya ha ga-emezu.+ Ọ bụ ihe àmà doro anya na ihe ndị a na-anaghị ahụ anya dị adị n’eziokwu.  Ọ bụ ụdị okwukwe a ndị oge ochie* nwere mere e ji gbaara ha àmà.*  Ọ bụ okwukwe mere anyị ji aghọta na ọ bụ okwu Chineke ka e ji kee ihe ndị dị n’eluigwe na n’ụwa.* Chineke si otú ahụ si n’ihe ndị anyị na-anaghị ahụ anya mee ihe ndị anyị na-ahụ anya.  Ọ bụ okwukwe ka Ebel ji chụọrọ Chineke àjà ka nke Ken mma.+ Ọ bụkwa okwukwe ahụ mere e ji gbaara ya àmà na ọ bụ onye ezi omume n’ihi na Chineke nabatara onyinye ya.+ Ọ bụ eziokwu na ọ nwụrụ, ọ ka si n’okwukwe ya na-ekwu okwu.+  Ọ bụ okwukwe Ịnọk+ mere e ji wepụ ya ka ọ ghara ịnwụ otú ndị ọzọ si anwụ, e nweghịkwa ebe a hụrụ ya n’ihi na Chineke wepụrụ ya.+ N’ihi na tupu e wepụ ya, a gbaara ya àmà na o mere ihe dị Chineke ezigbo mma.  Ọ bụrụkwa na mmadụ enweghị okwukwe, ọ gaghị emeli ihe dị Chineke ezigbo mma, n’ihi na onye ọ bụla na-abịakwute Chineke ga-ekwetarịrị na ọ dị adị nakwa na ọ na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.+  Ọ bụ okwukwe mere Noa+ ji tụọ egwu Chineke ma rụọ ụgbọ+ a ga-eji zọpụta ezinụlọ ya mgbe Chineke dọchara ya aka ná ntị banyere ihe ndị a na-ahụbeghị anya.+ Ọ bụkwa okwukwe a ka o ji gosi na ikpe mara ụwa,+ e wee kpọọ ya onye ezi omume n’ihi okwukwe ya.  Ọ bụ okwukwe mere Ebreham+ ji rube isi mgbe a kpọrọ ya, o wee gaa n’ebe Chineke kwere nkwa na ọ ga-enye ya. Ọ gawara, n’agbanyeghị na ọ maghị ebe ọ na-aga.+  Ọ bụ okwukwe mere o ji gaa bụrụ onye mbịarambịa n’ala nkwa ahụ,+ birikwa n’ụlọikwuu,+ ya na Aịzik na Jekọb, ndị e kwere ha na ya otu nkwa ahụ.+ 10  N’ihi na ọ nọ na-echere obodo nwere ezigbo ntọala, nke Chineke sere otú ọ ga-adị, rụọkwa.+ 11  Ọ bụkwa okwukwe mere ka Sera nwee ike ịdị ime* mgbe ọ gaferela oge ịmụ nwa,+ n’ihi na o kwetara na e kwesịrị ịtụkwasị Onye kwere nkwa ahụ obi. 12  Ọ bụ ya mere e ji si n’otu nwoke, onye e weere ahụ́ ya ka nke nwụrụla anwụ,+ mụta ụmụ dị ọtụtụ+ ka kpakpando dị n’eluigwe, ndị a na-enweghịkwa ike ịgụta ọnụ ka ájá dị n’akụkụ oké osimiri.+ 13  Ndị a niile nwere okwukwe ruo mgbe ha nwụrụ, n’agbanyeghị na nkwa ndị ahụ emezughị n’oge ha.+ Ma, ọ dị ha ka à ga-asị na ha ahụla ka nkwa ndị ahụ mezuru+ ma nabata ha. Ha kwusakwara n’ihu ọha na ha bụ ndị mbịarambịa na ndị bịara ịnọ obere oge n’ala ha bi. 14  N’ihi na ndị na-ekwu ihe ndị a na-egosi na ha na-achọsi ebe ga-abụ nke ha ike. 15  Ma, a sị na ha nọ na-echeta ebe ha hapụrụ,+ ha gaara achọta ihe ga-eme ka ha laghachi. 16  Ma, ha na-achọ ka ha nweta ebe ka mma, ya bụ, nke eluigwe. N’ihi ya, ihere anaghị eme Chineke na ha na-arịọ ya ka o nyere ha aka ebe ọ bụ Chineke ha*+ n’ihi na ọ kwadeberela ha otu obodo.+ 17  Ọ bụ okwukwe Ebreham mere o ji fọ obere ka ọ chụọ Aịzik n’àjà mgbe a nwalere ya.+ Nwoke a, onye ji obi ụtọ nabata nkwa ndị e kwere ya, chọrọ iji ọkpara ọ mụrụ naanị ya chụọ àjà,+ 18  n’agbanyeghị na Chineke gwara ya, sị: “Ọ bụ Aịzik ga-amụta ndị a ga-akpọ ụmụ* gị.”+ 19  Ma o kwetara na Chineke ga-akpọliteli nwa ya n’ọnwụ, o nwetaghachikwara nwa ya. Ihe a merenụ bụ ihe atụ.+ 20  Ọ bụ okwukwe mere ka Aịzik gọzie Jekọb+ na Ịsọ+ ma gwa ha ihe ndị ga-emecha mee. 21  Mgbe ọ fọrọ obere ka Jekọb nwụọ,+ ọ bụ okwukwe mere ka ọ gọzie ụmụ nwoke abụọ Josef mụrụ+ ma dabere n’isi mkpara ya kpọọrọ Chineke isi ala.*+ 22  Mgbe ọ fọrọ obere ka Josef nwụọ, ọ bụ okwukwe mere ka o kwuo na ndị Izrel ga-esi n’Ijipt pụọ. O nyekwara iwu ka a chịrị ọkpụkpụ ya pụọ n’ebe ahụ.*+ 23  Ọ bụ okwukwe mere ndị mụrụ Mosis ji zoo ya ruo ọnwa atọ a mụchara ya,+ n’ihi na ha hụrụ na nwatakịrị ahụ mara mma,+ ha atụghịkwa iwu eze nyere egwu.+ 24  Mgbe Mosis toro,+ ọ bụ okwukwe mere na o kweghị ka a kpọọ ya nwa ada Fero.+ 25  Ọ họọrọ ka e megbuo ya na ndị Chineke kama ime mmehie nke ga-emetụ ya obi ụtọ obere oge, 26  n’ihi na o weere mkparị a kparịrị ya dị ka Onye E Tere Mmanụ* ka akụ̀ karịrị akụ̀ niile dị n’Ijipt maka na ọ nọ na-atụsi anya ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ya ike. 27  Ọ bụ okwukwe mere ka ọ hapụ Ijipt,+ ọ bụghị na ọ na-atụ ụjọ na eze na-ewe iwe,+ n’ihi na ọ nọ na-atachi obi ka à ga-asị na ọ na-ahụ Onye a na-anaghị ahụ anya.+ 28  Ọ bụ okwukwe mere o ji mee Ememme Ngabiga, fesakwa ọbara n’awara ụzọ, ka onye mbibi ghara igbu ụmụ ha e bu ụzọ mụọ.+ 29  Ọ bụ okwukwe mere ha ji si n’Oké Osimiri Uhie gafere ka à ga-asị na ọ bụ ala nkịtị.+ Ma mgbe ndị Ijipt nwara isi n’osimiri ahụ gafere, mmiri riri ha.+ 30  Ọ bụ okwukwe ndị Izrel mere ka mgbidi Jeriko daa mgbe ha gbachara ya gburugburu ụbọchị asaa.+ 31  Ọ bụ okwukwe mere ka Rehab, bụ́ nwaanyị akwụna, ghara iso ndị nupụụrụ Chineke isi nwụọ, n’ihi na o ji obiọma nabata ndị bịara inyopụta otú obodo ahụ dị.+ 32  Gịnị ọzọ ka m ga-ekwu? N’ihi na oge ga-agwụnahụ m ma m kọwa banyere Gidiọn,+ Berak,+ Samsịn,+ Jefta,+ Devid,+ na Samuel+ na ndị amụma ndị ọzọ. 33  Ọ bụ okwukwe ha mere ka ha merie alaeze dị iche iche,+ mee ka ndị mmadụ mewe ezi omume, mee ka e kwee ha nkwa dị iche iche,+ meekwa ka e mechie ọnụ ọdụm.+ 34  Okwukwe ha mekwara ka ọkụ ghara ime ha ihe ọ bụla,+ mee ka ha gbalaga ka a ghara iji mma agha gbuo ha,+ mee ka ha dị ike mgbe ha na-adịghị ike,+ mee ka ha bụrụ ndị dike n’agha,+ mee ka ha chụlaa ndị bịara ịlụso ha agha.+ 35  A kpọliteere ụmụ nwaanyị ndị nwụnahụrụ ha,+ ma e mekpọrọ ụfọdụ ọnụ maka na ha ekweghị eme ihe na-adịghị mma ka e wee hapụ ha, ka ha wee nweta mbilite n’ọnwụ ka mma. 36  A nwakwara ndị ọzọ mgbe e ji ha mee ihe ọchị ma pịa ha ihe. N’eziokwu, e mere ha nke ka njọ. E kere ha agbụ,+ tụọkwa ha mkpọrọ.+ 37  A tụrụ ha nkume,+ a nwara ha ọnwụnwa, a kwọbiri ha abụọ, e ji mma agha gbuo ha,+ ha na-eyi akpụkpọ atụrụ na akpụkpọ ewu.+ E nwere mgbe ha nọ n’ụkọ, a kpagburu ha,+ e megburu ha.+ 38  Ha ekwesịghịkwa ụwa. Ha gagharịrị n’ọzara na n’ugwu, zookwa n’ọgba+ nakwa n’oghere ndị dị n’ala. 39  Ma ndị a niile enwetaghị ihe ahụ e kwere ná nkwa n’agbanyeghị na okwukwe ha mere ka a gbaara ha àmà dị mma, 40  n’ihi na Chineke ebula ụzọ hụ ihe ga-akara anyị mma,+ ka e wee ghara ime ka ha zuo okè, a hapụ anyị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ndị nna nna anyị.”
Ma ọ bụ “gbaara ha àmà na ihe ha dị Chineke mma.”
Ma ọ bụ “kee usoro ihe a.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
Na Grik, “nweta ike ịdị ime mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “na a na-akpọ ya Chineke ha.”
Ma ọ bụ “onye a ga-akpọ nwa.” Na Grik, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “fee Chineke ofufe.”
Ma ọ bụ “iwu gbasara olili ya.”
Na Grik, “Kraịst.”