Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Efesọs 1:1-23
1 Mụnwa bụ́ Pọl, onye ọ bụ uche Chineke ka ọ bụrụ onyeozi Kraịst Jizọs, na-edetara ọgbakọ dị n’Efesọs akwụkwọ ozi a. Unu bụ ndị nsọ,+ na ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi, nakwa ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu.
2 Ka Chineke Nna anyị nakwa Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.
3 Ka e too Chineke, bụ́ Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, n’ihi na o si n’eluigwe jiri mmụọ nsọ gọzie anyị n’ụzọ niile n’ihi na anyị na-eso ụzọ Kraịst.+
4 Ọ họọrọ anyị ka anyị na Kraịst dịrị n’otu tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị nwee ike hụ ya n’anya, dị nsọ, gharakwa iji ihe ọ bụla merụọ onwe anyị+ n’anya ya.
5 N’ihi na o kpebiri tupu oge eruo+ na a ga-esi n’aka Jizọs Kraịst mee ka anyị bụrụ ụmụ ya,+ maka na ọ dị ya mma, bụrụkwa uche ya,+
6 ka e wee too ya maka otú o si jiri Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya+ meere anyị amara na-enweghị atụ.+
7 E si n’aka Ọkpara ya gbapụta anyị, jirikwa n’ihi ọbara ya+ na-agbaghara anyị mmehie anyị.+ N’eziokwu, amara Chineke meere anyị enweghị atụ.
8 Amara a o meere anyị emeela ka anyị mara ihe nke ọma, meekwa ka anyị na-aghọta ihe nke ọma.
9 O mekwara ka anyị mara ihe nzuzo dị nsọ+ gbasara uche ya. Ihe nzuzo a dị ya mma. Ọ bụkwa ihe mere o ji zube ime
10 ka e nwee otú a ga-esi na-elekọta ihe. Ihe a ga-emekwa mgbe oge ọ kara aka zuru, ka o wee chịkọta ihe niile dị n’eluigwe na ihe niile dị n’ụwa, ka ha nọrọ n’okpuru Kraịst.+ N’eziokwu, a ga-achịkọta ihe niile n’okpuru onye
11 anyị na ya dị n’otu. Chineke kpebiri tupu oge eruo na anyị ga-eketa ihe o kwere anyị ná nkwa.+ O kpebiri ihe a maka na ọ bụ nzube ya, ọ na-emekwa ihe niile o kpebiri bụ́ uche ya.
12 Anyị bụ ndị mbụ kweere na Kraịst. Chineke kpebikwara tupu oge eruo na anyị ga na-aja ya mma ma na-eto ya.
13 Ma unu kwekwaara na Kraịst mgbe unu nụrụ eziokwu ahụ, ya bụ, ozi ọma gbasara otú Chineke ga-esi zọpụta unu. Mgbe unu kweere na ya, Chineke si n’aka ya jiri mmụọ nsọ o kwere ná nkwa kaa unu akara.+
14 Mmụọ nsọ a bụ ihe na-eme ka obi sie anyị ike na anyị ga-eketa ihe Chineke kwere anyị ná nkwa.+ Chineke mere ihe a iji gbapụta+ ndị ya,+ nke ga-eme ka a na-aja ya mma, na-etokwa ya.
15 Ọ bụ ya mere na kemgbe m nụrụ gbasara okwukwe unu nwere n’Onyenwe anyị Jizọs nakwa otú unu si eme ihe gosiri na unu hụrụ ndị nsọ niile n’anya,
16 akwụsịbeghị m ikele Chineke maka unu. M na-echetakwa unu n’ekpere mgbe niile,
17 ka Chineke, Nna dị ebube, Chineke nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, nye unu ike ga-eme ka unu mara ihe ma ghọta ihe ndị ọ na-agwa unu nke ọma gbasara onwe ya.+
18 Chineke emegheela obi unu ka unu nwee ike ịma ihe o mere ka unu na-atụ anya ya, ka unu nweekwa ike ịma ihe ọma ndị dị ebube o kwere nkwa inye ndị nsọ,+
19 marakwa gbasara ike na-enweghị atụ ọ kpara n’ime anyị bụ́ ndị kweere na ya.+ A hụrụ na ike ya dị egwu
20 mgbe ọ kpọlitere Kraịst n’ọnwụ ma nye ya oche n’aka nri ya+ n’eluigwe,
21 n’ebe dị elu karịa ọchịchị niile na ndị niile nwere ikike na ndị niile dị ike na ndị niile na-edu ndú na aha ọ bụla,+ ọ bụghị naanị n’oge a,* kamakwa n’ọdịnihu.
22 O dowekwala ihe niile n’okpuru ya,*+ meekwa ya onyeisi nke ihe niile gbasara ọgbakọ ya,+
23 nke bụ́ ahụ́ ya.+ Ihe gbasara ya jukwara n’ọgbakọ a. Ọ na-emekwa ka ihe niile ju eju.