Malakaị 3:1-18

  • Ezigbo Onyenwe unu ga-abịa ime ka ụlọ nsọ ya dị ọcha (1-5)

    • Onye ozi nke ọgbụgba ndụ (1)

  • Jehova gwara ndị ya ka ha lọghachikwute ya (6-12)

    • Jehova anaghị agbanwe agbanwe (6)

    • “Lọghachikwutenụ m, m ga-alọghachikwutekwa unu” (7)

    • ‘Wetanụ otu ụzọ n’ụzọ iri, Jehova ga-awụsakwa unu ngọzi’ (10)

  • Onye ezi omume na onye ajọ omume (13-18)

    • E dere aha ndị Chineke ga-echeta n’akwụkwọ (16)

    • Ihe dị iche n’onye ezi omume na onye ajọ omume (18)

3  “Lee, m na-ezite onye ozi m, ọ ga-edozikwa ụzọ n’ihu m.+ Na mberede, ezigbo Onyenwe unu, onye unu na-achọ, ga-abịa n’ụlọ nsọ ya;+ onye ozi nke ọgbụgba ndụ ga-abịakwa, onye unu na-atụsi anya ya ike. Lee, ọ ga-abịa.” Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.  “Ma ònye ga-edili ụbọchị ọ ga-abịa, ònye ga-eguzolikwa mgbe ọ ga-apụta? N’ihi na ọ ga-adị ka ọkụ onye na-anụcha ihe, dịkwa ka ncha+ nke ndị na-asụ ákwà.  Ọ ga-anọdụkwa ka onye na-anụcha ihe na onye na-asacha ọlaọcha.+ Ọ ga-asacha ụmụ Livaị. Ọ ga-anụcha ha ka ọlaedo, nụchaakwa ha ka ọlaọcha. Ha ga-abụzi ndị ezi omume ndị na-ewetara Jehova onyinye.  Onyinye Juda na Jeruselem na-eweta ga-adị Jehova mma, otú ọ dị ya n’oge ndị dị anya gara aga nakwa otú ọ dị ya n’oge ochie.+  “M ga-abịa ikpe unu ikpe. M ga-ama ndị a ikpe ọsọ ọsọ: ndị dibịa afa,+ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ndị na-aṅụ iyi ụgha,+ ndị na-aghọgbu onye ha goro ọrụ,+ ndị na-aghọgbu nwaanyị di ya nwụrụ, ndị na-aghọgbu nwa na-enweghị nna,*+ nakwa ndị na-ekweghị enyere onye mbịarambịa aka.*+ Ha anaghị atụ egwu m.” Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.  “N’ihi na abụ m Jehova; anaghị m agbanwe agbanwe.*+ Unu bụ ụmụ Jekọb; unu anwụchabeghị.  Malite n’ụbọchị ndị nna nna unu, unu hapụrụ ntụziaka m, unu emeghịkwa ha.+ Lọghachikwutenụ m, m ga-alọghachikwutekwa unu.”+ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. Ma, unu na-asị: “Olee otú o si bụrụ na anyị kwesịrị ịlọghachikwute gị?”  “Mmadụ efu ọ̀ ga-ezu Chineke ohi? Ma unu na-ezu m ohi.” Unu na-asịkwa: “Olee otú anyị si zuo gị ohi?” “Unu anaghị eweta otu ụzọ n’ụzọ iri nakwa onyinye dị iche iche.  Unu bụ ndị a bụrụ ọnụ* n’ihi na unu na-ezu m ohi. N’eziokwu, mba unu niile na-eme otú ahụ. 10  Webatanụ otu ụzọ n’ụzọ iri niile n’ụlọ nsọ m,*+ ka nri wee dịrị n’ụlọ nsọ m.+ Biko, nwaleenụ m n’ihe a, ka unu hụ ma ọ̀ bụ na mụ agaghị emeghe ọnụ ụzọ mmiri nke eluigwe+ ma wụsa unu ngọzi ruo mgbe ihe ọ bụla na-agaghị akọ unu.”+ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. 11  “M ga-abara ihe na-eripịa ihe* mba n’ihi unu. Ọ gaghị ebibi ihe ala unu mepụtara, osisi vaịn ndị dị n’ubi unu ga-amịkwa mkpụrụ.”+ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. 12  Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, “Mba niile ga-ekwu na unu bụ ndị obi ụtọ+ n’ihi na ala unu* ga-abụ ala obi ụtọ.” 13  Jehova kwuru, sị, “Okwu unu kwuru gbasara m dị njọ.” Unu na-asịkwa: “Olee ihe ọjọọ anyị kwurịtara gbasara gị?”+ 14  “Unu na-asị, ‘Ijere Chineke ozi abaghị uru.+ Olee uru anyị ritere na anyị nọ na-eme ihe ọ chọrọ ka anyị mee ma na-agbarụ ihu anyị iji gosi Jehova nke ụsụụ ndị agha na mmehie anyị wutere anyị? 15  Ugbu a, anyị chere na ọ bụ ndị mpako na-enwe obi ụtọ. Ihe na-agazikwara ndị na-eme ajọ omume.+ Ha na-anwa Chineke, ma o nweghị ihe na-eme ha.’” 16  N’oge ahụ, ndị na-atụ egwu Jehova nọ na-akparịta ụka, otu onye na ibe ya, Jehova nọkwa na-ege ntị ma na-anụ ihe ha na-ekwu. E wee nọrọ n’ihu Jehova dee aha+ ndị na-atụ egwu ya na ndị na-echebara aha ya echiche* n’akwụkwọ e dere aha ndị ọ ga-echeta.+ 17  Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, “Ha ga-abụ nke m+ n’ụbọchị m ga-eme ka ha bụrụ ndị pụrụ iche.+ M ga-emetekwara ha ebere* otú nna si emetere nwa ya nke na-ejere ya ozi ebere.+ 18  Unu ga-ahụkwa ọzọ ihe dị iche n’onye ezi omume na onye ajọ omume,+ n’onye na-ejere Chineke ozi na onye na-anaghị ejere ya ozi.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
Ma ọ bụ “ndị na-emegbu onye mbịarambịa.”
Ma ọ bụ “agbanwebeghị m.”
O nwere ike ịbụ, “Unu na-abụ m ọnụ.”
Na Hibru, “n’ụlọ a na-akwasa ihe.”
Ọ ga-abụ ahụhụ ndị na-abịa n’ìgwè eripịa ihe ka a na-ekwu.
Na Hibru, “n’ihi na unu.”
O nwere ike ịbụ, “ndị ji aha ya kpọrọ ihe.”
Ma ọ bụ “ga-enwekwara ha ọmịiko.”