Levitikọs 26:1-46

  • Ekperela arụsị (1, 2)

  • A ga-agọzi ndị na-erube isi (3-13)

  • A ga-ata ndị na-enupụ isi ahụhụ (14-46)

26  “‘Unu emerela onwe unu chi na-abaghị uru.+ Unu edosarala onwe unu arụsị a pịrị apị+ ma ọ bụ ogidi arụsị, unu edosakwala nkume a tụrụ ihe na ya+ n’ala unu ka unu na-akpọ isiala n’ihu ya;+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.  Unu ga na-edebe ụbọchị izu ike m, na-akwanyekwara ebe a na-anọ efe m ùgwù.* Abụ m Jehova.  “‘Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe m kwuru, na-edebe ihe m nyere n’iwu ma na-eso ha,+  m ga-eme ka mmiri na-ezoro unu n’oge kwesịrị ekwesị.+ Ala ga na-amị mkpụrụ ya.+ Osisi ndị dị n’ubi ga na-amịkwa mkpụrụ ha.  Unu ga-azọchagide mkpụrụ ruo n’oge unu ga-aghọwa mkpụrụ vaịn. Unu ga-aghọgidekwa mkpụrụ vaịn ruo n’oge unu ga-aghawa mkpụrụ. Unu ga na-eri nri unu rijuo afọ. Unu ga-ebikwa n’ala unu, obi eruo unu ala.+  M ga-eme ka udo dịrị n’ala unu.+ E nweghị onye ga-eme ka unu tụọ egwu mgbe unu na-ehi ụra.+ M ga-eme ka a ghara inwe ajọ anụ ọhịa ọ bụla n’ala unu. E nweghịkwa onye ga-alụso unu agha* n’ala unu.  Unu ga-achụ ndị iro unu ọsọ, unu ga-ejikwa mma agha merie ha.  Mmadụ ise n’ime unu ga-achụ otu narị (100) mmadụ ọsọ, otu narị (100) mmadụ n’ime unu ga-achụ puku mmadụ iri (10,000) ọsọ. Unu ga-ejikwa mma agha merie ndị iro unu.+  “‘M ga-agọzi unu ma mee ka unu mụọ ọmụmụ, meekwa ka unu mụbaa.+ Agaghị m emebi ọgbụgba ndụ mụ na unu.+ 10  Mgbe unu ka na-eri ihe unu wetara n’ubi n’afọ gara aga, unu ga-achọwa otú unu ga-esi wepụsịa ihe ochie unu wetara n’ubi ka unu wee hụ ebe unu ga-edowe ndị nke ọhụrụ. 11  M ga-eme ka ụlọikwuu m dịrị n’etiti unu,+ agaghịkwa m* ajụ unu. 12  M ga-anọnyere unu ma bụrụ Chineke unu,+ unu ga-abụkwa ndị m.+ 13  Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’Ijipt, ka unu kwụsị ịgbara ndị Ijipt ohu. M gbajikwara osisi yok unu bu ma mee ka unu ghara ihuru ehuru na-aga ije. 14  “‘Ma ọ bụrụ na unu agaghị ege m ntị ma ọ bụ ghara idebe iwu ndị a niile,+ 15  ọ bụrụkwa na unu ajụ ime ihe m kwuru,+ unu* ewee kpọọ ihe m kpebiri ka unu na-eme asị ma ghara ime ihe niile m nyere n’iwu, unu emebiekwa ọgbụgba ndụ m,+ 16  m ga-eme unu ihe ndị a: m ga-ata unu ahụhụ, mee ka unu rịa ụkwara nta na oké ahụ́ ọkụ, bụ́ ndị ga-eme ka unu ghara ịna-ahụ ụzọ nakwa ka ike gwụ unu.* Unu ga-agha mkpụrụ n’efu n’ihi na ọ bụ ndị iro unu ga-eri ya.+ 17  M ga-ajụ unu, ndị iro unu ga-emerikwa unu.+ Ndị kpọrọ unu asị ga-emegbu unu.+ Unu ga-agbakwa ọsọ mgbe a na-enweghị onye na-achụ unu.+ 18  “‘Ọ bụrụ na ihe a emeghị ka unu gee m ntị, m ga-ata unu ahụhụ maka mmehie unu okpukpu asaa karịa otú m taburu unu. 19  M ga-ata unu ahụhụ ka unu kwụsị ime isi ike, kwụsịkwa ịdị mpako. M ga-emekwa ka eluigwe unu dị ka ígwè,*+ meekwa ka ala unu dị ka ọla kọpa.* 20  Unu ga-emefusị ike unu na nkịtị n’ihi na ala unu agaghị emepụta ihe,+ osisi ndị dị n’ala agaghịkwa amị mkpụrụ. 21  “‘Ma ọ bụrụ na unu ka na-enupụrụ m isi ma jụ ige m ntị, m ga-atakwu unu ahụhụ okpukpu asaa maka mmehie unu karịa otú m taburu unu. 22  M ga-eme ka anụ ọhịa bata n’ala unu.+ Ha ga-agbawa unu aka ụmụ+ ma gbuchapụ anụ ụlọ unu. Ha ga-emekwa ka unu fọ ole na ole, ụzọ unu ga-atọgbọkwa chakoo.+ 23  “‘Ma ọ bụrụ na n’agbanyeghị ihe ndị a, unu anabataghị aka ná ntị m dọrọ unu,+ unu akpọchie ntị na-enupụrụ m isi, 24  m ga-emesi unu ike. M ga-ata unu ahụhụ okpukpu asaa maka mmehie unu. 25  M ga-eme ka ndị iro unu jiri mma agha lụso unu agha ka ha taa unu ahụhụ maka na unu mebiri ọgbụgba ndụ mụ na unu.+ Ọ bụrụ na unu agbaga n’obodo unu dị iche iche, m ga-eme ka unu rịa ọrịa,+ m ga-emekwa ka ndị iro unu merie unu.+ 26  Mgbe m ga-emebi ebe unu na-edosa* achịcha,*+ ihe ga-afọ ga-adị obere nke na ụmụ nwaanyị iri ga-eji naanị otu ekwú na-emere unu achịcha. Ha ga na-atụ achịcha ha na-enye unu atụ̀.+ Unu ga-eri ihe, ma afọ agaghị eju unu.+ 27  “‘Ọ bụrụ na n’agbanyeghị ihe a, unu egeghị m ntị, unu akpọchie ntị na-enupụrụ m isi, 28  m ga-ewesakwu unu iwe.+ M ga-atakwa unu ahụhụ okpukpu asaa maka mmehie unu. 29  N’ihi ya, unu ga-eri anụ ụmụ unu ndị nwoke, unu ga-erikwa anụ ụmụ unu ndị nwaanyị.+ 30  M ga-ebibi ebe ndị dị elu unu na-anọ efe chi ụgha unu,+ gbutusịakwa ihe unu ji adọsa insens* ma tụsachaa ozu unu n’elu arụsị unu na-adịghị ndụ bụ́ ndị na-asọ oyi.*+ M ga-agbakụta unu azụ maka na unu na-asọ oyi.+ 31  M ga-eme ka e jiri mma agha bibie obodo unu dị iche iche+ nakwa ebe ndị unu na-anọ efe ofufe. Agaghịkwa m anụrụ ísì si n’àjà na-esi ísì ọma* unu na-achụ. 32  M ga-eme ka ala unu tọgbọrọ chakoo.+ Ndị iro unu bụ́ ndị ga-ebi na ya ga-ekporopụ anya na-ele ya.+ 33  M ga-achụsasị unu ná mba dị iche iche.+ M ga-emekwa ka ndị iro unu jiri mma agha bịa lụso unu agha.+ A ga-eme ka ala unu tọgbọrọ chakoo,+ bibichaakwa obodo unu dị iche iche. 34  “‘N’oge niile ala unu ga-atọgbọrọ chakoo mgbe unu ga-anọ n’ala ndị iro unu, ala unu ga-akwụ ụgwọ ụbọchị izu ike o ji. N’oge ahụ, ala unu ga-ezu ike,* n’ihi na ọ ga-akwụ ụgwọ ụbọchị izu ike o ji.+ 35  N’ụbọchị niile ọ ga-atọgbọrọ chakoo, ọ ga-ezu ike n’ihi na o zughị ike n’oge o kwesịrị izu ike mgbe unu bi na ya. 36  “‘Ma m ga-eme ka ezigbo ụjọ na-atụ ndị fọrọ n’ime unu,+ bụ́ ndị nọ n’ala ndị iro unu. Mkpọtụ akwụkwọ ifufe na-ebugharị ga-eme ka ha gbaa ọsọ. Ha ga-agba ọsọ ka à ga-asị na e nwere onye ji mma agha achụ ha ọsọ. Ha ga-adakwa n’enweghị onye na-achụ ha.+ 37  Ha ga na-adagide ibe ha ka à ga-asị na e nwere onye ji mma agha achụ ha ọsọ, n’agbanyeghị na e nweghị onye na-achụ ha. Unu agaghị eguzoli n’ihu ndị iro unu.+ 38  Unu ga-anwụ ná mba dị iche iche.+ Ala ndị iro unu ga-atakwa isi unu. 39  A ga-ahapụ ndị fọrọ n’ime unu ka ha rekasịa n’ala ndị iro unu+ n’ihi mmehie unu. N’eziokwu, ha ga-erekasị n’ihi mmehie ndị nna nna ha.+ 40  Ha ga-ekwupụtazi mmehie ha+ na mmehie ndị nna nna ha, kwupụtakwa na ndị nna nna ha bụ ndị a na-ekwesịghị ịtụkwasị obi. Ha ga-ekwetakwa na ha bụ ndị a na-ekwesịghị ịtụkwasị obi nakwa na ha nupụụrụ m isi.+ 41  M ga-ata ha ahụhụ,+ kpọbata ha n’ala ndị iro ha.+ “‘Ikekwe, ha agaghịzi akpọchi obi ha, ha ga-adịkwa umeala n’obi,*+ ha ewee kwụọ ụgwọ mmehie ha. 42  M ga-echeta ọgbụgba ndụ mụ na Jekọb+ na ọgbụgba ndụ mụ na Aịzik+ nakwa ọgbụgba ndụ mụ na Ebreham.+ M ga-echetakwa ala unu 43  maka na mgbe ha na-ebighị n’ala ahụ, ala ahụ nọ na-akwụ ụgwọ ụbọchị izu ike o ji.+ Ọ tọgbọkwa chakoo n’enweghị onye n’ime ha bi na ya. Ha nọkwa na-akwụ ụgwọ mmehie ha n’ihi na ha jụrụ ime ihe m kpebiri. Ha* kpọkwara iwu m asị.+ 44  Ma n’agbanyeghị ihe a niile, mgbe ha nọ n’ala ndị iro ha, agaghị m ajụ ha kpamkpam.+ Agaghịkwa m akpọ ha asị nke na m ga-ekpochapụ ha wee mebie ọgbụgba ndụ mụ na ha,+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke ha. 45  M ga-eji maka ha cheta ọgbụgba ndụ mụ na ndị nna nna ha,+ bụ́ ndị m si n’Ijipt kpọpụta n’ihu mba dị iche iche+ ka m wee gosi na m bụ Chineke ha. Abụ m Jehova.’” 46  Ihe ndị a bụ ntụziaka Jehova na ihe ndị o kpebiri ka ndị Izrel na-eme nakwa iwu ya ndị o si n’aka Mosis nye ndị Izrel n’Ugwu Saịnaị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “na-atụ egwu ebe a na-anọ efe m.”
Na Hibru, “mma agha agaghị agafe.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m agaghịkwa.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ya bụ, mmiri agaghị ezo.
Ya bụ, ala ga-akpọ nkụ.
Na Hibru, “osisi.” O nwere ike ịbụ osisi e ji ekonye achịcha.
Ma ọ bụ “nri.”
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
Ma ọ bụ “n’àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “ga-edebe ụbọchị izu ike.”
Na Hibru, “obi ha a na-ebighị úgwù ga-adịzi umeala n’obi.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ha.”