Levitikọs 23:1-44

  • Ụbọchị ndị dị nsọ na ememme dị iche iche (1-44)

    • Ụbọchị Izu Ike (3)

    • Ememme Ngabiga (4, 5)

    • Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko (6-8)

    • Otú e si eji mkpụrụ mbụ enye onyinye (9-14)

    • Ememme Izu (15-21)

    • Iwe ihe ubi otú kwesịrị ekwesị (22)

    • Ememme e ji ịfụ opi echeta na a ga-eme (23-25)

    • Ụbọchị Ikpuchi Mmehie (26-32)

    • Ememme Ụlọ Ndò (33-43)

23  Jehova gwakwara Mosis, sị:  “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Ememme ndị a ga na-emere Jehova n’oge dị iche iche,+ bụ́ ndị unu ga-ama ọkwa ka e mee,+ bụcha mgbakọ dị nsọ. Ha bụ ememme ndị a ga na-emere m n’oge dị iche iche:  “‘Unu nwere ike ịrụ ọrụ ụbọchị isii, ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike nke a ga-ezu naanị ike na ya.+ Ọ bụ ụbọchị mgbakọ dị nsọ. Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla. Ọ bụ ụbọchị izu ike unu ga-edebere Jehova n’ebe ọ bụla unu bi.+  “‘Ihe ndị a bụ ememme ndị a ga na-emere Jehova n’oge dị iche iche, ya bụ, mgbakọ dị nsọ ndị unu ga-ama ọkwa ka e mee n’oge e ji eme ha:  N’abalị iri na anọ n’ọnwa mbụ,+ unu ga-emere Jehova Ememme Ngabiga ná mgbede.*+  “‘Ọ bụ n’abalị iri na ise n’ọnwa a ka Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko unu ga-emere Jehova ga-amalite.+ Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa.+  N’ụbọchị nke mbụ, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ.+ Unu agaghị arụ ọrụ ọ bụla siri ike.  Ma unu ga-achụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ ruo ụbọchị asaa. Unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ n’ụbọchị nke asaa. Unu agaghị arụ ọrụ ọ bụla siri ike.’”  Jehova gwakwara Mosis, sị: 10  “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe unu ga-emecha bata n’ala m ga-enye unu ma wee ihe ubi ya, unu ga-ebutere onye nchụàjà otu ùkwù ọka bali si ná mkpụrụ mbụ unu+ wetara n’ubi unu.+ 11  Onye nchụàjà ga-efegharị ùkwù ọka bali ahụ n’ihu Jehova ka o wee nabata unu. Ọ bụ n’ụbọchị na-esote Ụbọchị Izu Ike ka ọ ga-efegharị ya. 12  N’ụbọchị e fegharịrị ùkwù ọka bali ahụ, unu ga-achụ ebule ahụ́ dị mma, nke na-agafebeghị otu afọ, n’àjà. Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova. 13  A ga-eji ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, chụọ àjà ọka ya. Ọ bụ àjà na-esi ísì ọma* a na-esuru Jehova ọkụ. A ga-eji otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin* mmanya chụọ àjà mmanya ya. 14  Unu erila achịcha ọ bụla ma ọ bụ ọka bali e ghere eghe* ma ọ bụ ọka bali ọhụrụ ruo n’ụbọchị a, ruo mgbe unu wetaara Chineke unu onyinye. Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe n’ebe ọ bụla unu bi. 15  “‘Malite n’ụbọchị na-esote Ụbọchị Izu Ike ahụ, ya bụ, malite n’ụbọchị unu wetara ùkwù ọka bali a ga-eji chụọ àjà a na-efegharị efegharị, unu ga-agụ ụbọchị izu ike asaa.+ Ụbọchị izu ike ndị ahụ ga-ezu ezu. 16  Unu ga-agụ ụbọchị iri ise+ gụruo n’ụbọchị na-esote Ụbọchị Izu Ike nke asaa, unu ewetaziere Jehova àjà ọka ọhụrụ.+ 17  Unu ga-esi n’ebe unu bi weta ogbe achịcha abụọ ka ọ bụrụ àjà a na-efegharị efegharị. A ga-eji ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma mee ha. A ga-etinye ha ihe na-eko achịcha,+ ka ha bụrụ mkpụrụ mbụ kara aka a na-enye Jehova.+ 18  Ihe ndị unu ga-eweta ha na ogbe achịcha ndị ahụ bụ ebule asaa ahụ́ dị mma, ndị gbara otu afọ otu afọ, nakwa otu ehi na ebule abụọ.+ Ha ga-abụ àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova, ha na àjà ọka ha na àjà mmanya ha. Ọ bụ àjà na-esi ísì ọma* a na-esuru Jehova ọkụ. 19  Unu ga-ejikwa nwa ewu chụọ àjà mmehie,+ jirikwa ụmụ ebule abụọ gbara otu afọ otu afọ chụọ àjà udo.+ 20  Onye nchụàjà ga-efegharị ebule abụọ ahụ, ha na ogbe achịcha ndị ahụ e ji ọka wit mbụ kara aka mee, ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova. Ha ga-abụrụ Jehova ihe dị nsọ nke ga-abụ nke onye nchụàjà.+ 21  N’ụbọchị ahụ, unu ga-ama ọkwa+ ka unu nwee mgbakọ dị nsọ. Unu agaghị arụ ọrụ ọ bụla siri ike. Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe n’ebe ọ bụla unu bi. 22  “‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi n’ala unu, unu ewerechala ihe niile dị n’ọnụ ọnụ ubi unu. Unu atụtụkwala ihe fọrọ n’ihe ubi unu.+ Unu ga-ahapụ ha maka ndị ogbenye+ na ndị mbịarambịa.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’” 23  Jehova gwakwara Mosis, sị: 24  “Gwa ndị Izrel, sị, ‘N’abalị mbụ n’ọnwa nke asaa, unu ga-ezu naanị ike. A ga-afụ opi+ n’ụbọchị ahụ ka e chetara unu na a ga-enwe mgbakọ dị nsọ. 25  Unu agaghị arụ ọrụ ọ bụla siri ike. Unu ga-achụkwara Jehova àjà a na-esu ọkụ.’” 26  Jehova gwakwuru Mosis, sị: 27  “Ma, ụbọchị nke iri n’ọnwa nke asaa ahụ ga-abụ Ụbọchị Ikpuchi Mmehie.+ Unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ. Unu ga-emekpa onwe* unu ahụ́,*+ chụọkwara Jehova àjà a na-esu ọkụ. 28  Unu arụla ụdị ọrụ ọ bụla n’ụbọchị a n’ihi na ọ bụ ụbọchị ikpuchi mmehie nke a ga-eji na-ekpuchiri unu mmehie+ unu n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu. 29  Onye* ọ bụla na-emekpaghị onwe ya ahụ́* n’ụbọchị ahụ, a ga-egbu ya.*+ 30  M ga-ebibi onye* ọ bụla rụrụ ụdị ọrụ ọ bụla n’ụbọchị ahụ. 31  Unu arụla ụdị ọrụ ọ bụla. Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe n’ebe ọ bụla unu bi. 32  Ọ bụ ụbọchị izu ike nke unu ga-ezu naanị ike na ya. Unu ga-emekpakwa onwe* unu ahụ́+ ná mgbede ụbọchị nke itoolu n’ọnwa ahụ. Unu ga-edebe ụbọchị izu ike unu malite ná mgbede ruo ná mgbede.” 33  Jehova gwakwara Mosis, sị: 34  “Gwa ndị Izrel, sị, ‘N’abalị iri na ise n’ọnwa asaa ahụ, unu ga-amalite Ememme Ụlọ Ndò a na-emere Jehova. Unu ga-eme ya ruo ụbọchị asaa.+ 35  Unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ n’ụbọchị nke mbụ. Unu agaghịkwa arụ ọrụ ọ bụla siri ike. 36  Unu ga-achụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ ruo ụbọchị asaa. N’ụbọchị nke asatọ, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ.+ Unu ga-achụkwara Jehova àjà a na-esu ọkụ. Ọ bụ nzukọ pụrụ iche. Unu agaghị arụ ọrụ ọ bụla siri ike. 37  “‘Ihe ndị a bụ ememme+ ndị a ga na-emere Jehova, ndị unu ga-ama ọkwa ka e mee ka ha bụrụ mgbakọ dị nsọ.+ Ha ga-abụ oge a ga na-achụrụ Jehova àjà a na-esuru ya ọkụ, ya bụ, àjà a na-esu ọkụ+ na àjà ọka+ na àjà mmanya.+ A ga na-achụ àjà ndị a otú e kwuru ka a na-achụ ha n’ụbọchị nke ọ bụla. 38  Unu ga na-achụ àjà ndị a, na-achụkwa ndị nke a na-achụ n’ụbọchị izu ike niile nke Jehova,+ ha na onyinye ndị unu wetara,+ onyinye ndị unu kwere ná nkwa,+ nakwa onyinye ndị si unu n’obi,+ bụ́ ndị unu ga-enye Jehova. 39  Ma n’abalị iri na ise n’ọnwa nke asaa, mgbe unu chịkọtachara ihe ala unu mepụtara, unu ga-eme ememme Jehova ruo ụbọchị asaa.+ Unu ga-ezu naanị ike n’ụbọchị nke mbụ. Unu ga-ezukwa naanị ike n’ụbọchị nke asatọ.+ 40  N’ụbọchị nke mbụ, unu ga-ewere mkpụrụ nke osisi ndị mara mma, igu nkwụ,+ alaka osisi ndị nwere akwụkwọ na alaka osisi pọpla ndị dị na ndagwurugwu. Unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ+ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu ruo ụbọchị asaa.+ 41  Unu ga-eme ya ụbọchị asaa n’afọ ka ọ bụrụ ememme a na-emere Jehova.+ Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe. Unu ga na-eme ya n’ọnwa nke asaa. 42  Unu ga-ebi n’ụlọ ndò ụbọchị asaa.+ Ndị niile bụ́ ụmụ afọ Izrel ga-ebi n’ụlọ ndò, 43  ka ọgbọ unu ndị ga-esote unu wee mara+ na ọ bụ n’ụlọ ndò ka m mere ka ndị Izrel biri mgbe m na-akpọpụta ha n’Ijipt.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’” 44  Mosis wee gwa ndị Izrel banyere ememme ndị a ga na-emere Jehova n’oge dị iche iche.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ n’agbata oge anyanwụ dara na mgbe chi bidoro iji.
Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa bụ lita 4.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Hin bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu hin bụ lita 3.67. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “a ṅara n’ọkụ.”
Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa bụ lita 4.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
“Mmadụ imekpa onwe ya ahụ́” pụtara na onye ahụ agaghị emere onwe ya ihe ndị o kwesịrị imere onwe ya. Ibu ọnụ so na ya.
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”
O nwere ike ịbụ, “na-ebughị ọnụ.”
Na Hibru, “a ga-esi ná ndị ya gbupụ ya.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”