Joshụa 23:1-16

  • Okwu ikpeazụ Joshụa gwara ndị isi ndị Izrel (1-16)

    • O nweghị ihe Jehova kwuru nke na-emezughị (14)

23  Mgbe ọtụtụ afọ gachara, mgbe Jehova mere ka ndị Izrel zuoro ndị iro niile gbara ha gburugburu ike,+ mgbe Joshụa merela agadi, kaa ezigbo nká,+  Joshụa kpọkọrọ Izrel niile,+ ma ndị okenye ha, ma ndị isi ha, ma ndị ikpe ha, ma ndị ndú ha,+ wee sị ha: “Emeela m agadi, kaa ezigbo nká.  Unu ahụkwala ihe niile Jehova bụ́ Chineke unu mere mba ndị a niile n’ihi unu. Jehova bụ́ Chineke unu meere unu ya maka na ọ bụ ya na-alụrụ unu agha.+  Efere m nza+ keere unu ala mba ndị a a na-ebibibeghị ka ha bụrụ ihe ebo unu dị iche iche ketara.+ M kekwaara unu ala mba niile m bibiri+ n’ebe ọdịda anyanwụ, malite n’Osimiri Jọdan ruo n’Oké Osimiri Mediterenian.*  Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu nọ na-achụpụrụ unu ha.+ Ọ napụkwara ha ala ha n’ihi unu. Unu ewegharakwala ya otú Jehova bụ́ Chineke unu kwere unu ná nkwa.+  “Obi sie unu ike idebe ihe niile e dere n’akwụkwọ Iwu+ Mosis na ime ha. Unu ahapụkwala ha mewe ihe ọzọ.+  Unu na mba ndị a fọrọ akpakwala.+ Unu akpọkwala chi ha aha+ ma ọ bụkwanụ jiri ha ṅụọ iyi. Unu efekwala ha ofufe. Unu akpọkwarala ha isiala.+  Unu ahapụkwala Jehova bụ́ Chineke unu+ otú ahụ unu na-ahapụbeghị ya ruo taa.  Jehova ga-achụpụrụ unu nnukwu mba ndị siri ezigbo ike+ otú ọ na-emere unu ruo taa, nke mere na o nwebeghị onye nọchiiri unu ụzọ.+ 10  Naanị otu onye n’ime unu ga-achụ otu puku mmadụ ọsọ,+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu na-alụrụ unu agha,+ otú o kwere unu ná nkwa.+ 11  N’ihi ya, kpacharanụ anya mgbe niile+ ka unu hụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya.+ 12  “Ma ọ bụrụ na unu ahapụ Chineke, gakwuru ndị fọrọnụ ná mba ndị a,+ ndị unu na ha bi, unu na ha amalite ịgọ ọgọ,+ malitekwa ịkpakọrịta, 13  ya doo unu anya na Jehova bụ́ Chineke unu agaghịzi na-achụpụrụ unu mba ndị a.+ Ha ga-adịzi unu ka igbudu na ọnyà e ji anwụde unu, dịkwa unu ka ụtarị a na-apịa unu n’akụkụ abụọ,+ dịkwa unu ka ogwu dị n’anya unu. Ha ga-adịgide unu otú a ruo mgbe unu lara n’iyi n’ọmarịcha ala a Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu. 14  “Ugbu a, oge ọnwụ m eruwela. Unu makwa nke ọma na o nweghị otu n’ime ọmarịcha nkwa niile Jehova bụ́ Chineke unu kwere unu nke na-emezughị. Ha niile emezuolara unu. O nweghị nke n’ime ha na-emezughị.+ 15  Ma, otú a ọmarịcha nkwa niile Jehova bụ́ Chineke unu kwere unu si mezuoro unu+ ka Jehova nwekwara ike isi mee ka ọdachi niile ọ gwara unu gbasara ha dakwasị unu, kpochapụkwa unu n’ọmarịcha ala a Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu.+ 16  Ọ bụrụ na unu emebie ọgbụgba ndụ Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu ka unu ghara imebi, ọ bụrụkwa na unu agaa fee chi ọzọ dị iche iche ma kpọọrọ ha isiala, Jehova ga-ewesa unu ezigbo iwe.+ Unu ga-alakwa n’iyi ngwa ngwa n’ọmarịcha ala a o nyere unu.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “n’Oké Osimiri ahụ.”