Habakọk 1:1-17
1 Ihe a bụ ozi gbara ọkpụrụkpụ mụnwa, bụ́ Habakọk* onye amụma, nụrụ mgbe m na-ahụ ọhụụ. M kwuru, sị:
2 Jehova, olee mgbe m ga-etiru mkpu ka i nyere m aka, gị anụ?+
Olee mgbe m ga-arịọru gị ka ị napụta m n’aka ndị tigbuo zọgbuo, gị anapụta m?*+
3 Gịnị mere i ji mee ka m na-ahụ ndị na-eme ihe ọjọọ?
Gịnịkwa mere i ji hapụ ndị na-emegbu ndị ọzọ?
Gịnị mere m ji na-ahụ ndị na-emebisị ihe ndị mmadụ na ndị tigbuo zọgbuo?
Gịnịkwa mere e ji na-ese okwu ma na-alụ ọgụ ebe niile?
4 N’ihi ya, o nweghị onye na-edebe iwu,A naghịkwa ekpe ikpe ziri ezi.
Ndị ajọ omume gbara ndị ezi omume gburugburu.
Ọ bụ ya mere na a naghịzi ekpe ikpe ziri ezi.+
5 “Leenụ anya ná mba niile, hụkwanụ ihe na-eme.
Kporopụnụ anya na-ele ha, ka o jukwa unu anya.
N’ihi na o nwere ihe ga-eme n’oge unuNke unu na-agaghị ekweta ọ bụrụgodị na a gwa unu ya.+
6 E nwere ihe m ga-eji ndị Kaldia mee.*+
Ha bụ mba obi fere azụ na ndị na-eme ihe ọkụ ọkụ.
Ha na-aga ọtụtụ ebe n’ụwaNa-eweghara ụlọ ndị na-abụghị nke ha.+
7 Ha dị egwu, a na-atụkwa ha ụjọ.
Ọ bụ ha na-etiri onwe ha iwu, na-enyekwa onwe ha ikike.*+
8 Ịnyịnya ha na-awụ ọsọ karịa agụ owuru,Na-akpakwa ike karịa anụ ọhịa wolf ndị na-apụta n’abalị.+
Ịnyịnya agha ha na-awụ ajọ ọsọ.
Ịnyịnya ha na-esi ebe dị anya abịa.
Ha na-efe ọsọ abịa ka mgbe ugo ji ike na-efedata ka o rie ihe.+
9 Ha niile na-abịa ka ha mebisịa ihe.+
Ha niile gakọọ ọnụ, ha na-adị ka ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ.+
Ha na-ekpokọrọkwa ndị ha dọọrọ n’agha otú e si ekporo ájá.
10 Ha na-akwa ndị eze emo,Na-achịkwa ndị isi ọchị.+
Ha na-achị ebe ọ bụla a rụsiri ike ọchị.+
Ha na-ekpokọta ájá ma weghara ebe ahụ.
11 Ha na-aga n’ihu n’ihu ka ifufe, gaferekwa ala ahụ.
Ma ikpe ga-ama ha+
N’ihi na ha kwuru na ọ bụ chi ha nyere ha ike.”*+
12 Jehova, ọ́ bụghị kemgbe ebighị ebi ka ị dị?+
Chineke m, Onye Nsọ m, ị naghị anwụ anwụ.*+
Jehova, ị họpụtara ha ka ha mee ihe i kpebiri.
Oké Nkume m,+ ọ bụ maka ịta anyị ahụhụ* ka i ji mee ka ha dịrị.+
13 Anya gị dị ezigbo nsọ nke na ọ naghị ele ihe ọjọọ.
I nweghịkwa ike ịhapụ ihe ọjọọ ka ọ dịrị na-aga.+
Gịnịzi mere i ji hapụ ndị aghụghọ?+
Gịnịkwa mere i ji na-agbachi nkịtị mgbe onye ajọ omume na-eloda onye ka ya mma?+
14 Gịnị mere i ji hapụ ka a na-eme ndị mmadụ ka hà bụ azụ̀ dị n’oké osimiri?
Gịnịkwa mere i ji hapụ ka a na-eme ha ka hà bụ ihe ndị na-arị arị* na-enweghị onye na-achị ha?
15 Ha* na-eji nko azụ̀ adọpụta ihe a niile.
Ha na-eji ụgbụ ha ejide ha,Ha na-achịkọtakwa ha n’ụgbụ ha ji akụ azụ̀.
Ọ bụ ya mere ha ji na-aṅụrị ezigbo ọṅụ.+
16 Ọ bụ ya mere ha ji achụrụ ụgbụ ha àjà,Na-achụkwara ụgbụ ha ji akụ azụ̀ àjà.
N’ihi na ụgbụ ha na-eme ka òkè ha hie nne,*Na-emekwa ka nri ha na-edozi ahụ́.
17 Ọ̀ bụ ya mere ha ga na-eji awụpụ ihe ndị dị n’ụgbụ ha?*
Hà ga na-ala mba dị iche iche n’iyi n’emereghị ha ebere?+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ O nwere ike ịbụ na Habakọk pụtara “Ịmakụ Mmadụ nke Ọma.”
^ Ma ọ bụ “azọpụta m.”
^ Na Hibru, “M ga-eme ka ndị Kaldia bilie.”
^ Ma ọ bụ “na-ebulikwa onwe ha elu.”
^ O nwere ike ịbụ, “chi ha bụ ike ha.”
^ O nwere ike ịbụ, “anyị agaghị anwụ.”
^ Ma ọ bụ “maka ịdọ anyị aka ná ntị.”
^ Ma ọ bụ “ihe ndị na-akpụ akpụ.”
^ Ya bụ, ndị Kaldia bụ́ ndị iro ndị Izrel.
^ Na Hibru, “maa abụba.”
^ O nwere ike ịbụ, “ga na-eji amịpụta mma agha ha?”