Diuterọnọmi 7:1-26

  • Mba asaa ndị Izrel ga-ebibi (1-6)

  • Ihe mere Chineke ji họrọ ndị Izrel (7-11)

  • Irube isi ga-eme ka ihe gaziere ndị Izrel (12-26)

7  “Mgbe Jehova bụ́ Chineke unu ga-akpọbata unu n’ala ahụ unu ga-abanye ma biri na ya,+ ọ ga-ekpochapụrụ unu mba ndị dị ọtụtụ,+ ya bụ, ndị Het, ndị Gegash, ndị Amọraịt,+ ndị Kenan, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus,+ mba asaa ndị dị ọtụtụ ma dị ike karịa unu.+  Jehova bụ́ Chineke unu ga-enyefe ha n’aka unu, unu ga-emerikwa ha.+ Hụnụ na unu bibiri ha.+ Unu na ha agbala ndụ. Unu emekwarala ha ebere ọ bụla.+  Unu na ha agọla ọgọ. Unu akpọrọla ụmụ unu ndị nwaanyị kpọnye ụmụ ha ndị nwoke. Unu alụtakwarala ụmụ unu ndị nwoke ụmụ ha ndị nwaanyị.+  N’ihi na ha ga-eme ka ụmụ unu kwụsị ife m wee fewe chi ọzọ dị iche iche.+ Jehova ga-ewesazi unu oké iwe, ọ ga-ebibikwa unu n’egbughị oge.+  “Kama, ihe a ka unu ga-eme ha: Kwatusịanụ ebe ịchụàjà ha, kụtusịanụ ogidi arụsị ha,+ gbutusịanụ ogwe osisi arụsị* ha,+ kpọọkwanụ arụsị ha a pịrị apị ọkụ.+  N’ihi na unu bụụrụ Jehova bụ́ Chineke unu ndị dị nsọ, Jehova bụ́ Chineke unu ahọrọkwala unu ka unu bụrụ ndị ya, ndị pụrụ iche n’ime ndị niile nọ n’ụwa.+  “Ihe mere Jehova ji hụ unu n’anya ma họrọ unu abụghị maka na unu dị ọtụtụ karịa ndị ọzọ niile,+ n’ihi na ọ bụ unu kacha nta ná ndị niile.+  Kama, ọ bụ maka na Jehova hụrụ unu n’anya nakwa maka na ọ na-emezu iyi ọ ṅụụrụ nna nna unu hà+ mere Jehova ji jiri aka ya dị ike kpọpụta unu, ka o wee napụta unu n’ebe unu nọ na-agba ohu,*+ n’aka Fero eze Ijipt.  O dokwara unu anya na Jehova bụ́ Chineke unu bụ ezi Chineke, Chineke e kwesịrị ịtụkwasị obi, onye na-anaghị emebi ọgbụgba ndụ ya na ndị hụrụ ya n’anya na ndị na-edebe iwu ya gbara, na-ahụkwa ha n’anya* ruo otu puku ọgbọ.+ 10  Ma ọ na-ebibi ndị kpọrọ ya asị, si otú ahụ kwụọ ha ụgwọ ihe ha metara.+ Ọ gaghị egbu oge ịta ndị kpọrọ ya asị ahụhụ. Ọ ga-akwụ ha ụgwọ ihe ha metara. 11  N’ihi ya, lezienụ anya ka unu na-edebe iwu ya, na-eso ntụziaka ya, na-emekwa ihe ndị o kpebiri ka unu na-eme, bụ́ ihe ndị m na-enye unu n’iwu taa. 12  “Ọ bụrụ na unu ana-erube isi n’ihe ndị Jehova bụ́ Chineke unu kpebiri ka unu na-eme, na-emekwa ha, ọ ga-emezu ọgbụgba ndụ ya ma hụ unu n’anya* otú ọ ṅụụrụ nna nna unu hà n’iyi. 13  Ọ ga-ahụ unu n’anya, gọzie unu ma mee ka unu mụbaa. Ọ ga-eme ka unu mụta ọtụtụ ụmụ.*+ Ọ ga-agọzikwa ihe unu kụrụ n’ala unu, ọka* unu, mmanya ọhụrụ unu, mmanụ unu,+ ụmụ ehi unu na ụmụ ìgwè ewu na atụrụ unu, n’ala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna unu hà iyi na ọ ga-enye unu.+ 14  Unu ga-abụ ndị a kacha gọzie agọzie n’ime ndị ọzọ niile.+ A gaghị enwe nwoke ma ọ bụ nwaanyị n’ime unu na-agaghị amụta nwa. A gaghịkwa enwe anụ ụlọ unu na-agaghị amụta nwa.+ 15  Jehova ga-ewepụrụ unu ọrịa niile. Ọ gaghị eme ka unu rịa ọrịa ọjọọ ọ bụla unu hụrụ n’Ijipt.+ Kama, ọ ga-eme ka ndị niile kpọrọ unu asị rịa ha. 16  Unu ga-ebibi ndị niile Jehova bụ́ Chineke unu na-enyefe n’aka unu.+ Unu* emerela ha ebere.+ Unu efekwala chi ha dị iche iche ofufe,+ n’ihi na ọ ga-abụrụ unu ọnyà.+ 17  “Ọ bụrụ na unu ekwuo n’obi unu, sị, ‘Mba ndị a dị ọtụtụ karịa anyị. Olee otú anyị ga-esi achụpụ ha?’+ 18  unu atụla ha egwu.+ Chetaranụ onwe unu ihe Jehova bụ́ Chineke unu mere Fero na Ijipt niile,+ 19  nnukwu ahụhụ a tara ha nke unu ji anya unu hụ na ihe àmà na ọrụ ebube+ na aka siri ike na ike Jehova bụ́ Chineke unu ji kpọpụta unu.+ Ọ bụ ihe Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ndị niile unu na-atụ egwu.+ 20  Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka egwu jide ha ruo mgbe ndị fọrọ afọ+ na ndị na-ezoro unu onwe ha nwụchara. 21  Unu atụla ha ụjọ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu nọnyeere unu.+ Ọ bụ onye ukwu na Chineke e kwesịrị ịtụ egwu.+ 22  “Jehova bụ́ Chineke unu ga-eji nke nta nke nta chụpụrụ unu mba ndị a.+ A gaghị ekwe ka unu bibie ha ọsọ ọsọ, ka anụ ọhịa ghara ịmụba tagbusiwe unu. 23  Jehova bụ́ Chineke unu ga-enyefe ha n’aka unu ma merie ha kpamkpam ruo mgbe e bibichara ha.+ 24  Ọ ga-enyefe ndị eze ha n’aka unu.+ Unu ga-ehichapụkwa aha ha n’ụwa.*+ E nweghị onye ga-anọchiri unu ụzọ+ ruo mgbe unu kpochapụrụ ha.+ 25  Unu ga-akpọ arụsị ha a pịrị apị, bụ́ ndị ha ji mere chi, ọkụ.+ Agụụ ọlaọcha na ọlaedo dị n’arụsị ndị ahụ agụla unu.+ Unu ewerekwala ha, ka ha ghara ịbụrụ unu ọnyà, n’ihi na ọ bụ arụ n’anya Jehova bụ́ Chineke unu.+ 26  Unu ewebatala ihe Chineke kpọrọ asị n’ụlọ unu wee si otú ahụ bụrụ ndị a ga-ebibi ebibi otú a ga-ebibi ihe ahụ. Unu ga-asọ ihe ahụ oyi, kpọọkwa ya asị n’ihi na ọ bụ ihe a ga-ebibi ebibi.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “n’ụlọ ndị ohu.”
Ma ọ bụ “na-egosi ha ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “gosi unu ịhụnanya pụrụ iche.”
Na Hibru, “Ọ ga-agọzi mkpụrụ nke afọ unu.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “Anya unu.”
Na Hibru, “n’okpuru eluigwe.”