Diuterọnọmi 5:1-33

  • Ndụ Jehova na ndị Izrel gbara na Horeb (1-5)

  • E chetaara ndị Izrel Iwu Iri ahụ (6-22)

  • Ndị Izrel tụrụ egwu n’Ugwu Saịnaị (23-33)

5  Mosis wee kpọkọta ndị Izrel niile, sị ha: “Ndị Izrel, nụrụnụ ntụziaka na iwu ndị m na-enye unu taa. Mụtanụ ha, leziekwanụ anya ka unu na-edebe ha.  Anyị na Jehova bụ́ Chineke anyị gbara ndụ na Horeb.+  Ọ bụghị nna nna anyị hà ka ha na Jehova gbara ndụ a, kama ọ bụ anyị na ya, ya bụ, anyị niile ndị dị ndụ ebe a taa.  Jehova si n’ọkụ+ gwa unu okwu ihu na ihu n’ugwu ahụ.  M guzo n’agbata unu na Jehova n’oge ahụ+ ka m gwa unu ihe Jehova kwuru maka na unu tụrụ egwu n’ihi ọkụ ahụ, unu agbagoghịkwa n’ugwu ahụ.+ Chineke sịrị:  “‘Abụ m Jehova bụ́ Chineke gị, onye kpọpụtara gị n’Ijipt, bụ́ ebe ị nọ na-agba ohu.*+  Ya enwela mgbe ị ga-enwe chi ọ bụla ọzọ ma e wepụ m.+  “‘Emerela onwe gị arụsị a pịrị apị+ ma ọ bụ ihe yiri ihe ọ bụla dị n’eluigwe ma ọ bụ ihe dị n’ụwa ma ọ bụ ihe dị na mmiri ndị dị n’ụwa.  Akpọrọla ha isiala, ekwekwala ka e mee ka i fee ha ofufe,+ n’ihi na mụnwa bụ́ Jehova Chineke gị bụ Chineke nke chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe.+ M na-ata ụmụ ndị kpọrọ m asị ahụhụ, na-atakwa ọgbọ ha nke atọ nakwa ọgbọ ha nke anọ ahụhụ n’ihi mmehie ndị nna ha.+ 10  Ma m na-egosi otu puku ọgbọ nke ndị hụrụ m n’anya ma na-edebe iwu m na m hụrụ ha n’anya. 11  “‘Ejila aha Jehova bụ́ Chineke gị eme ihe efu+ n’ihi na Jehova ga-ata onye ọ bụla ji aha ya eme ihe efu ahụhụ.+ 12  “‘Debe Ụbọchị Izu Ike ka i doo ya nsọ, otú Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị n’iwu.+ 13  Ị ga-eji ụbọchị isii jee ozi ma rụọ ọrụ gị niile,+ 14  ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike a ga na-edebere Jehova bụ́ Chineke gị.+ Arụla ọrụ ọ bụla+, ma gị ma nwa gị nwoke ma nwa gị nwaanyị ma ohu gị nwoke ma ohu gị nwaanyị ma ehi gị ma jakị gị ma anụ ụlọ gị ọ bụla ma onye mbịarambịa nọ n’obodo gị,+ ka ohu gị nwoke na ohu gị nwaanyị wee zuo ike otú ị ga-ezu.+ 15  Cheta na ị nọ na-agba ohu n’Ijipt nakwa na Jehova bụ́ Chineke gị ji aka ya siri ike na ike ya kpọpụta gị n’ebe ahụ.+ Ọ bụ ya mere Jehova bụ́ Chineke gị ji nye gị iwu ka ị na-edebe Ụbọchị Izu Ike. 16  “‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,+ otú Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị n’iwu, ka i wee dị ogologo ndụ, ihe agaziekwara gị n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị ga-enye gị.+ 17  “‘Egbula mmadụ.*+ 18  “‘Akwala iko.+ 19  “‘Ezula ohi.+ 20  “‘Agbagidela mmadụ ibe gị akaebe ụgha.+ 21  “‘Agụụ nwunye mmadụ ibe gị agụla gị.+ Agụụ iweghara ụlọ mmadụ ibe gị ma ọ bụ ubi ya ma ọ bụ ehi ya ma ọ bụ jakị ya agụla gị. Agụụ ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị ma ọ bụ ihe ọ bụla bụ́ nke mmadụ ibe gị agụla gị.’+ 22  “Ọ bụ iwu ndị a ka Jehova nyere ọgbakọ unu niile n’ugwu ahụ. O si n’ọkụ, n’ígwé ojii, nakwa n’oké ọchịchịrị+ kwuo ya n’olu dara ụda, e nweghịkwa ihe ọzọ ọ gbakwụnyere na ya. O deziri ha ná mbadamba nkume abụọ ma nye m ha.+ 23  “Ma ozugbo unu nụrụ olu ahụ nke si n’ọchịchịrị ahụ na-ekwu okwu n’oge ugwu ahụ nọ na-ere ọkụ,+ ndị niile bụ́ ndị isi n’ebo unu na ndị okenye unu bịakwutere m. 24  Unu wee sị, ‘Jehova bụ́ Chineke anyị egosila anyị na ọ dị ebube, meekwa ka anyị hụ na ọ dị ike, anyị esikwala n’ọkụ nụ olu ya.+ Taa, anyị ahụla na Chineke nwere ike ịgwa mmadụ okwu, onye ahụ aka dị ndụ.+ 25  Gịnịzi mere anyị ga-eji akpatara onwe anyị ọnwụ? N’ihi na oké ọkụ a nwere ike iregbu anyị. Ọ bụrụ na anyị anọrọ na-anụ olu Jehova bụ́ Chineke anyị, anyị ga-anwụrịrị. 26  N’ihi na olee onye nụtụrụla olu Chineke dị ndụ ka o si n’ọkụ na-ekwu okwu otú anyị nụrụ ya ma ka dịrị ndụ? 27  Gịnwa gaa nso ka ị nụ ihe niile Jehova bụ́ Chineke anyị ga-ekwu. Ọ bụ gị ga-agwa anyị ihe niile Jehova bụ́ Chineke anyị ga-agwa gị. Anyị ga-egekwa ntị ma mee ha.’+ 28  “Jehova nụrụ ihe unu gwara m. Jehova wee sị m, ‘Anụla m ihe ndị a gwara gị. Ihe niile ha kwuru dị mma.+ 29  A sị nnọọ na ha ga-azụ obi ha ka ha na-atụ egwu m mgbe niile+ ma na-edebe ihe niile m nyere n’iwu,+ ihe ga-agaziri ha na ụmụ ha ruo mgbe ebighị ebi.+ 30  Gaa sị ha: “Laghachinụ n’ụlọikwuu unu.” 31  Ma ị ga-eso m nọrọ ebe a ka m mee ka ị mata iwu niile, ntụziaka, na ihe ndị m kpebiri, bụ́ ndị ị ga-akụziri ha, ndị ha ga na-edebekwa n’ala m na-enye ha ka ọ bụrụ nke ha.’ 32  Lezienụ anya ka unu na-eme nnọọ ihe Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu n’iwu.+ Unu ahapụla ya mewe ihe ọzọ.+ 33  Na-emenụ ihe niile Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu n’iwu,+ ka unu wee dị ndụ, ka ihe wee gaziere unu, ka unu wee bitee aka n’ala ahụ unu ga-enweta.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “n’ụlọ ndị ohu.”
Ma ọ bụ “Egbula ọchụ.”