Diuterọnọmi 16:1-22

  • Ememme Ngabiga; Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko (1-8)

  • Ememme Izu (9-12)

  • Ememme Ụlọ Ndò (13-17)

  • Ịhọpụta ndị ikpe (18-20)

  • Ihe a na-ekwesịghị ife ofufe (21, 22)

16  “Na-echetanụ ọnwa Ebib,* na-emekwaranụ Jehova bụ́ Chineke unu Ememme Ngabiga+ na ya, n’ihi na ọ bụ n’ọnwa Ebib ka Jehova bụ́ Chineke unu kpọpụtara unu n’Ijipt, n’abalị.+  Unu ga-esi n’ìgwè ewu na atụrụ nakwa n’ìgwè ehi+ were anụ chụọrọ Jehova bụ́ Chineke unu àjà+ Ememme Ngabiga n’ebe Jehova họọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya.+  Unu erikọtala ya na ihe ọ bụla e tinyere ihe na-eko achịcha.+ Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko, bụ́ achịcha ahụhụ, ụbọchị asaa, n’ihi na unu si n’Ijipt pụta ọkụ ọkụ.+ Na-emenụ ihe a ka unu wee na-echeta ụbọchị unu si n’Ijipt pụta n’oge niile unu dị ndụ.+  A gaghị ahụ ihe na-eko achịcha n’aka unu n’ala unu niile ruo ụbọchị asaa.+ Anụ ọ bụla unu ga-achụ n’àjà ná mgbede ụbọchị mbụ agaghị afọ ruo ụtụtụ.+  A gaghị ekwe ka unu nọrọ n’obodo ọ bụla dị unu mma n’ime obodo ndị Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu chụọ anụ e ji eme Ememme Ngabiga n’àjà.  Kama ọ bụ n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu họọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya ka unu ga-anọ chụọ ya. Unu ga-achụ anụ e ji eme Ememme Ngabiga n’àjà ná mgbede, ozugbo anyanwụ dara,+ kpọmkwem n’ụbọchị dabara n’ụbọchị unu si n’Ijipt pụta.  Unu ga-esi ya, riekwa ya+ n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ.+ N’ụtụtụ, unu ga-alaghachi n’ụlọikwuu unu.  Ụbọchị isii ka unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko. N’ụbọchị nke asaa, a ga-enwe nzukọ pụrụ iche maka Jehova bụ́ Chineke unu. Unu arụla ọrụ ọ bụla.+  “Unu ga-agụ izu asaa. Unu ga-ebido ịgụ izu asaa ahụ n’oge mbụ unu ji mma e ji ewe ihe ubi gbute ọka bali n’ubi unu.+ 10  Unu ga-ejizi onyinye si unu n’obi, bụ́ ndị unu wetara, meere Jehova bụ́ Chineke unu Ememme Izu.+ Unu ga-eweta onyinye ndị ahụ otú Jehova bụ́ Chineke unu si agọzi unu.+ 11  Unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu, unu na ụmụ unu ndị nwoke, ụmụ unu ndị nwaanyị, ohu unu ndị nwoke, ohu unu ndị nwaanyị, onye Livaị nke bi n’obodo unu, onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna,* nakwa nwaanyị di ya nwụrụ, bụ́ ndị bi n’obodo unu, n’ebe ahụ Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya.+ 12  Chetanụ na unu nọ na-agba ohu n’Ijipt.+ Soronụ ntụziaka ndị a, na-emekwanụ ha. 13  “Unu ga-eme Ememme Ụlọ Ndò+ ụbọchị asaa mgbe unu si n’ebe unu na-azọcha ọka* na ebe unu na-azọchapụta mmanụ nakwa n’ebe unu na-azọchapụta mmanya na-ebubata ihe ubi unu mepụtara. 14  Unu ga-aṅụrị ọṅụ n’oge ememme unu,+ unu na ụmụ unu ndị nwoke, ụmụ unu ndị nwaanyị, ohu unu ndị nwoke, ohu unu ndị nwaanyị, onye Livaị, onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna, nakwa nwaanyị di ya nwụrụ, bụ́ ndị bi n’obodo unu. 15  Ụbọchị asaa ka unu ga-emere Jehova bụ́ Chineke unu ememme+ n’ebe Jehova ga-ahọrọ, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu ga-agọzi ihe niile ala unu mepụtara nakwa ihe niile unu na-eme.+ Unu ga na-aṅụrị naanị ọṅụ.+ 16  “Ugboro atọ n’afọ ka ụmụ nwoke unu niile ga-abịa n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu n’ebe ọ ga-ahọrọ: n’Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko,+ n’Ememme Izu,+ nakwa n’Ememme Ụlọ Ndò.+ E nweghị onye n’ime ha ga-agba aka bịa n’ihu Jehova. 17  Onye ọ bụla n’ime unu ga-eweta onyinye otú Jehova bụ́ Chineke unu si gọzie ya.+ 18  “Unu ga-ahọpụta ndị ikpe+ na ndị isi maka ebo nke ọ bụla n’obodo niile Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu. Ha ga na-ekpere ndị Izrel ikpe ziri ezi. 19  Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi.+ Unu elela mmadụ anya n’ihu.+ Unu anakwala aka azụ n’ihi na ịna aka azụ na-emechi anya ndị ma ihe,+ na-emekwa ka ndị bụ́ ezigbo mmadụ gbanwee okwu ha. 20  Na-ekpenụ naanị ikpe ziri ezi mgbe niile,+ ka unu wee dịrị ndụ ma nweta ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu. 21  “Unu akụla ụdị osisi ọ bụla ka ọ bụrụ ogwe osisi arụsị*+ n’akụkụ ebe ịchụàjà unu ga-arụrụ Jehova bụ́ Chineke unu. 22  “Unu agaghịkwa arụrụ onwe unu ogidi arụsị,+ bụ́ ihe Jehova Chineke unu kpọrọ asị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Gụọ B15.
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.