Abụ Ọma 65:1-13

  • Chineke na-elekọta ụwa

    • “Onye na-anụ ekpere” (2)

    • ‘Onye ị họọrọ na-enwe obi ụtọ’ (4)

    • Ihe ọma Chineke na-eme dị ọtụtụ (11)

Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ọma Devid. Abụ. 65  Chineke, ọ bụ gị ka a ga-eto na Zayọn.+ Anyị ga-emezu nkwa anyị kwere gị.+   Gị Onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka ụdị mmadụ* niile ga-abịakwute.+   Mmehie m anyịgbuola m.+ Ma ị na-agbaghara m* ihe ọjọọ ndị m na-eme.+   Onye ị họọrọ ma kpọta nsoKa o biri n’ogige ụlọ gị na-enwe obi ụtọ.+ Ihe ọma ndị dị n’ụlọ gị,N’ụlọ nsọ gị,+ ga-eju anyị afọ.+   Chineke, onye na-azọpụta anyị,Ị ga-eme ihe ndị ziri ezi ma dị egwu iji za anyị.+ Ọ bụ gị ka ndị bi n’ebe niile ụwa sọtụrụ,Nakwa ndị bi n’ebe dị anya n’ofe oké osimiri, tụkwasịrị obi.+   I* ji ike gị mee ka ugwu kwụrụsie ike. Ike gị* dị ukwuu.+   Ị* na-eme ka oké osimiri ndị na-enugharị enugharị dajụọ,+Na-emekwa ka mkpọtụ ebili mmiri na ụzụ mba dị iche iche na-eme dajụọ.+   Ndị bi n’ebe ndị dị anya ga-atụ egwu n’ihi ihe ndị dị ịtụnanya ị na-eme.+ Ị ga-eme ka ndị bi n’ebe ọwụwa anyanwụ na ndị bi n’ebe ọdịda anyanwụ tie mkpu ọṅụ.   Ị na-elekọta ụwa,Na-eme ka ọ na-eme ezigbo nri n’ụba.+ Mmiri juru n’iyi Chineke kere. I mere ka ụwa na-emepụtara ndị mmadụ nri,+N’ihi na ọ bụ otú a ka ị kwadebere ụwa ka ọ na-eme. 10  Ị na-eme ka mmiri dee ebe ndị a kọrọ akọ na ya, kposaakwa ájá ndị a kọrọ akọ. Ị na-eme ka mmiri ozuzo dee ya. Ị na-agọzi ya ka ihe a kụrụ na ya na-epu.+ 11  I meela ka ihe ndị a kụrụ n’afọ mee nke ọma. Ihe ọma juru n’ụzọ i si agafe.+ 12  Ahịhịa ndụ juru n’ebe anụmanụ na-ata ahịhịa n’ala ịkpa,+Ahịhịa ndụ jukwara n’ugwu dị iche iche.+ 13  Ìgwè ewu na atụrụ juru n’ebe anụmanụ na-ata ahịhịa,Nri jukwara na ndagwurugwu dị iche iche.+ Ha na-eti mkpu ọṅụ. N’eziokwu, ha na-abụ abụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “anụ ahụ́.”
Na Hibru, “na-ekpuchi.”
Na Hibru, “O.”
Na Hibru, “ya.”
Na Hibru, “Ọ.”