Abụ Ọma 25:1-22

  • Ekpere Devid kpere ka Chineke duo ya ma gbaghara ya

    • “Kụziere m ụzọ gị” (4)

    • “Ndị ha na Jehova bụ ezigbo enyi” (14)

    • ‘Gbaghara m mmehie m niile’ (18)

Abụ Devid. א [Alef] 25  Jehova, ọ bụ gị ka m lekwasịrị anya. ב [Bet]   Chineke m, m tụkwasịrị gị obi.+ Ekwela ka ihere mee m.+ Ekwela ka ndị iro m ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m.+ ג [Gimel]   N’eziokwu, e nweghị onye nwere olileanya n’ebe ị nọ ihere ga-eme.+ Ma ihere ga-eme ndị na-aghọ ndị ọzọ aghụghọ n’enweghị ihe kpatara ya.+ ד [Dalet]   Jehova, biko, mee ka m mara ụzọ gị.+ Kụziere m ụzọ gị.+ ה [Hee]   Mee ka m na-eje ije n’ezigbo ụzọ gị, kụziekwara m ihe,+N’ihi na ị bụ Chineke m, onye na-azọpụta m. ו [Wọọ] Ọ bụ n’ebe ị nọ ka m nwere olileanya mgbe niile. ז [Zayin]   Jehova, biko, cheta na ị bụ Chineke na-eme ebere+Nakwa na ị hụrụ ndị gị n’anya* mgbe niile.+ ח [Het]   Biko, echetala mmehie ndị m mere mgbe m bụ okorobịa, echetakwala nnupụisi m. Jehova, cheta m n’ihi ịhụnanya gị,*+N’ihi na ị dị mma.+ ט [Tet]   Jehova dị mma, bụrụkwa onye ezi omume.+ Ọ bụ ya mere o ji akụziri ndị mmehie otú ha kwesịrị isi na-ebi ndụ.+ י [Yod]   Ọ ga-eduzi ndị dị umeala n’obi ka ha na-eme ihe dị mma,+Ọ ga-akụzikwara ndị dị umeala n’obi ụzọ ya.+ כ [Kaf] 10  Ihe niile Jehova na-emere ndị na-eso ntụziaka ya+ ma na-eme ihe e kwuru n’ọgbụgba ndụ ha na ya+Na-egosi na ọ hụrụ ha n’anya* nakwa na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. ל [Lamed] 11  Jehova, biko, n’ihi aha gị,+Gbaghara m mmehie m, n’agbanyeghị na ọ jọgburu onwe ya. מ [Mem] 12  Olee onye na-atụ egwu Jehova?+ Ọ ga-akụziri onye ahụ ihe ka ọ mara ihe o kwesịrị ime.+ נ [Nun] 13  Ihe ọma ga na-abịara ya,*+Ụmụ* ya ga-ebikwa n’ụwa.+ ס [Samek] 14  Ndị ha na Jehova bụ ezigbo enyi bụ ndị na-atụ egwu ya,+Ọ na-emekwa ka ha mata gbasara ọgbụgba ndụ ya.+ ע [Ayin] 15  Ọ bụ Jehova ka m na-ele anya mgbe niile ka o nyere m aka,+N’ihi na ọ ga-eme ka ụkwụ m pụta n’ọnyà.*+ פ [Pee] 16  Chee ihu n’ebe m nọ ma meere m amara,N’ihi na anọ m naanị m, e nweghịkwa onye na-enyere m aka. צ [Sadee] 17  Ihe na-enye m nsogbu n’obi adịla ọtụtụ.+ Napụta m n’ahụhụ m na-ata. ר [Resh] 18  Lee ahụhụ m na-ata na nsogbu m nọ na ya,+Gbagharakwa m mmehie m niile.+ 19  Legodị otú ndị iro m si dị ọtụtụNakwa otú ha si kpọọ m asị nke ukwuu. ש [Shin] 20  Chebe ndụ* m ma zọpụta m.+ Ekwela ka ihere mee m, n’ihi na m gbabala n’ime gị. ת [Tọọ] 21  Ka ezi omume m na-eme na aka m na-akwụwa ọtọ chebe m,+N’ihi na m nwere olileanya n’ebe ị nọ.+ 22  Chineke, biko, napụta Izrel n’ahụhụ niile ọ na-ata.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Na-egosi ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Na Hibru, “Mkpụrụ.”
Na Hibru, “n’ụgbụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”