Aịzaya 66:1-24

  • Ofufe nke dị Chineke mma na nke na-adịghị ya mma (1-6)

  • Zayọn na ụmụ ya (7-17)

  • A kpọkọtara ndị mmadụ na Jeruselem ka ha fee Chineke (18-24)

66  Jehova kwuru, sị: “Eluigwe bụ ocheeze m. Ụwa bụkwa ihe m ji gbakwasị ụkwụ m.+ Oleezi ụdị ụlọ unu ga-arụrụ m?+ Oleekwa ebe unu ga-arụrụ m ụlọ m ga-ebi?”+   Jehova kwukwara, sị: “Ọ bụ m ji aka m mee ihe a niile,Ha niile esi otú ahụ dịrị.+ Ma, ụdị onye m ga-achọ bụ onye dị umeala n’obiNa onye ihe na-ewute, ya ana-amakwa jijiji n’ihi* okwu m.+   Onye na-egbu oké ehi dị m ka onye na-egbu mmadụ.+ Onye ji atụrụ na-achụ àjà dị m ka onye na-agbaji nkịta olu.+ Onye na-enye onyinye dị m ka onye ji ọbara ézì achụ àjà.+ Onye na-eji frankinsens achụ àjà ka e nwee ihe a ga-eji ya na-echeta+ dị m ka onye ji okwu ndị na-eme anwansi* na-agọzi mmadụ.*+ Ha ahọrọla otú ha ga na-esi akpa àgwà. Ihe a na-asọ oyi na-amasịkwa ha.*   N’ihi ya, m ga-ahọrọ otú m ga-esi taa ha ahụhụ.+ M ga-emekwa ka ihe ha na-atụ ụjọ ya mee ha. N’ihi na mgbe m kpọrọ òkù, e nweghị onye zara. Mgbe m kwuru okwu, e nweghị onye gere ntị.+ Ha nọ na-eme ihe dị njọ n’anya m,Ha họkwaara ịna-eme ihe na-adịghị mụ mma.”+   Ndị na-ama jijiji n’ihi* okwu Jehova, nụrụnụ ihe o kwuru: “Ụmụnne unu, bụ́ ndị kpọrọ unu asị, ndị na-agụpụkwa unu n’ihi aha m, na-eme ihu abụọ, na-asị, ‘Ka otuto dịrị Jehova!’+ Ma, Chineke ga-apụta ma mee ka unu ṅụrịa ọṅụ. Ọ bụkwa hanwa ka ihere ga-eme.”+   E nwere mkpọtụ na-eme n’obodo, mkpọtụ nke na-eme n’ụlọ nsọ. Ọ bụ mkpọtụ nke na-eme mgbe Jehova na-ata ndị iro ya ahụhụ e kwesịrị ịta ha.   Tupu ime amalite ime Zayọn, ọ mụrụ nwa.+ Tupu ime emewe ya, ọ mụrụ nwa nwoke.   Ònye nụtụrụla ụdị ihe a? Ònye hụtụrụla ụdị ihe ndị a? À ga-amụ ala n’otu ụbọchị? Ka à ga-amụ mba n’otu mgbe? Ma, ozugbo ime mere Zayọn, ọ mụrụ ụmụ ya ndị nwoke.   Jehova kwuru, sị, “M̀ ga-eme ka akpa nwa meghee ma ghara ime ka a mụpụta nwa?” Chineke gị kwukwara, sị, “M̀ ga-eme ka e bido ịmụ nwa ma mechie akpa nwa?” 10  Ndị niile hụrụ Jeruselem n’anya,+ soronụ ya ṅụrịa ọṅụ, sorokwanụ ya na-enwe aṅụrị.+ Ndị niile na-eruru ya uju, soronụ ya na-enwe ezigbo obi ụtọ, 11  N’ihi na otú ahụ nwaanyị si enye nwa ya ara, nyejuo ya afọ, ka Jeruselem ga-esi lekọta unu. N’eziokwu, afọ ga-eju unu, obi ga-abụkwa unu sọ aṅụrị maka na e meela ka Jeruselem dị ebube. 12  N’ihi na Jehova kwuru, sị: “M ga-eme ka udo ga-adị na ya hie nne ka osimiri,+Jirikwa akụ̀ mba niile mee ka ọ dị ebube ka iyi toro eto.+ A ga-elekọta unu, kuru unu n’akụkụ. A ga-ekukwasịkwa unu n’ikpere, na-atụli unu elu, na-aghọrọ. 13  M ga na-akasi unu obiOtú nne si akasi nwa ya nwoke obi.+ M ga-akasikwa unu obi n’ihi Jeruselem.+ 14  Unu ga-ahụ ihe a, obi ga-atọkwa unu ụtọ. Ọkpụkpụ unu ga-agbasi ike, dị mma n’anya ka ahịhịa na-epulite ọhụrụ. A ga-emekwa ka ndị ohu Jehova hụ otú aka ya si akpa ike. Chineke ga-amakwa ndị iro ya ikpe.”+ 15  “Jehova ga-abịa ka ọkụ.+ Ụgbọ ịnyịnya ya yiri ifufe mmiri.+ Ọ ga-eji iwe bịa kwụọ ha ụgwọ ihe ha mere. Ọ ga-eji ire ọkụ baara ha mba.+ 16  N’ihi na Jehova ga-eji ọkụ kpee ikpe. Ọ ga-ejikwa mma agha ya kpee mmadụ* niile ikpe. Jehova ga-egbukwa ọtụtụ ndị. 17  “Ndị na-edo onwe ha nsọ, ndị na-asachakwa onwe ha iji banye n’ubi*+ ndị dị n’azụ ubi nke dị n’etiti, ndị na-eri anụ ézì+ na ihe ndị a na-asọ oyi nakwa òké,+ ha niile ga-ala n’iyi.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 18  “Ebe ọ bụ na m ma ọrụ ha na ihe ha na-eche n’echiche, m na-abịa ịkpọkọta mba niile na ndị niile na-asụ asụsụ dị iche iche. Ha ga-abịakwa hụ ebube m.” 19  “M ga-edowere ha ihe àmà. M ga-ezikwa ụfọdụ n’ime ndị na-enweghị ihe mere ha ka ha gaa mba dị iche iche, ebe e nwere ndị bụ́ ọkà n’ịgba ụta, ya bụ, ndị Tashish,+ ndị Pul, na ndị Lọd.+ M ga-ezikwa ha ka ha gakwuru ndị Tubal na ndị Jevan,+ nakwa ndị bi n’agwaetiti ndị dị anya, ndị na-anụbeghị akụkọ gbasara m, ndị na-ahụbeghịkwa ebube m. Ha ga-akọkwara mba niile akụkọ ebube m.+ 20  Ha ga-esi ná mba niile jiri ịnyịnya, ụgbọ ịnyịnya, ụgbọala ndị e mechiri elu ha emechi, jakị, na kamel ndị na-awụ ọsọ bute ụmụnne unu niile+ n’ugwu nsọ m, bụ́ Jeruselem, ka ha bụrụ onyinye a ga-enye Jehova, otú ahụ ndị Izrel na-eji arịa dị ọcha ebubata onyinye n’ụlọ Jehova.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 21  Jehova kwukwara, sị, “M ga-akpọrọkwa ụfọdụ n’ime ha ka ha bụrụ ndị nchụàjà na ndị Livaị.” 22  Jehova kwuru, sị, “Dị ka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ+ m na-eke ga-adịgide n’ihu m, otú ahụ ka ụmụ* unu na aha unu ga-adịgidekwa.”+ 23  Jehova kwukwara, sị, “Malite n’ọnwa ọhụrụ ruo n’ọnwa ọhụrụ, malitekwa n’ụbọchị izu ike ruo n’ụbọchị izu ike,Mmadụ* niile ga na-abịa ka ha kpọọ isiala n’ihu m.”*+ 24  “Ha ga-agakwa na-ele ozu nke ndị ahụ nọ na-enupụrụ m isi. N’ihi na ikpuru gbara ha agaghị anwụ anwụ,Ọkụ na-ere ha agaghịkwa anyụ anyụ.+ Ha ga na-asọkwa mmadụ* niile oyi.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ya ana-echekwa gbasara.”
Ma ọ bụ “majik.”
O nwere ike ịbụ, “dị m ka onye na-eto arụsị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
Ma ọ bụ “Ndị na-eche gbasara.”
Na Hibru, “anụ ahụ́.”
Ya bụ, ubi ndị pụrụ iche a na-anọ ekpere arụsị.
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “Anụ ahụ́.”
Ma ọ bụ “ka ha fee m.”
Na Hibru, “anụ ahụ́.”