Aịzaya 64:1-12

  • Ekpere ọzọ ndị chegharịrị echegharị kpere (1-12)

    • Ọ bụ Jehova kpụrụ anyị (8)

64  A sị nnọọ na ị dọwara eluigwe gbadata,Ka ugwu niile wee maa jijiji n’ihi gị,   Dị ka mgbe ọkụ na-ere irighiri nkụ,Ọkụ ahụ emeekwa ka mmiri na-agbọ,Ọ gaara eme ka ndị iro gị mara aha gị,Mba niile amaakwa jijiji n’ihi gị.   Mgbe i mere ihe ndị dị egwu anyị na-atụghị anya ha,+Ị gbadatara, ugwu niile amaakwa jijiji n’ihi gị.+   Kemgbe oge ochie, e nwetụbeghị onye nụrụ gbasara Chineke ọzọ. E nwetụbeghịkwa onye gere chi ọzọ ntị. E nwetụbeghịkwa onye hụrụ Chineke ọzọ. Ọ bụ naanị gị na-enyere ndị na-atụ anya* gị aka.+   Ị bịakwutela ndị ji ọṅụ na-eme ihe dị mma,+Ndị na-echeta gị, na-esokwa ụzọ gị. Iwe were gị maka na anyị nọ na-emehie.+ O teekwala anyị nọ na-emehie gị. È kwesịrị ịzọpụta anyị?   Anyị niile dịzi ka onye na-adịghị ọcha. Ezi omume anyị niile dịkwa ka uwe nwaanyị nọ ná nsọ ya yi.+ Anyị niile ga-akpọnwụ ka mkpá akwụkwọ. Mmehie anyị ga-ebufukwa anyị otú ifufe si ebufu ihe.   E nweghị onye na-akpọku aha gị,E nweghịkwa onye obi ya na-agwa ka o jidesie gị aka ike,N’ihi na i zoola ihu gị ka anyị ghara ịhụ ya.+ I meekwala ka mmehie anyị laa anyị n’iyi.*   Ma Jehova, ị bụ Nna anyị.+ Anyị bụ ụrọ. Ọ bụkwa gị kpụrụ anyị.+ Anyị niile bụ ọrụ aka gị.   Jehova, biko, ewefela iwe ókè.+ Echetakwala mmehie anyị ruo mgbe ebighị ebi. Biko, leenụ anyị. Anyị niile bụ ndị gị. 10  Obodo nsọ gị niile aghọọla ala ịkpa. Zayọn aghọọla ala ịkpa. Jeruselem aghọọkwala ala na-abaghị uru.+ 11  A gbaala ụlọ nsọ anyịDị ebube* ọkụ.+ Ọ bụ ebe nna nna anyị hà nọ too gị. A laala ihe niile anyị ji eme ọnụ n’iyi. 12  Jehova, biko, ị̀ ka ga-ajụ inyere anyị aka mgbe ihe ndị a na-eme? Ị̀ ga-agba nkịtị kwe ka a na-echi anyị ọnụ n’ala?+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ndị nwere ndidi ma chere.”
Na Hibru, “gbazee anyị.”
Ma ọ bụ “Mara mma.”