Aịzaya 63:1-19
63 Ònye bụ onye a si Ịdọm na-abịa,+Onye si Bọzra+ yiri uwe tụrụ àgwà* nke na-egbuke egbuke na-abịa,Onye yikwa uwe dị ebube,Jiri ike ya dị ukwuu zọrọ ije na-abịa?
“Ọ bụ m, bụ́ onye* na-ekwu ihe ziri ezi,Onye nwere ike dị ukwuu ọ ga-eji zọpụta ndị mmadụ.”
2 Gịnị mere ákwà gị ji na-acha uhie uhie?*
Gịnịkwa mere uwe gị ji dị ka nke onye na-azọcha mkpụrụ vaịn n’ebe a na-azọchapụta mmanya?+
3 “Naanị m zọchara mkpụrụ vaịn dị n’ebe a na-azọchapụta mmanya.
E nweghị onye ọ bụla so m.
Eji m iwe na-azọcha ndị iro m,Ejikwa m ezigbo iwe na-azọpịa ha.+
Ọbara ha nọ na-agbasa m n’uwe,Metọchaakwa uwe m niile.
4 Ụbọchị m ga-abọrọ ndị m ọbọ dị m n’obi,+Afọ m ga-agbapụta ndị m eruokwala.
5 Anọ m na-ele anya, ma e nweghị onye na-enyere m aka.
O wutere m na o nweghị onye chọrọ ịkwado m.
Ọ bụzi aka m ka m ji zọpụta ha.*+
Ezigbo iwe ji m bụ ihe nyeere m aka.
6 M ji iwe na-azọda mba dị iche iche n’ala.
M mere ka ezigbo iwe ji m na-egbu ha ka mmanya,+Meekwa ka ọbara ha na-awụsa n’ala.”
7 M ga-ekwu ihe niile Jehova mere nke na-egosi na ọ hụrụ ndị ya n’anya.
M ga-ekwu ihe niile Jehova mere nke e kwesịrị iji na-eto ya.
M ga-ekwu ihe niile Jehova meere anyị,+Ya bụ, ọtụtụ ihe ọma o meere ndị Izrel.
O mere ihe ndị a maka na ọ na-eme ebere, hụkwa ndị ya n’anya nke ukwuu.
8 O kwuru, sị: “N’eziokwu, ha bụ ndị m na ụmụ na-agaghị enupụrụ m isi.”+
Ọ bụ ya mere o ji bụrụ Onye Nzọpụta ha.+
9 N’oge niile ha nọ na-ata ahụhụ, ọ nọ na-ewute ya.+
Onye ozi ya* zọpụtara ha.+
Ọ gbapụtara ha maka na ọ hụrụ ha n’anya, na-emetekwara ha ebere.+
N’oge ahụ niile, o buliri ha elu, lekọtakwa ha ụbọchị niile.+
10 Ma, ha nupụụrụ ya isi,+ meekwa ihe wutere mmụọ nsọ ya.+
Ọ ghọziri onye iro ha,+Lụsokwa ha ọgụ.+
11 Ha malitere icheta oge gara aga,Oge Mosis ohu ya dị ndụ. Ha sịrị:
“Olee ebe Onye ahụ si n’oké osimiri kpọpụta ha+ na ndị na-azụ atụrụ ya nọ?+
Olee ebe Onye ahụ nyere Mosis* mmụọ nsọ ya nọ?+
12 Ọ bụ Onye ahụ ji ike ya dị ebube* nyere Mosis aka.+
Ọ bụ ya kewara mmiri n’ihu ha+Iji mee ka a na-echeta aha ya ruo mgbe ebighị ebi.+
13 Ọ bụkwa ya mere ka ha were ụkwụ gafee mmiri na-ekwo ekwo.*
Ha gafere n’adaghị ada,Dị ka ịnyịnya nke na-aga n’ọzara.*
14 Mmụọ Jehova mere ka ha zuru ike+Otú anụmanụ si agbada na ndagwurugwu gaa zuru ike.”
Otú a ka i si duru ndị gịIji mee ka aha gị na-ede ude.*+
15 Si n’eluigwe lee anya.
Si n’ebe i bi, bụ́ ebe dị nsọ, nke dị ebube,* hụrụ.
Olee ihe mere na ị naghịzi atụpụrụ anyị ọnụ, ị naghịkwa enyere anyị aka?
Olee ihe mere na ihe gbasara anyị anaghịzi emetụ gị n’obi,+ ị naghịkwa emere anyị ebere?+
E nweghịzi nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ị na-emere anyị.
16 Ị bụ Nna anyị.+
Ọ bụrụgodị na Ebreham amaghị anyị,Ọ bụrụkwa na Izrel amaghị anyị,Gịnwa, bụ́ Jehova, bụ Nna anyị.
Ị bụ Onye Mgbapụta anyị kemgbe ụwa.+
17 Jehova, gịnị mere i ji kwe* ka anyị si n’ụzọ gị kpafuo?
Gịnị mere i ji kwe* ka obi anyị kpọọ nkụ, nke na anyị anaghịzi atụ egwu gị?+
Jiri maka ndị ohu gị,Bụ́ ndị nke gị,+ meere anyị amara ọzọ.
18 Ndị gị dị nsọ bitụrụ n’ala a.
Ma, ndị iro anyị azọdala ụlọ nsọ gị.+
19 O teela anyị dị ka ndị ị na-achịtụbeghị.
O teekwala anyị dị ka ndị na-azatụbeghị aha gị.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ O nwere ike ịbụ, “uwe na-acha ọbara ọbara.”
^ Ya bụ, Chineke.
^ Ma ọ bụ “ọbara ọbara.”
^ Ma ọ bụ “m ji merie.”
^ Ma ọ bụ “Mmụọ ozi nọ n’ihu ya.”
^ Na Hibru, “ya.”
^ Ma ọ bụ “aka ya mara mma.”
^ Ma ọ bụ “mmiri miri emi.”
^ Ma ọ bụ “n’ala ịkpa.”
^ Ma ọ bụ “meere onwe gị aha mara mma.”
^ Ma ọ bụ “nke mara mma.”
^ Ma ọ bụ “mee.”
^ Na Hibru, “mee.”