Aịzaya 6:1-13
6 N’afọ Eze Ọzaya nwụrụ,+ ahụrụ m ka Jehova nọ n’ocheeze dị elu.+ Uwe mwụda o yi sachikwara ebe niile n’ụlọ nsọ ya.
2 Ndị seraf guzo gburugburu ya. Seraf nke ọ bụla nwere nku isii. Nke ọ bụla na-eji nku abụọ ekpuchi ihu ya, na-eji abụọ ekpuchi ụkwụ ya, na-ejikwa abụọ efegharị.
3 Ha jikwa olu dara ụda na-agwa ibe ha, sị:
“Nsọ, nsọ, nsọ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha dị.+
Ụwa niile na-egosi ebube ya.”
4 Mkpu a ha na-eti* mere ka ibo ụzọ ụlọ ha nọ malite ịma jijiji, anwụrụ ọkụ ejukwa n’ụlọ ahụ.+
5 M kwuziri, sị: “Efuola m!
Onye nwụrụ anwụ ka m bụzi,*N’ihi na anya m ahụla Eze bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha.
Okwu na-esi m n’ọnụ apụta adịghị ọcha.
Ọ bụkwa ndị okwu na-adịghị ọcha na-esi n’ọnụ apụta ka mụ na ha bi.”+
6 Otu n’ime ndị seraf wee fere bịa ebe m nọ. O jikwa icheku ọkụ+ nke o ji ihe yiri mkpà gụta n’ebe ịchụàjà.+
7 O metụkwara m ya n’ọnụ, sị:
“Emetụla m icheku ọkụ a n’egbugbere ọnụ gị.
E hichapụla mmehie gị.
Chineke agbagharala gị mmehie gị.”
8 M nụziri olu Jehova ka ọ na-asị: “Ònye ka m ga-eziga? Ònyekwa ga-agara anyị?”+ Mụ asị: “Lee m, ziga m.”+
9 Ya asị: “Gaa gwa ndị a, sị:
‘Unu ga-anụ ihe ugboro ugboro,Ma unu agaghị aghọta ya.
Unu ga-ahụkwa ihe ugboro ugboro,Ma unu agaghị amata ihe ọ bụla.’+
10 Mee ka obi ndị a ghara ịnabata ihe,+Ka obi ha gharakwa ịghọta ihe.+
Mee ka ntị ha kpọchie,Ka ha gharakwa iji ntị ha nụ ihe.
Mechiekwa anya ha,Ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ,Ka ha gharakwa ịgbanwe, a gwọọ ha.”+
11 Mụ asị: “Jehova, ruo ole mgbe?” Ya asị:
“Ruo mgbe obodo niile bụzi ebe e bibiri ebibi n’enweghị onye bi na ha,Ruo mgbe ụlọ niile na-enweghị mmadụ nọ na ha,Ruo mgbe e bibiri ala a, mee ka ọ tọgbọrọ nkịtị,+
12 Ruokwa mgbe Jehova kpọgara ndị mmadụ n’ebe dị anya,+Ọtụtụ ebe n’ala a atọgbọrọkwa nkịtị.
13 Ma, e kee ndị Izrel ụzọ iri, otu ụzọ ka ga-anọ n’ala ha, ma, a ga-agba otu ụzọ a ọkụ ọzọ. Ndị Izrel dị ka nnukwu osisi, dịkwa ka osisi ook úkwù ha na-afọdụ ma e gbutuo ha. Ome* dị nsọ ga-epulite n’úkwù ha.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Ụda olu onye na-akpọ òkù.”
^ Na Hibru, “E meela ka m dere duu.”
^ Na Hibru, “Mkpụrụ.”