Aịzaya 53:1-12

  • Ohu Jehova tara ahụhụ, nwụọ, e liekwa ya (1-12)

    • E ledara ohu Jehova anya, e jighịkwa ya kpọrọ ihe (3)

    • O buuru ọrịa anyị na ihe na-egbu anyị mgbu (4)

    • “A kpụụrụ ya ka atụrụ a gaje igbu egbu” (7)

    • O buuru mmehie ọtụtụ ndị (12)

53  Ònye nwere okwukwe n’ihe a nụrụ n’ọnụ anyị?*+ Ònyekwa ka Jehova mere ka ọ mara ike* ya?+   Ọ ga-epulite dị ka ome+ n’ihu ya.* Ọ ga-adịkwa ka mgbọrọgwụ nke dị n’ala mmiri na-adịghị. Ọ dịghị ka onye ukwu. Ọ dịghịkwa ebube.+ Mgbe anyị ga-ahụ ya, anyị agaghị ahụ mma pụrụ iche ọ mara nke ga-eme ka anyị bịawa ya nso.   Ndị mmadụ ledara ya anya, zerekwa ya.+ Ọ ma gbasara ihe mgbu, marakwa ihe ọrịa bụ. Ọ dị ka à ga-asị na e zoro ihu ya ezo ka anyị ghara ịhụ ya.* E ledara ya anya. Anyị ejighịkwa ya kpọrọ ihe.+   N’eziokwu, o buuru ọrịa anyị niile,+Burukwa ihe na-egbu anyị mgbu.+ Ma anyị weere ya ka onye Chineke tara ahụhụ, onye o mesiri ike, na onye o mekpara ahụ́.   A mara ya ube+ n’ihi mmehie anyị.+ E chiri ya ọnụ n’ala n’ihi ihe anyị mejọrọ.+ Ahụhụ a tara ya mere ka anyị nwee udo.+ Ahụ́ e merụrụ ya mekwara ka a gwọọ anyị.+   Anyị niile akpafuola ka atụrụ.+ Onye ọ bụla n’ime anyị gawara n’ụzọ nke ya. Ma, Jehova emeela ka onye ahụ buru mmehie anyị niile.+   E mesiri onye ahụ ike.+ O kwere ka e mekpaa ya ahụ́.+ O kwughịkwa ihe ọ bụla. A kpụụrụ ya ka atụrụ a gaje igbu egbu.+ Ọ dị ka nne atụrụ gbara nkịtị ka a na-akpacha ya ajị. O kwughịkwa ihe ọ bụla.+   A kpụụrụ ya pụọ mgbe e kpechara ya ikpe mkpegbu. Ònyekwa ga-echegbu onwe ya banyere ihe niile gbasara ezinụlọ o si?* N’ihi na e gburu ya ya agharazie iso ná ndị dị ndụ.+ E tiri ya ihe* n’ihi na ndị m mere ihe ọjọọ.+   N’agbanyeghị na o meghị ihe ọjọọ ọ bụla,*Nakwa na o kwughị ihe ga-eduhie onye ọ bụla,+Mgbe ọ nwụrụ, ebe e kenyere ya a ga-eli ya dị ebe nke ndị ajọ omume dị.+ E likwara ya ebe e liri ndị ọgaranya.*+ 10  Ma, ọ bụ uche* Jehova ka a taa ya ezigbo ahụhụ. O kwekwara ka ọ rịa ọrịa. Ọ bụrụ na ị ga-eme ka e jiri ndụ* ya chụọ àjà ikpe ọmụma,+Ọ ga-ahụ ụmụ* ya. Ọ ga-adịtekwa ndụ aka.+ A ga-esi n’aka ya mee ka uche* Jehova mezuo.+ 11  N’ihi ahụhụ niile ọ* tara, ọ ga-ahụ uru ihe o mere bara. Ọ ga-ejukwa ya afọ. Ohu m,+ bụ́ onye ezi omume, ga-eji ihe ọ maMee ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị ezi omume.+ Ọ ga-eburukwa mmehie ha.+ 12  N’ihi ya, m ga-ekenye ya na ọtụtụ ndị òkè. Ya na ndị dike ga-ekekwa ihe a kwatara n’agha,N’ihi na o kwere ka e gbuo* ya.+ A gụnyekwara ya ná ndị na-emebi iwu.+ O buuru mmehie ọtụtụ ndị,+Gbachitekwara ndị na-emebi iwu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “n’ihe anyị nụrụ?”
Na Hibru, “aka.”
“Ya” nwere ike ịbụ onye nọ mgbe ihe a na-eme. “Ya” nwekwara ike ịbụ Chineke.
O nwere ike ịbụ, “O yiri onye ndị mmadụ na-anaghị ekwe ele anya n’ihu.”
Ma ọ bụ “gbasara ndụ onye ahụ?”
Ma ọ bụ “E tigburu ya.”
Ma ọ bụ “o nweghị onye o tiri ihe.”
Na Hibru, “onye ọgaranya.”
Ma ọ bụ “Ma, ọ masịrị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “ihe masịrị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Na Hibru, “ọ wụpụụrụ ọnwụ mkpụrụ obi.”