Aịzaya 50:1-11

  • Mmehie ndị Izrel mere kpatara nsogbu (1-3)

  • Ohu Jehova nke na-erube isi (4-11)

    • Ire na ntị ndị a na-akụziri ihe (4)

50  Jehova kwuru, sị: “Ènyere m nne unu akwụkwọ m ji gbaa ya alụkwaghịm+ mgbe m chụpụrụ ya? Ka m̀ kpọọrọ unu resị onye m ji ụgwọ? Ọ bụ mmehie unu+ mere e ji ree unu. Ọ bụkwa ajọ omume unu mere e ji chụpụ nne unu.+   Gịnịzi mere na o nweghị onye nọ ebe a mgbe m batara? Gịnị mere na o nweghị onye zara mgbe m kpọrọ òkù?+ Ịgbapụta unu ọ̀ nyịrị m?* Ka ọ̀ bụ na mụ adịghị ike ịnapụta unu?+ M na-aba mba, oké osimiri ataa.+ M na-eme ka osimiri ghọọ ọzara.+ Azụ̀ dị na ha na-esi ísì n’ihi na mmiri adịghị. Ha na-anwụkwa maka na ha ahụghị mmiri ha ga-aṅụ.   M na-eyiwe eluigwe ọchịchịrị dị ka uwe.+ M na-ejikwa ákwà ojii ekpuchi ya.”   Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova akụzierela m*+Otú m ga-esi gwa onye ike gwụrụ okwu dị mma.*+ Ọ na-akpọte m kwa ụtụtụ. Ọ na-emeghe* ntị m ka m nwee ike ige ntị ka onye a na-akụziri ihe.+   Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova emegheela ntị m. Enupụghịkwa m isi.+ Emeghị m ihe masịrị m.+   M cheere ndị na-eti m ihe azụ m,Cheekwara ndị na-efopụ ajị ntì m. Ewepụghị m ihu m ka a ghara ịkparị m na ịgbụ m asọ mmiri.+   Ma, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-enyere m aka.+ N’ihi ya, ihere agaghị eme m. Ekpebiela m ịkwụrụ chịm.*+ Amakwa m na ihere agaghị eme m.   Onye gụrụ m n’onye ezi omume nọ nso. Ònye ga-eboli m ebubo?*+ Ya bịa ka mụ na ya guzoro ka e leba okwu anyị anya.* Ònye ga-asị na o nwere ihe m mere ya? Ya bịaruo m nso.   Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-enyere m aka. Ònye ga-asị na m mere ihe ọjọọ? Ha niile ga-aka nká ka uwe. Egu* ga-erichapụ ha. 10  Ònye n’ime unu na-atụ egwu JehovaMa na-ege ohu ya ntị?+ Ònye jerela ije n’ọchịchịrị n’ahụghị ìhè ọ bụla? Ka aha Jehova mee ka obi sie ya ike. Ya rịọkwa Chineke ka o nyere ya aka. 11  Ọ sịkwara: “Unu niile ndị na-amụnye ọkụ,Ndị na-abọlite ikerike ọkụ,Jirinụ ìhè ọkụ unu mụnyereNa ìhè ikerike ọkụ unu bọlitere na-eje ebe unu na-eje. Ahụhụ m ga-ata unu bụ: Unu ga-atọgbọrọ n’ala n’ihi ezigbote ihe mgbu.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Aka m ọ̀ dị mkpụmkpụ nke na ọ gaghị agbapụtali unu?”
Na Hibru, “enyela m ire nke ndị a kụziiri ihe, ka m wee mara.”
O nwere ike ịbụ, “okwu ga-agba ya ume.”
Na Hibru, “na-akpọte.”
Na Hibru, “Emeela m ka ihu m sie ike ka nkume siri ike.”
Ma ọ bụ “ga-alụso m ọgụ.”
Ma ọ bụ “ka mụ na ya nọrọ ihu na ihu.”
N’Izrel, ụdị egu a na-atakasị ákwà. Ọ na-emecha nwee nku anọ, yizie urukurubụba.