Aịzaya 5:1-30
5 Biko, ka m bụọrọ onye m hụrụ n’anya abụ.
Ọ bụ abụ banyere onye m hụrụ n’anya na ubi vaịn ya.+
Onye m hụrụ n’anya nwere ubi vaịn n’akụkụ ugwu na-eme nri.
2 Ọ kọrọ ala, wepụchaakwa nkume dị na ya.
Ọ kụrụ ezigbo mkpụrụ vaịn uhie n’ala ahụ,Rụọ ụlọ nche n’etiti ya,Gwuokwa ebe a na-azọchapụta mmanya na ya.+
Ọ tụwaziri anya ka ọ mịa ezi mkpụrụ vaịn,Ma ọ mịrị naanị mkpụrụ vaịn ọhịa.+
3 “Ugbu a, ndị bi na Jeruselem na ndị Juda,Biko, kpeerenụ mụ na ubi vaịn m ikpe.+
4 Olee ihe m kwesịrị ime n’ubi vaịn mNke m na-emebeghị?+
Gịnị mere m ji na-atụ anya ka ọ mịa ezigbo mkpụrụ vaịn,Ya amịa mkpụrụ vaịn ọhịa?
5 Ugbu a, biko ka m gwa unuIhe m ga-eme ubi vaịn m:
M ga-efopụsị osisi ndị m ji gbaa ya ogige,Gbaakwa ha ọkụ.+
M ga-akwatu mgbidi ya m ji nkume rụọ.
A ga-azọkwa ya ụkwụ.
6 M ga-eme ka ọ dị ka ala na-abaghị uru.+
A gaghị akwacha alaka vaịn ya akwacha. A gaghịkwa abọ ubi ahụ ahịhịa.
Ogwu na ahịhịa ga-epuchi na ya.+
M ga-agwakwa ígwé ojii ka ọ ghara ikwe ka mmiri zoo na ya.+
7 N’ihi na ndị Izrel bụ ubi vaịn Jehova nke ụsụụ ndị agha.+
Ndị Juda bụkwa ubi na-eme ya obi ụtọ.
Ọ nọ na-atụ anya ka ndị mmadụ na-ekpe ikpe ziri ezi,+Ma, ha nọ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi.
Ọ nọkwa na-atụ anya ka ndị mmadụ na-eme ezi omume,Ma, ọ nọ na-anụ ákwá ndị a na-echi ọnụ n’ala.”+
8 Unu ga-ata ahụhụ, unu ndị na-enwetakwu ụlọ gbakwụnye na nke unu nwere enwe+Nakwa unu ndị na-enwetakwu ubi gbakwụnye na nke unu nwere enwe.+
Unu na-enwetagide ihe ndị a ruo mgbe a na-enweghị onye ọzọ nwerenụ,Naanị unu ebirizie n’obodo.
9 M nụrụ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha ṅụrụ iyiNa n’agbanyeghị na ọtụtụ ụlọ buru ibu, maakwa mma,A ga-ala ha n’iyi.
E nweghịkwa onye ga-ebi na ha.+
10 Nnukwu ubi vaịn dị eka iri ga-emepụta naanị ihe ga-eju otu bat.*
Mkpụrụ juru otu homa* ga-amịta naanị otu efa.*+
11 Ndị na-ebili n’isi ụtụtụ ka ha ṅụọ mmanya na-egbu egbu ga-ata ahụhụ.+
Ha na-aṅụgide mmanya chi ejie, mmanya ana-egbukwa ha.
12 Mgbe ọ bụla ha na-eme oriri,Une, ụbọ akwara, ịgbà, ọjà, na mmanya na-adị na ya.
Ma, ha anaghị echebara ihe Jehova na-eme echiche.
Ha anaghịkwa ahụ ihe o ji aka ya rụọ.
13 N’ihi ya, a ga-adọrọ ndị m n’aghaMaka na ha amaghị m.+
Agụụ ga-agụgbu ndị ha na-akwanyere ùgwù.+
Akpịrị ga-akpọkwa ndị nkịtị nkụ.
14 N’ihi ya, ili* asaala mbara n’onwe ya.
O megheekwala ọnụ ya ka ọ ghara inwe nsọtụ.+
Ndị a ma ama n’obodo a na ìgwè ndị na-eme mkpọtụ na ya, nakwa ndị nọ na ya na-eme mkpọtụ mgbe ha na-eri oriri,Ga-abanyecha n’ime ya.
15 A ga-eweda mmadụ ala.
A ga-emenye mmadụ ihere.
A ga-ewedakwa ndị dị mpako ala.
16 Ikpe ziri ezi Jehova nke ụsụụ ndị agha na-ekpe ga-eme ka e too ya.
Ezi Chineke, bụ́ Onye Nsọ,+ ga-eji ezi omume ọ na-eme gosi na ọ dị nsọ.+
17 Ụmụ atụrụ ga-atakwa ahịhịa ebe ahụ ka à ga-asị na ọ bụ ebe anụmanụ na-ata ahịhịa.
Ndị mbịarambịa ga-eri ihe n’ebe dị iche iche tọgbọ chakoo anụ ndị ahụ́ dị mma na-anọbu.
18 Ndị na-aghọ aghụghọ ga-ata ahụhụ.
E kegidere ihe ọjọọ ha na-eme na mmehie ha na-eme n’ahụ́ ha. Ha dị ka anụmanụ nke na-adọkpụgharị ụgbọala e kegidere n’ahụ́ ya.
19 E nwere ndị na-asị: “Ya rụọ ọrụ ya ngwa ngwa.
Ya bịa ọsọ ọsọ, ka anyị hụ ya.
Ka ihe Onye Nsọ Izrel zubere* mee,Ka anyị mara na o meela.”+
20 Ndị na-asị na ihe ọma bụ ihe ọjọọ nakwa na ihe ọjọọ bụ ihe ọma ga-ata ahụhụ,+Ha na ndị na-eji ọchịchịrị mere ìhè, jiri ìhè mere ọchịchịrị,Nakwa ndị na-ewere ihe na-elu ilu ka ihe na-atọ ụtọ, werekwa ihe na-atọ ụtọ ka ihe na-elu ilu.
21 Ndị ma ihe n’anya onwe haNa ndị nwere uche n’anya onwe ha ga-ata ahụhụ.+
22 Ndị e ji ịṅụ mmanya maraNakwa ndị bụ́ aka ochie n’ịgwa mmanya na-egbu egbu ga-ata ahụhụ.+
23 Ndị ọ na-abụ, ha nara aka azụ, ha asị na aka onye ajọ omume dị ọcha+Nakwa ndị na-ekpe onye ezi omume ikpe arụrụala ga-ata ahụhụ.+
24 N’ihi ya, a ga-ala ha n’iyi otú ahụ ọkụ si erepịa ahịhịa ọka,Otú ahụ ọkụ sikwa erepịa ahịhịa kpọrọ nkụ.
Mgbọrọgwụ ha ga-erekasịkwa.
Ifuru ha ga-efesasị ka ntụ,N’ihi na ha jụrụ iwu* Jehova nke ụsụụ ndị agha.
Ha ledakwara okwu Onye Nsọ Izrel anya.+
25 Ọ bụ ya mere Jehova ji ewere ndị ya ezigbo iwe.
Ọ ga-ewelitekwa aka ya taa ha ahụhụ.+
Ugwu dị iche iche ga-ama jijiji.
Ozu ha ga-adị ka ihe e kpofuru ekpofu n’okporo ámá dị iche iche.+
N’ihi isi ha na-enupụ, iwe ya adajụbeghị.
Kama, ọ ka welitere aka ka ọ taa ha ahụhụ.
26 O dowela ihe mba dị ebe dị anya ga-ahụ gbakọọ.+
Ọ fụọlara ha opi ka ha si n’ebe ụwa sọtụrụ bịa.+
Ha jikwa oké ọsọ na-abịa.+
27 O nweghị onye n’ime ha ike gwụrụ ma ọ bụ onye na-ada ada.
O nweghị onye na-ero ụra ma ọ bụ onye na-ehi ụra.
Ájị̀ ha kere n’úkwù atọpụghị.
Eriri akpụkpọ ụkwụ ha adọbighịkwa.
28 A pịrị akụ́ ha niile apị,Kweekwa ụta ha niile ekwe.*
Ụkwụ ịnyịnya ha dị ka nkume siri ike.
Ụkwụ ụgbọala ha na-efekwa ọsọ ka oké ifufe.+
29 Otú ha si agbọ ụja yiri nke ọdụm.
Ha na-agbọkwa ụja ka nwa ọdụm.+
Ha baa mba, ha anwụde anụ ha ga-eri,Buru ya pụọ. E nweghịkwa onye ga-anapụta ha ya.
30 Ha ga na-aba mba n’ụbọchị ha nwụdere anụ ahụ,Mba ha ga-adị ka ebe oké osimiri na-eme mkpọtụ.+
Onye ọ bụla lere ala a anya ga-ahụ na e nwere ọchịchịrị na nsogbu.
Ìhè ga-aghọdị ọchịchịrị n’ihi ígwé ojii.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “kpebiri.”
^ Ma ọ bụ “ntụziaka.”
^ Ma ọ bụ “Ha dịkwa njikere ịgba ụta ha.”