Aịzaya 47:1-15
47 Ndị bi na Babịlọn,*+Gbadatanụ nọdụ ala n’ájá.
Ndị Kaldia,*Nọdụnụ n’ala nkịtị n’ebe ocheeze na-adịghị,+N’ihi na ndị mmadụ agaghịzi na-asị na unu agbasighị ike ma ọ bụ na a zụtọrọ unu azụtọ.
2 Were nkume e ji egwe nri gwee ọka ka ọ bụrụ ntụ ọka.
Kpupụ ákwà i ji kpuchie ihu gị.
Chịlie uwe gị elu. Kpughee ụkwụ gị.
Gafee osimiri.
3 A ga-agba gị ọtọ.
A ga-ahụ ka ị gba ọtọ.
M ga-akwụ gị ụgwọ ihe i mere.+ O nweghịkwa mmadụ ọ bụla ga-egbochili m ime ya.*
4 “Onye na-agbapụta anyịBụ Onye Nsọ Izrel.
Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha ya.”+
5 Ndị Kaldia,*+Nọdụnụ ala gbachi nkịtị, banyekwanụ n’ebe gbara ọchịchịrị.
Ndị mmadụ agaghịzi na-akpọ unu Eze Nwaanyị na-achị Alaeze dị iche iche.+
6 M wesara ndị m iwe.+
M gbara nkịtị ka i merụọ ndị m.+
M nyefere ha n’aka gị,+Ma i mereghị ha ebere.+
I bodịrị ndị agadi ibu na-anyị ezigbo arọ.+
7 Ị sịrị: “M ga-abụgịde Eze Nwaanyị ruo mgbe ebighị ebi.”+
I cheghị gbasara ihe ị nọ na-eme.
I chebaraghị ihe ga-emecha mee echiche.
8 Onye mkpa ya bụ ịtụrụ ndụ, nụrụ ihe a.+
Obi ruru gị ala ebe ị nọ ọdụ. Ị na-asịkwa n’obi gị:
“Abụ m onye ukwu. E nweghị onye ka m.+
Agaghị m abụ nwaanyị isi mkpe.
O nweghị ihe ga-eme ka m gbara aka ụmụ.”+
9 Ma ihe abụọ a ga-eme gị na mberede n’otu ụbọchị:+
Ị ga-agbara aka ụmụ, di gị anwụọkwa.
Ihe ndị a ga-eme gị+N’ihi* ọtụtụ afa ị na-agba nakwa n’ihi ajọ ọgwụ niile ị na-agwọ.+
10 Ị nọ na-eme ihe ọjọọ, ma chee na o nweghị ihe ga-eme gị.
Ị sịrị: “E nweghị onye na-ahụ m.”
Ọ bụ amamihe gị na ihe ị ma dufuru gị.
Ị nọkwa na-asị n’obi gị: “Abụ m onye ukwu. E nweghị onye ka m.”
11 Ma, ọdachi ga-adakwasị gị,E nweghịkwa ụdị anwansi ọ bụla ị ga-ejili gbochie ya.*
Ị ga-ata ahụhụ. Ị gaghịkwa enwe ike ịkwụsị ya.
A ga-esi otú ị na-atụtụdịghị anya ya bibie gị na mberede.+
12 Na-agwọ ọgwụ ị na-agwọ, na-agbakwa ọtụtụ afa ị na-agba,+Bụ́ ihe ndị ị na-eme kemgbe ị bụ nwata.
Ha nwere ike ịbara gị uru.
I nwere ike iji ha menye ndị mmadụ ụjọ.
13 Ike ìgwè ndị na-adụ gị ọdụ agwụla gị.
Ka ha bịa ugbu a zọpụta gị.
Ha na-efe ihe ndị dị n’eluigwe,* na-elekwa kpakpando.+
Mgbe ọnwa ọhụrụ pụtara,Ha na-akọ ihe ga-eme gị.
14 Ha dị ka ahịhịa ọka.
Ọkụ ga-erechapụ ha.
Ha agaghị anapụtali onwe ha* n’ọkụ a.
Ọkụ a adịghị ka nke a na-anya anya.
Ọ bụghịkwa nke a ga-anọdụ ala n’ihu ya.
15 Ihe a ga-eme ndị na-agwọrọ gị ọgwụ,Ndị gị na ha nọ na-arụgbu onwe unu n’ọrụ kemgbe ị bụ nwata.
Ha ga-awagharị, onye ọ bụla n’ime ha etinye isi ebe masịrị ya.*
E nweghị onye ga-azọpụta gị.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Ada na-amaghị nwoke bụ́ Babịlọn.”
^ Na Hibru, “Ada bụ́ ndị Kaldia.”
^ O nwere ike ịbụ, “M gaghịkwa emere mmadụ ọ bụla ebere.”
^ Na Hibru, “Ada bụ́ ndị Kaldia.”
^ O nwere ike ịbụ, “N’agbanyeghị.”
^ Ma ọ bụ “Ị gaghịkwa ama otú ị ga-esi jiri anwansi gbochie ya.”
^ O nwere ike ịbụ, “Ha na-ekewasị eluigwe; Ndị ji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
^ Na Hibru, “n’ebe nke ya.”