Aịzaya 46:1-13
46 Bel hulatara ala,+ Nibo huuru ehuru.
E bukwasịrị ha n’elu anụmanụ, n’elu anụ ndị na-ebu ibu.+
Ha dị ka ibu na-anyịgbu anụmanụ ndị ike gwụrụ.
2 Anụmanụ ndị ahụ na-ehulata otu mgbe.
Bel na Nibo agaghịkwa anapụtali onwe ha n’aka ha.
Kama ịnapụta onwe ha, a ga-adọrọkwu hanwa* n’agha.
3 “Ndị ezinụlọ Jekọb na unu niile fọrọ ná ndị Izrel,+ geenụ m ntị.
M nọ na-enyere unu aka kemgbe a mụrụ unu, na-elekọtakwa unu malite mgbe unu nọ n’afọ.+
4 Unu megodị agadi, agaghị m agbanwe.+
Isi unu chagodị awọ́, m ka ga na-elekọta unu.
Dị ka m na-eme kemgbe, m ga na-enyere unu aka, na-elekọta unu, na-anapụtakwa unu.+
5 Ònye ka unu ga-eji tụnyere m ma ọ bụ mee ka mụ na ya hara?+
Ònye ka unu ga-asị na ọ dị ka m ka à ga-asị na mụ na ya yiri?+
6 E nwere ndị na-anaghị eji ọlaedo dị n’akpa ha eme ihe bara uru.
Ha na-eji ihe e ji atụ̀ ihe atụ ọlaọcha.
Ha na-ego onye na-eji ígwè akpụ ihe, ya ejiri ọlaọcha ahụ kpụọrọ ha chi,+Ha akpọwaziere ya isiala, fewekwa ya.+
7 Ha na-eburu ya n’ubu ha.+
Ha na-eburu ya busa ebe ọ ga na-adị, ya akwụrụ ebe ahụ.
Ọ naghị esi ebe ahụ apụ.+
Ndị mmadụ na-eti mkpu, na-arịọ ya arịrịọ, ma ọ naghị atụpụrụ ha ọnụ.
O nweghị ike ịnapụta onye na-ata ahụhụ.+
8 Ndị mmebi iwu, chetanụ ihe ndị a.
Obi sie unu ike, burukwanụ ha n’obi.
9 Chetanụ ihe* ndị mere ọtụtụ afọ gara aga,Na abụ m Chineke. E nweghị Chineke ọzọ dị.
Abụ m Chineke. E nweghịkwa onye dị ka m.+
10 Ọtụtụ afọ tupu ihe ga-eme emee, m na-ekwu na ọ ga-eme.
Ọtụtụ afọ tupu e mee ihe a na-emebeghị, m na-ekwu na a ga-eme ya.+
M na-asị, ‘Ihe m kpebiri* ga-emerịrị,+M ga-emekwa ihe ọ bụla dị mụ mma.’+
11 M na-akpọ nnụnụ na-eri anụ ka o si n’ebe ọwụwa anyanwụ bịa.+
M na-akpọkwa onye ga-emezu ihe m kpebiri* ka o si n’obodo dị anya bịa.+
Ekwuola m ya. M ga-emekwa ya.
Ezubela m ime ya. M ga-emekwa ya.+
12 Ndị obi ha kpọchiri akpọchi,Ndị na-anatụdịghị eme ezi omume, geenụ m ntị.
13 Oge m ga-egosi otú m si bụrụ onye ezi omume dị nso.
Ọ dịghị anya.
M gaghị egbu oge ịzọpụta ndị m ga-azọpụta.+
M ga-azọpụta ndị bi na Zayọn, meekwa ka ndị Izrel dị ebube.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
^ Na Hibru, “ihe mbụ.”
^ Ma ọ bụ “m zubere.”
^ Ma ọ bụ “m zubere.”