Aịzaya 38:1-22
38 N’oge ahụ, Hezekaya rịawara ọrịa, nọrọkwa n’ọnụ ọnwụ.+ Aịzaya onye amụma+ bụ́ nwa Emọz wee bịa gwa ya, sị: “Jehova sịrị, ‘Gwa ndị ezinụlọ gị ihe ha ga-eme ma ị nwụọ, n’ihi na ị gaghị agbake. Ị ga-anwụ.’”+
2 N’ihi ya, Hezekaya chere ihu n’ahụ́ ụlọ, bido ịrịọ Jehova, sị:
3 “Jehova, biko, ana m arịọ gị ka i cheta+ otú m si jiri obi m niile na-eso gị mgbe niile,+ na otú m si mee ihe dị mma n’anya gị.” Hezekaya bewere ákwá, na-ebesi ya ike.
4 Jehova gwaziri Aịzaya, sị:
5 “Laghachi, gwa Hezekaya,+ sị, ‘Jehova, bụ́ Chineke Devid nna nna gị, sịrị: “Anụla m ekpere gị.+ Ahụla m anya mmiri gị.+ M ga-eme ka ị dịkwuo ndụ afọ iri na ise.+
6 M ga-anapụta ma gị ma obodo a n’aka eze Asiria. M ga-echebekwa obodo a.”+
7 Jehova ga-eme ihe ga-egosi gị na ọ ga-eme ihe o kwuru. Jehova kwuru,+ sị:
8 “M ga-eme ka onyinyo dị n’elu ebe e si arịgo n’ụlọ* Ehaz, laa azụ nzọụkwụ iri.”’”+ Onyinyo ahụ dị ebe ahụ lakwara azụ nzọụkwụ iri.
9 Hezekaya eze Juda dere ihe a mgbe ọ rịara ọrịa nke o mechara gbakee.
10 M sịrị: “M ga-abanye n’ọnụ ụzọ ámá ili*
Mgbe m na-emebeghị agadi.
A ga-anapụ m afọ ndị ọzọ m kwesịrị ịdịkwu ndụ.”
11 M sịrị: “Agaghị m ahụ amara Jaa.* Agaghị m ahụ amara Jaa n’ala ndị dị ndụ.+
Agaghị m ahụ ụmụ mmadụ anya ọzọ,N’ihi na m ga-anọ ebe ndị nwụrụ anwụ nọ.
12 Ebe m bi dị ka ụlọikwuu ndị ọzụzụ atụrụNke e fopụrụ osisi ndị ji ya, buru ha pụọ.+
Afụkọtala m ndụ m otú onye na-ekwe ákwà si afụkọta ákwà o kwechara.
O meela ka m dị ka ákwà e si n’ígwè e ji ekwe ákwà chabie.
Si n’ụtụtụ ruo n’abalị, ị na-eme ka ihe siere m ike.+
13 M na-agbalị ka m nweta onwe m tupu chi abọọ.
Ma, ọ na-agbaji ọkpụkpụ m niile otú ọdụm si eme.
Si n’ụtụtụ ruo n’abalị, ị na-eme ka ihe siere m ike.+
14 M na-ebe ákwá otú elekentịọba ma ọ bụ nza* si ebe ubé.+
M na-ebe ákwá otú nduru si ebe ubé.+
Elekatala m anya n’elu, ike agwụ m,+ mụ asị:
‘Jehova, anọ m n’ezigbo nsogbu.
Biko, nyere m aka.’+
15 Olee otú m ga-esi kelee ya?
O kwere m nkwa, mezuokwa ya.
Ná ndụ m niile, m ga-eweda onwe m alaKa m na-echeta ezigbo nsogbu m nọbu na ya.*
16 M sịrị: ‘Jehova, ọ bụ gị* mere ka ndị mmadụ dịrị ndụ.
Ọ bụkwa gị mere ka m dịrị ndụ.
Ị ga-eme ka m gbakee. Ị ga-edowekwa m ndụ.+
17 Obi nọ na-ajọ m njọ kama obi iru m ala.
Mana, i ji maka na ị hụrụ m* n’anyaMee ka m ghara ịdaba n’olulu ọnwụ.+
Ị naghịzi echeta mmehie m niile.*+
18 Ili* enweghị ike ito gị.+
Ọnwụ enweghịkwa ike ịja gị mma.+
Ndị na-agbada n’olulu enweghị ike ịtụkwasị gị obi na ị na-eme ihe i kwuru.+
19 Naanị onye dị ndụ nwere ike ito gị,Dị ka m nwere ike ito gị taa.
Nwoke nwere ike ịgwa ụmụ ya na ị na-eme ihe i kwuru.+
20 Jehova, biko, bịa zọpụta m.
Anyị ga-eji ụbọ akwara kpọọ egwú m+N’ụlọ gịnwa bụ́ Jehova ụbọchị niile anyị dị ndụ.’”+
21 Aịzaya wee sị: “Wetanụ mkpụrụ fig kpọrọ nkụ a kpụrụ akpụ ma tụkwasị ya n’etuto toro ya. Ọ bụ ya ga-eme ka ọ gbakee.”+
22 Hezekaya jụburu Aịzaya, sị: “Olee ihe ga-egosi na m ga-aga n’ụlọ Jehova?”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ O nwere ike ịbụ na a na-eji ebe e si arịgo n’ụlọ agụ oge, otú e si eji onyinyo agụ oge ma anwụ chawa.
^ Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
^ O nwere ike ịbụ, “okwolo.”
^ Ma ọ bụ “ezigbo nsogbu mkpụrụ obi m nọbu na ya.”
^ Ma ọ bụ “okwu gị na ihe ndị i mere.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “I wepụrụ mmehie m niile n’ihu gị.”
^ Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.