Aịzaya 34:1-17

  • Jehova na-eweso mba niile iwe (1-4)

  • A ga-eme ka Ịdọm tọgbọrọ nkịtị (5-17)

34  Mba dị iche iche, bịanụ nso ka unu nụ ihe m ga-ekwu. Mmadụ niile, geenụ ntị. Ụwa na ihe niile dị na ya,Elu ala na ndị niile bi na ya, geenụ ntị.   Jehova na-ewesa mba niile iwe.+ Ọ na-ewesa ndị agha ha niile iwe.+ Ọ ga-ebibi ha. Ọ ga-egbu ha.+   A gaghị eli ndị ha e gburu egbu eli. Ozu ha ga na-esi ísì.+ Ọbara ha ga-agbaze ugwu.*+   Ihe niile dị n’eluigwe ga-erekasị. A ga-apịakọta eluigwe otú e si apịakọta akwụkwọ mpịakọta. Ihe niile dị na ya ga-akpọnwụ,Otú akwụkwọ osisi vaịn si akpọnwụ ma dapụNakwa otú mkpụrụ osisi fig si ahịkpọ ma dapụ.   “N’ihi na ọbara ga-ekpuchi mma agha m n’eluigwe.+ M ga-ekpe ndị Ịdọm ikpe, jiri mma agha m sụọ ha akwụ,+N’ihi na ekpebiela m ibibi ha.   Mụnwa bụ́ Jehova nwere mma agha. Ọ ga-abụ ọbara ọbara. Abụba ga-adịkwa n’ahụ́ ya niile,+Ya na ọbara ụmụ ebule na ewuNakwa abụba si n’akụrụ ebule. N’ihi na Jehova ga-achụ àjà na Bọzra,Ọ ga-asụkwa ndị mmadụ akwụ n’Ịdọm.+   A ga-egbu atụ́ otú e gburu anụ ndị ọzọ,Gbuokwa ma obere oké ehi ma nnukwu oké ehi. Ọbara ga-ede ala ndị Ịdọm,Ájá dị n’ala ha ga-abụkwa abụba abụba.”   N’ihi na Jehova ahọrọla ụbọchị ọ ga-akwụ ndị iro ya ụgwọ.+ Ọ họrọkwala afọ ọ ga-akwụ ndị mere Zayọn ihe ọjọọ ụgwọ ihe ha mere.+   A ga-eme ka iyi ndị dị na ya* ghọọ korota,Meekwa ka ájá ya ghọọ sọlfọ. Otú ọkụ si agba korota ka ala ya ga-esi na-agba ọkụ. 10  A gaghị emenyụ ya emenyụ ma n’ehihie ma n’abalị. Anwụrụ ọkụ ya ga na-akwụgo elu ruo mgbe ebighị ebi. Otú ọ dị mgbe e bibiri ya ka ọ ga-adịgide si n’otu ọgbọ ruokwa n’ọgbọ ọzọ. O nweghị onye ga-esi na ya gafee ruo mgbe niile ebighị ebi.+ 11  Okwolo na ebi ogwu ga-ebichi ya. Ikwiikwii* na ugoloọma ga-ebikwa na ya. Chineke ga-eji eriri e ji atụ̀ ihe na nke e ji ama ma ihe ọ̀ kwụ ọtọ* tụọ ala aIji gosi na a ga-ebibi ya ya atọgbọrọ nkịtị. 12  E nweghị onye ọ bụla n’ime ndị ya a ma ama a ga-echi eze. Ndị isi ya niile agaghịzi adị. 13  Ogwu ga-eto n’ụlọ elu ndị dị n’ime ya,Ahịhịa akụwa na ahịhịa ogwu ga-etokwa n’ebe ya ndị a rụsiri ike. Ọ ga-aghọkwa ụlọ nkịta ọhịa+Na ogige enyí nnụnụ. 14  Anụ ọhịa ndị bi n’ọzara ga-ezute anụ ndị na-agbọ ụja. Ewu ọhịa* ga-akpọkwa ibe ya òkù. N’eziokwu, nnụnụ na-efe n’abalị* ga-atụsara ahụ́ ebe ahụ, hụkwa ebe ọ ga-ezu ike. 15  Agwọ ga-akpa akwụ́, yiekwa àkwá ebe ahụ. Ọ ga-abụ àkwá ndị ahụ, chịkọtakwa ụmụ ya n’okpuru ya. N’eziokwu, égbé ga-ezukọtakwa ebe ahụ, oké na nne, oké na nne. 16  Chọọnụ n’akwụkwọ Jehova ma gụpụta ya. E nweghị otu n’ime ha a ga-achọ achọ. O nweghịkwa nke na-agaghị enwe oké na nne,N’ihi na ọ bụ Jehova ji ọnụ ya nye iwu ka ọ dịrị otú ahụ. Ọ bụkwa mmụọ ya chịkọtara ha. 17  Ọ bụ ya feere ha nza. Ọ bụkwa ya na-ekwu ebe nke ọ bụla n’ime ha ga-anọ.* Ha ga-ebichi ebe ndị ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ha ga-ebikwa na ha n’ọgbọ niile.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ga na-asọ asọ n’ugwu.”
O nwere ike ịbụ Bọzra, bụ́ isi obodo Ịdọm.
Ma ọ bụ “Ikwiikwii nwere ntị ogologo.”
Na Hibru, “Chineke ga-eji eriri e ji atụ̀ ihe nakwa nkume.”
O nwere ike ịbụ, “Mmụọ ọjọọ yiri ewu.”
Ya bụ, nnụnụ yiri ikwiikwii.
Na Hibru, “na-eji eriri e ji atụ̀ ihe ekere ha ya.”