Aịzaya 30:1-33

  • E nweghị uru ọ bụla aka ndị Ijipt na-enye ga-aba (1-7)

  • Ndị mmadụ anabataghị amụma a na-eburu ha (8-14)

  • Ịtụkwasị Chineke obi ga-eme ka mmadụ dị ike (15-17)

  • Jehova na-emere ndị ya amara (18-26)

    • Jehova bụ Onye Ozizi Kachanụ (20)

    • “Lekwanụ ụzọ” (21)

  • Jehova ga-ata ndị Asiria ahụhụ maka ihe ha mere (27-33)

30  Jehova kwuru, sị: “Ụmụ dị isi ike ga-ata ahụhụ.+ Ha na-eme uche ha, ọ bụghị nke m.+ Ha na ibe ha na-agbakọ aka eme ihe,* ma ọ bụghị mmụọ m na-edu ha. Ha si otú a na-eme mmehie n’elu nke ha mere eme.   Ha na-aga Ijipt+ n’ajụghị m ase.+ Ha na-aga ebe ahụ ka Fero chebe ha*Nakwa ka ndị Ijipt chebe ha.   Ma, nchebe Fero ga-echebe ha ga-eme ka ihere mee ha. A ga-emechukwa ha ihu n’ihi nchebe ndị Ijipt ga-echebe ha.+   N’ihi na ndị isi ya nọ na Zoan,+Ndị na-agara ya ozi eruokwala Henes.   Ndị ga-emenye ha niile ihereBụ ndị na-abaraghị ha uru ọ bụla,Ndị na-anaghị enyere mmadụ aka, ndị na-anaghị abara mmadụ uru,Ndị ihe ha na-eme bụ naanị imenye ndị ọzọ ihere na ịkparị ha.”+  Ihe Chineke kpebiri ime anụ ọhịa ndị na-aga n’ebe ndịda: Ha na-ebu akụ̀ ha n’elu jakị,Na-ebukwa ngwongwo ha n’azụ kamel. Ha na-ebu ha agafe ala ahụhụ na ihe isi ike dị,Ala ọdụm ndị na-agbọ ụja juruNakwa ala ajụala na agwọ na-acha ọkụ ọkụ nke na-efe efe* juru. Ma, ihe ndị ahụ ha bu agaghị abara ndị mmadụ uru.   O nweghị uru ọ bụla aka ndị Ijipt na-enyere unu bara.+ N’ihi ya, m gụrụ ha: “Rehab,+ onye na-anọ ọdụ otu ebe n’enweghị ihe ọ na-arụ.”   “Ugbu a, gaa nọrọ n’ihu ha dee ya ná mbadamba ihe,Deekwa ya n’akwụkwọ,+Ka ọ dịrị maka ọdịnihu,Ka ọ bụrụ ihe akaebe ga-adịgide adịgide.+   N’ihi na ha bụ ndị na-enupụ isi,+ ụmụ na-aghọ aghụghọ,+Ụmụ na-achọghị ịnụ iwu* Jehova.+ 10  Ha na-asị ndị na-ahụ ọhụụ, ‘Unu ahụzila ọhụụ,’Na-asịkwa ndị amụma, ‘Unu ebuzirila anyị ihe bụ́ eziokwu n’amụma.+ Na-agwanụ anyị ihe ga-atọ anyị ụtọ ịnụ. Na-agwanụ anyị ihe dị mma ná ntị n’agbanyeghị na ọ bụghị ihe unu hụrụ n’ọhụụ.+ 11  Hapụnụ ụzọ unu na-aga. Tinyenụ isi n’ụzọ ọzọ. Kwụsịnụ ịgwa anyị gbasara Onye Nsọ Izrel.’”+ 12  N’ihi ya, Onye Nsọ Izrel kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na unu jụrụ okwu m,+Ebe ọ bụkwa na unu ji ịgha ụgha na ịghọ aghụghọ hiwe isi,Unu jikwa ha nwee olileanya,+ 13  Unu ga-adị ka mgbidi gbawara agbawa,Dịkwa ka mgbidi dị elu nke huuru ehuru ma na-achọ ịda. Ọ ga-ada na mberede, n’otu ntabi anya. 14  A ga-etiwa ya ka ebe e tiwara nnukwu ite ọkpụite kpụrụ. A ga-akụ ya righirighi nke na a gaghịzi ahụ iberibe ya ọ bụlaA ga-eji agụta ọkụ n’ekwúMa ọ bụ nke a ga-eji kuru mmiri n’ebe apịtị dị.”* 15  Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, bụ́ Onye Nsọ Izrel, kwuru, sị: “A ga-azọpụta unu ma unu lọghachikwute m, nọrọ nwayọọ ma tụkwasị m obi. Unu ga-adị ike naanị ma unu nọrọ jii ma tụkwasị m obi.”+ Ma unu achọghị ime ya.+ 16  Kama, unu sịrị: “Mba, anyị ga-arịgoro n’elu ịnyịnya gbaa ọsọ.” N’ihi ya, unu ga-agbarịrị ọsọ. Unu kwukwara, sị: “Anyị ga-agba ịnyịnya na-efe ọsọ.”+ N’ihi ya, ndị na-achụ unu ga na-efekwa ọsọ.+ 17  Otu puku mmadụ ga-ama jijiji n’ihi egwu otu onye yiri ha.+ Unu ga-ejikwa maka egwu mmadụ ise yiri unu gbaa ọsọ. Unu ga-agbagide ọsọ ruo mgbe ndị fọdụrụ n’ime unu ga-adị ka osisi ákwà ụgbọ mmiri nke dị n’elu ugwu,Dịkwa ka ihe na-agba àmà e gwunyere n’elu ugwu.+ 18  Ma, Jehova na-enwere unu ndidi* ka o meere unu amara.+ Ọ gaghịkwa agba nkịtị. Ọ ga-emere unu ebere.+ Jehova bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi.+ Ndị niile na-atụ anya ya na-enwe obi ụtọ.+ 19  Mgbe ndị Zayọn ga-alọghachi Jeruselem,+ o nweghị ihe ga-eme ka unu bee ákwá.+ Chineke* ga-emere unu amara mgbe ọ nụrụ ákwá unu na-ebe ka e nyere unu aka. Ọ ga-enyere unu aka ozugbo ọ nụrụ ya.+ 20  Ọ bụ eziokwu na nri Jehova ga-enye unu bụ ịta unu ahụhụ, mmiri ọ ga-enyekwa unu bụ ime ka ihe siere unu ike,+ ma, Onye Ozizi unu kachanụ agaghịzi ezo onwe ya ezo. Unu ga-ejikwa anya unu hụ Onye Ozizi unu kachanụ.+ 21  Ọ bụrụ na unu efuo ụzọ, tinye isi n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe,+ unu ga-anụ olu ga-esi n’azụ na-agwa unu, sị: “Lekwanụ ụzọ.+ Na-aganụ na ya.” 22  Unu ga-emerụ ọlaọcha e ji machie arụsị dị iche iche a pịrị apị unu na-efe. Unu ga-emerụkwa ọlaedo e ji machie arụsị dị iche iche a kpụrụ akpụ unu na-efe.+ Unu ga-atụfu ha otú nwaanyị si achịfu ákwà o yi mgbe ọ nọ ná nsọ. Unu ga-asịkwa ihe ndị ahụ: “Nke unu agaala!”*+ 23  Ọ ga-emekwa ka mmiri zoo n’oge unu kụrụ mkpụrụ n’ala.+ Nri ala a ga-emepụta ga-adị mma, hiekwa nne.+ N’oge ahụ, anụ ụlọ unu ga-ata ahịhịa ná nnukwu ala ahịhịa juru.+ 24  Ehi na jakị ndị e ji akọ ubi ga-ata ahịhịa dị mma, nke e ji shọvel na fọk wepụsịa ihe ndị na-adịghị mma na ya. 25  N’ụbọchị a ga-egbu ọtụtụ ndị mgbe ụlọ nche dị iche iche ga-ada, iyi na olulu mmiri ga-adị ma ná nnukwu ugwu niile ma n’obere ugwu niile.+ 26  N’ụbọchị Jehova ga-ekechi ọkpụkpụ ndị ya gbajiri agbaji,+ gwọọkwa ha ezigbo ahụ́ o merụrụ ha mgbe o tiri ha ihe,+ ìhè ọnwa gbazuru agbazu ga-adị ka ìhè anyanwụ. Anyanwụ ga-enyekwu ìhè okpukpu asaa+ dị ka à ga-asị na o ji otu ụbọchị chaa ihe o kwesịrị iji abalị asaa chaa. 27  Jehova* si ebe dị anya na-abịa. Ezigbo iwe ji ya. Ígwé ojii na-enweghị atụ kpuchikwara ya. Egbugbere ọnụ ya na-egosi na ezigbo iwe ji ya. Ire ya dịkwa ka nnukwu ọkụ.+ 28  Mmụọ* ya dị ka iyi toro eto nke na-eru mmadụ n’olu. Ọ ga-eji myọ yọchapụta mba dị iche iche ka ihe a ga-ebibi ebibi.* Ọ ga-ekenyekwa eriri n’agba ha+ dufuo ha. 29  Ma, abụ unu ga-abụ ga-adị ka nke unu na-abụ n’abalịUnu na-ejike* ememme.+ Obi ga-abụkwa unu sọ aṅụrịOtú obi na-abụ onye na-egbu ọjà sọ aṅụrịKa ọ na-aga n’ugwu Jehova, ka ọ gakwuru Oké Nkume Izrel.+ 30  Jehova ga-eme ka a nụ olu ya dị ebube.+ Ọ ga-emekwa ka a hụ mgbe ọ ga-eji ezigbo iwe jiri aka ya+ taa ndị iro ya ahụhụ.+ Ihe ndị ọ ga-eji mee ya bụ ire ọkụ nke nnukwu ọkụ+Na oké mmiri ozuzo+ na égbè eluigwe na akụ́ mmiri ígwé.+ 31  Olu Jehova ndị Asiria ga-anụ ga-eme ka ezigbo ụjọ jide ha.+ Ọ ga-apịakwa ha ụtarị.+ 32  Ugboro ole ọ bụlaJehova ga-apịa ndị Asiria ụtarịGa-abụ ugboro ole a ga-eji obere ịgbà na ụbọ akwara kụọ egwú.+ A ga na-akụ ya ka Chineke ji aka ya na-alụso ha agha.+ 33  N’ihi na a kwadebechaala Tofet*+ ha. A kwadebekwaara ya eze ha.+ Chineke* akwakọtala nkụ n’ebe miri emi. Nnukwu ọkụ na nkụ hiri nne dịkwa ebe ahụ. Ume Jehova, nke dị ka sọlfọ nke na-asọ ka mmiri,Ga-esunye ya ọkụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “na-achụ àjà e ji mmanya achụ.” O nwere ike ịbụ iji gosi na e nweela otu olu.
Na Hibru, “ka ha gbaba ebe Fero rụsiri ike.”
Ma ọ bụ “agwọ ọjọọ nke na-efe ọsọ.”
Ma ọ bụ “ntụziaka.”
O nwere ike ịbụ, “n’olulu mmiri.”
Ma ọ bụ “ọ na-agụ Jehova agụụ.”
Na Hibru, “Ọ.”
O nwere ike ịbụ, “Unu ruru unyi.”
Na Hibru, “Aha Jehova.”
Ma ọ bụ “Ume.”
Na Hibru, “ka ihe na-abaghị uru ọ bụla.”
Ma ọ bụ “na-edo onwe unu nsọ maka.”
E ji “Tofet” tụnyere ebe ọkụ na-ere, nke e ji ama atụ mbibi.
Na Hibru, “Ọ.”