Aịzaya 3:1-26
3 Ezi Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha,Na-anapụ Jeruselem na Juda ihe niile ha tụkwasịrị obi na ihe ndị dị ha mkpa,Ma nri ma mmiri,+
2 Ma dike ma onye agha,Ma onyeikpe ma onye amụma,+ ma onye na-agba afa ma okenye,
3 Ma onyeisi ndị agha iri ise+ ma onye a na-akwanyere ùgwù ma onye ndụmọdụMa onye bụ́ aka ochie n’ime anwansi, ma onye ma otú e si arata agwọ.+
4 M ga-eme ka ụmụntakịrị nwoke bụrụ ndị isi ha.
Ndị na-anaghị akwụ otu ebe ga na-achịkwa ha.
5 Ha ga na-emekpa ibe ha ahụ́.
Onye nke ọ bụla ga na-emekpa ibe ya ahụ́.+
Nwatakịrị nwoke ga na-akparị agadi nwoke.
Onye na-enweghị ihe ọ bụ ga na-akparịkwa onye a na-akwanyere ùgwù.+
6 Onye nke ọ bụla ga-ejide nwanne ya n’ụlọ nna ya, sị:
“Ebe ọ bụ na i nwere ákwà mgbokwasị, chịwa anyị.
Lekọtawakwa ebe a a kwaturu, ya aghọọ ikpo nkume.”
7 Ma ọ gaghị ekwe. Ọ ga-ekwu n’ụbọchị ahụ, sị:
“Agaghị m abụ onye na-ekechi ọnyá unu.*
Nri ma ọ bụ uwe adịghịkwa n’ụlọ m.
Unu emela m onye ga na-achị ndị mmadụ.”
8 N’ihi na Jeruselem adaala,Juda adaakwala,Maka na ha na-emegide Jehova, ma n’okwu ọnụ ma n’omume.
Ha na-enupụ isi n’ihu onye dị ebube.+
9 Otú ihu ha dị na-egosi ihe ha mere.
Ha na-ekwurịtakwa gbasara mmehie ha ka ndị Sọdọm.+
Ha anaghị ezo ya ezo.
Ha* ga-ata ahụhụ, n’ihi na ha na-akpatara onwe ha ọdachi.
10 Gwanụ ndị ezi omume na ihe ga-agaziri ha.
A ga-akwụ ha ụgwọ ihe ha na-eme.+
11 Onye ajọ omume ga-ata ahụhụ.
Ọdachi ga-adakwasị ya,N’ihi na a ga-eme ya ihe o mere ndị ọzọ.
12 Ndị na-agwa ndị m ihe ha na-arụ na-emesi ha ike.
Ọ bụkwa ụmụ nwaanyị na-achị ha.
Unu ndị m, ndị ndú unu edufuola unu.
Ha emeekwala ka ụzọ unu kwesịrị iso gbagwojuo unu anya.+
13 Jehova na-akwadebe ikpe ikpe,O guzokwa ọtọ ikwu ihe ọ ga-eme mba dị iche iche.
14 Jehova ga-ekpe ndị okenye na ndị isi ndị ya ikpe.
“Unu agbaala ubi vaịn ọkụ.
Ihe unu zuru na nke ndị ogbenye dịkwa n’ụlọ unu.+
15 Gịnị mere unu ji na-emesi ndị m ike,Na-echikwa ụmụ ogbenye ọnụ n’ala?”+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru ihe ndị a.
16 Jehova kwukwara, sị: “Ụmụ nwaanyị Zayọn dị mpako.
Ọ na-abụ, ha na-aga n’ụzọ, ha ana-ele anya n’elu,*Jiri anya ha na-achụ nwoke, na-aga ije nganga,Na-emekwa ka ọla ha gba n’ụkwụ na-eme mkpọtụ.
17 N’ihi ya, Jehova ga-eme ka akpụkpa ghaa ụmụ nwaanyị Zayọn n’isi.
Jehova ga-emekwa ka isi kwọchaa ha.+
18 N’ụbọchị ahụ, Jehova ga-ewepụ ihe niile ha ji achọ onwe ha mma, ma ọla ụkwụ ha,Ma ihe ha na-eke n’isi, ma ihe yiri ọnwa ha ji achọ mma,+
19 Ma iyeri ntị, ma ọla ha na-agba n’aka, ma ákwà ha ji ekpuchi ihu ha,
20 Ma ákwà isi, ma ọla ha na-agba n’ụkwụ, ma ákwà ha na-eke n’obi,Ma mkpọ̀ sent, ma ọtụmọkpọ ha,
21 Ma mgbaaka ha, ma ọla ha na-agba n’imi,
22 Ma uwe ha na-eyi n’ememme, ma uwe elu ha, ma ákwà mgbokwasị ha, ma obere akpa ego ha,
23 Ma enyo ha na-eji n’aka,+ ma uwe ha ndị e ji linin kpaa,*Ma ákwà ha na-eke n’isi, ma ákwà ndị ha ji ekpuchi ihu ha.
24 A ga na-anụ ísì ihe rere ere n’ahụ́ ha kama ịnụ ísì mmanụ balsam.+
Ha ga-eke eriri kama ike ájị̀.
Ha ga-enwe isi nkwọcha+ kama inwe ntutu isi mara mma.
Ha ga-eyi ákwà iru uju+ kama iyi ákwà dị oké ọnụ.
Kama ịchọ ha mma, a ga-akacha ha ihe n’ahụ́.
25 Zayọn, a ga-eji mma agha gbuo ụmụ nwoke nọ n’ime gị.
A ga-egbukwa ndị dike nọ n’ime gị n’agha.+
26 Ndị mmadụ ga-anọ n’ọnụ ụzọ gị niile na-eru uju, na-ebekwa ákwá.+
Ị ga-anọkwa ọdụ n’ala na-ebe ákwá.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “onye na-agwọ unu.”
^ Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ha.”
^ Na Hibru, “ana-agbatị olu ha.”
^ Ma ọ bụ “uwe ime ha.”