Aịzaya 28:1-29
28 Ndị aṅụrụma, bụ́ ndị Ifrem,+ ga-ata ahụhụ. Ha na-ewere obodo ha* ka okpueze na-egbuke egbuke,*Ka ọmarịcha okooko osisi nke dị n’isi ndagwurugwu na-eme nri.
Ma, mmanya na-egbu ndị nọ ebe ahụ, ọmarịcha okooko osisi ha ga-akpọnwụkwa.
2 Jehova ga-ezite onye siri ike, nke bụ́kwa dimkpa.
Ọ ga-eji ike tụda okpueze ahụ n’alaOtú akụ́ mmiri ígwé si ada mgbe égbè eluigwe na-agba nakwa otú oké ifufe si ebibi ihe.
Ọ ga-atụdakwa ya otú idei mmiri si asọsi ike mgbe mmiri na-ezosi ike, égbè eluigwe ana-agbakwa.
3 A ga-azọ okpueze na-egbuke egbuke*Ndị aṅụrụma Ifrem kpu ụkwụ.+
4 Okooko osisi na-achanwụ achanwụ e ji chọọ ya mma,Nke dị n’isi ndagwurugwu nke na-eme nri,
Ga-adị ka mkpụrụ fig mbụ mịrị tupu oge ọkọchị.
Ọ na-abụ mmadụ hụ ya, ya aghọrọ ya taa ozugbo.
5 N’oge ahụ, Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-aghọrọ ndị ya fọrọ afọ+ okpueze dị ebube na okpu mara mma.
6 Ọ ga-enyere ndị na-ekpe ikpe aka ka ha na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ ga-enyekwa ndị na-anọ n’ọnụ ụzọ ámá ike ha ga-eji na-achụghachi ndị iro bịara ịlụso ha agha.+
7 Ndị nchụàjà na ndị amụma akpafuola n’ihi mmanya.
Ha na-adagharị n’ihi mmanya na-egbu ha.
Mmanya na-egbu ha emeela ka ha kpafuo.
Mmanya na-emegharị ha anya,Ha na-adagharịkwa n’ihi mmanya na-egbu ha.
Ọhụụ ha hụrụ emeela ka ha kpafuo.
Mmanya ekweghịzi ha mara ihe ha na-ekpe n’ikpe.+
8 Ihe dịcha na tebụl ha niile bụ agbọ na-asọ oyi.
O nweghị ebe ha na-agbọsaghị ya.
9 Ha na-ekwu, sị: “Ònye ka a ga-akụziri ihe?
Ònyekwa ka a ga-akọwara ihe e kwuru?
Ọ̀ bụ ndị a kwụsịrị ara?
Ọ̀ bụ ndị a napụrụ ara?
10 Ọ na-asị, “E nye iwu, e nyeghachi iwu. E nye iwu, e nyeghachi iwu,N’ahịrị n’ahịrị, n’ahịrị n’ahịrị,*+Ntakịrị n’ebe a, ntakịrị n’ebe ahụ.”*
11 N’ihi ya, ọ ga-eji ndị na-asụ nsụ gwa ndị a okwu, jirikwa asụsụ ndị mba ọzọ gwa ha okwu.+
12 E nwere mgbe ọ gwara ha, sị: “Ebe a bụ ebe a na-ezu ike. Ka onye ike gwụrụ zuru ike. Ebe a bụkwa ebe mmadụ na-anọ nweta onwe ya.” Ma, ha achọghị ige ntị.+
13 N’ihi ya, okwu Jehova ga-adị ha ka:
“E nye iwu, e nyeghachi iwu. E nye iwu, e nyeghachi iwu,N’ahịrị n’ahịrị, n’ahịrị n’ahịrị,*+Ntakịrị n’ebe a, ntakịrị n’ebe ahụ.”*
N’ihi ya, ha gawa ije,Ha ga na-adagharị, jiri azụ daa,Merụọ ahụ́, a mata ha n’ọnyà, jidekwa ha.+
14 N’ihi ya, ndị na-etu ọnụ na ndị na-achị ndị a nọ na Jeruselem,Nụrụnụ ihe Jehova kwuru,
15 N’ihi na unu sịrị:
“Anyị na Ọnwụ agbaala ndụ.+
E nwekwara ihe anyị na ili* kwekọrịtara.
Ọ bụrụ na oké idei mmiri nke na-achị ọkụ asọfewe,Ọ gaghị erute ebe anyị nọ,N’ihi na anyị emeela ụgha ebe mgbaba anyị.
Anyị ejirila ụgha kpuchie onwe anyị.”+
16 Ihe a emeela ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuo, sị:
“Ana m adọnye otu nkume na Zayọn ka ọ bụrụ ntọala. Nkume a anaghị agharịpụ agharịpụ.+
Ọ bụ nkume dị oké ọnụ*+ nke ga-eme ka ntọala ụlọ sie ezigbo ike.+
Ụjọ agaghịkwa atụ onye nwere okwukwe na ya.+
17 M ga-eme ka ikpe ziri ezi bụrụ eriri e ji atụ̀ ihe,+Meekwa ka ezi omume bụrụ ihe e ji atụ̀ ihe iji mata ma ihe ọ̀ dị larịị.+
Akụ́ mmiri ígwé ga-ekpochapụ ebe na-enweghị isi ha gbabara.
Mmiri ga-ebupụkwa ebe ahụ ha zoro.
18 A ga-emebi ndụ ahụ unu na Ọnwụ gbara.
Ihe ahụ unu na ili* kwekọrịtara agaghịkwa enwe isi.+
Ọ bụrụ na oké idei mmiri nke na-achị ọkụ asọfewe,Ọ ga-ebibi unu.
19 Mgbe ọ bụla ọ na-asọfe,Ọ ga-eburu unu.+
Ọ ga na-asọfe n’ụtụtụ ọ bụla,N’ehihie nakwa n’abalị.
Naanị ụjọ ga-eme ka ha ghọta ihe e kwuru.”*
20 Mmadụ agaghị agbatịli onwe ya n’elu àkwà* n’ihi na àkwà ahụ adịghị ogologo.
Mmadụ agaghịkwa ejili ákwà a kpara akpa kpuchie onwe ya n’ihi na ákwà ahụ dị warara.
21 N’ihi na Jehova ga-ebili otú o biliri n’Ugwu Perezim.
Ọ ga-ewe iwe otú o were na ndagwurugwu dị nso na Gibiọn.+
Ọ ga-eme ihe ọ na-eme, ihe dị ịtụnanya.
Ọ ga-arụkwa ọrụ ya, ọrụ na-eju anya.+
22 Ugbu a, unu akwala emo,+Ma ọ́ bụghị ya, a ga-eme ka agbụ e kere unu sikwuo ike.
N’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, gwara mNa e kpebiela ibibi obodo niile.*+
23 Ṅaanụ ntị nụrụ olu m.
Geenụ ntị nụrụ ihe m na-ekwu.
24 Onye na-akọ ugbo ọ̀ ga-akọgide ala si n’ụtụtụ ruo n’abalị tupu ya akụọ mkpụrụ?
Ọ̀ ga-anọgide na-egburi ala, na-etirikwa ya?+
25 Ọ̀ bụ na ọ naghị agha mkpụrụ kọmin ojii, kụọkwa mkpụrụ kọmin nkịtịMa ọ kọchaa ala ahụ?
Ọ̀ bụ na ọ naghị akụ ọka wit, ọka milet, na ọka bali ebe ndị o kwesịrị ịkụ ha?
Ọ̀ bụ na ọ naghị akụ ọka spelt+ gburugburu ala ahụ?
26 Chineke na-agwa mmadụ* ka ọ na-eme ihe ziri ezi.
Ọ na-akụzikwara ya ihe.+
27 A naghị eji ihe e ji eticha ọka etichapụta mkpụrụ kọmin ojii.+
A naghịkwa eji ụkwụ ụgbọala arị mkpụrụ kọmin nkịtị elu.
Kama, a na-eji okporo osisi etichapụta mkpụrụ kọmin ojii.
A na-ejikwa mkpara etichapụta mkpụrụ kọmin nkịtị.
28 N’oge mmadụ na-eticha ọka, ọ̀ na-egweri ya ya aghọọ ntụ ọka a ga-eji eme achịcha?
Mba, ọ naghị egweri ya.+
Ya nyawakwa ụgbọala ya ịnyịnya na-adọkpụ, ụkwụ ụgbọala ya na-arị ọka ahụ elu,Ma ọ naghị egweri ya.+
29 Ihe a sikwa n’aka Jehova nke ụsụụ ndị agha,Onye ndụmọdụ* ya dị ebube,Onye ihe ọ bụla ọ na-eme na-agazi agazi.*+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ O nwere ike ịbụ Sameria bụ́ isi obodo ha ka a na-ekwu gbasara ya.
^ Ma ọ bụ “dị mpako; na-akpa nganga.”
^ Ma ọ bụ “dị mpako; na-akpa nganga.”
^ Ma ọ bụ “Eriri e ji atụ̀ ihe n’elu eriri e ji atụ̀ ihe, eriri e ji atụ̀ ihe n’elu eriri e ji atụ̀ ihe.”
^ Ndị isi okpukpe weere na ozi Aịzaya na-ezi ndị mmadụ na-ada ka otu ihe a na-ekwughachi ugboro ugboro, na-adakwa ka ihe ụmụaka.
^ Ma ọ bụ “Eriri e ji atụ̀ ihe n’elu eriri e ji atụ̀ ihe, eriri e ji atụ̀ ihe n’elu eriri e ji atụ̀ ihe.”
^ Ndị isi okpukpe weere na ozi Aịzaya na-ezi ndị mmadụ na-ada ka otu ihe a na-ekwughachi ugboro ugboro, na-adakwa ka ihe ụmụaka.
^ Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “nkume pụrụ iche.”
^ Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ O nwere ike ịbụ, “Ha ghọta ihe e kwuru, ezigbo ụjọ ga-ejide ha.”
^ Ma ọ bụ “ihe ndina.”
^ Ma ọ bụ “ụwa niile.”
^ Ma ọ bụ “na-adọ mmadụ aka ná ntị.”
^ Ma ọ bụ “nzube.”
^ Ma ọ bụ “Onye amamihe ya na-enweghị atụ.”