Aịzaya 27:1-13

  • Jehova gburu nnukwu anụ mmiri (1)

  • Abụ gbasara ndị Izrel, ndị a kpọrọ ubi vaịn (2-13)

27  N’oge ahụ, Jehova ga-eji nnukwu mma agha ya dị ezigbo nkọ+Lebara nnukwu anụ mmiri,* bụ́ agwọ na-amịgharị amịgharị, anya,Ya bụ, nnukwu anụ mmiri, bụ́ agwọ gbagọrọ agbagọ. Ọ ga-egbukwa nnukwu anụ a nọ n’oké osimiri.   Bụọrọnụ ya* abụ n’oge ahụ, sị: “Ubi vaịn nke mmanya vaịn ya na-agbọ ụfụfụ!+   Mụnwa, bụ́ Jehova, na-echebe ya.+ M na-agba ya mmiri mgbe niile.+ M na-echebe ya ehihie na abalị,Ka a ghara inwe onye ga-eme ya ihe ọ bụla.+   Anaghịzi m ewere ya iwe.+ Mmadụ jiri osisi ogwu na ahịhịa bịa ịlụso m agha,M ga-azọ ha ụkwụ, suo ha ọkụ otu mgbe, lụsokwa onye ahụ agha.   Ma ọ bụrụ na ọ chọghị ya otú ahụ, ya bịa n’ebe m a rụsiri ike ka e chebe ya. Ya bịa ka mụ na ya mee udo. Ya chọta m ka mụ na ya mee udo.”   N’ọdịnihu, Jekọb ga-agbanye mgbọrọgwụ. Ndị Izrel ga-ama ifuru, waakwa alaka.+ Mkpụrụ ha ga-amị ga-ejupụtakwa n’ala ha.+   Gịnị mere e ji tikasịa ha ahụ́ otú a? Gịnịkwa mere e ji si otú a gbuo ha?   Ka ị na-alụso ha ọgụ mgbe ị na-achụpụ ha, ị ga na-eti mkpu otú na-emenye ụjọ. N’ụbọchị ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ na-efe, ị ga-eji ifufe gị nke na-efesi ike chụpụ ha.+   Otú a ka a ga-esi kpuchiere Jekọb mmehie ya.+ E wepụchaa mmehie ya, lekwa ihe ga-emezi: Chineke ga-eme ka nkume niile e ji rụọ ebe ịchụàjàDịrị ka nzu e gwere egwe. O nweghịkwa ogwe osisi arụsị* ma ọ bụ ihe ndị e ji adọsa insens ga-adị ebe ahụ.+ 10  N’ihi na ndị mmadụ ga-esi n’obodo a rụsiri ike gbapụsịa. Ha ga-ahapụ ala anụmanụ na-ata ahịhịa, ya adị ka ala ịkpa.+ Ebe ahụ ka nwa ehi ga na-ata ahịhịa, na-amakpukwa. Ọ ga-atachapụkwa alaka osisi dị iche iche.+ 11  Mgbe ntakịrị alaka osisi dị iche iche kpọnwụrụ,Ụmụ nwaanyị ga-abịa nyakapụta ha,Were ha mere nkụ. N’ihi na ndị a anaghị aghọta ihe.+ Ọ bụ ya mere na Onye kere ha agaghị emere ha ebere,Onye kpụrụ ha agaghịkwa emere ha amara.+ 12  N’oge ahụ, Jehova ga-akpọkọta ndị Izrel nọ ebe dị iche iche malite n’Osimiri Yufretis ruo na Ndagwurugwu* Ijipt.+ Ọ ga-achịkọta ha otú ahụ mmadụ si elezi anya tụtụkọta mkpụrụ osisi ọ kụtusịrị.+ 13  N’oge ahụ, a ga-afụ opi ike,+ ndị nọ n’ọnụ ọnwụ n’Asiria+ na ndị a chụsara achụsa nọ n’Ijipt+ ga-abịakwa kpọọrọ Jehova isiala n’ugwu dị nsọ nke dị na Jeruselem.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Levayatan.” Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ Izrel, e jikwa ya tụnyere ubi vaịn.