Aịzaya 21:1-17
21 Ihe Chineke kpebiri ime ala ịkpa nke dị ka oké osimiri:*+
E nwere ọdachi si n’ala ịkpa nakwa n’ala na-atụ ụjọ na-abịaOtú oké ifufe nke na-efe n’ebe ndịda si aga.+
2 E nwere ọhụụ na-emenye ụjọ e mere ka m hụ:
Onye aghụghọ ka na-aghọ aghụghọ.
Onye na-ebibi ihe ka na-ebibi ihe.
Ịlam, gaa agha! Midia, nọchibido obodo!+
M ga-eme ka ude niile o* mere ka ndị mmadụ na-asụ kwụsị.+
3 Ọhụụ a emeela ka m hụsie anya.*+
Ahụ́ niile na-egbu m mgbuOtú o si egbu nwaanyị mgbe ọ na-amụ nwa.
Anaghịzi m anụ ihe maka na obi erughị m ala.
Anaghịzi m ahụ ụzọ maka na isi na-agba m ghara ghara.
4 Obi anaghịzi ezu m ike. M na-amakwa jijiji n’ihi ụjọ.
Chi ojiji nke na-amasịbu m na-emezi ka m na-ama jijiji.
5 Doonụ tebụl n’usoro, haziekwanụ oche.
Na-erinụ ihe, na-aṅụkwanụ mmanya.+
Ndị isi, bilienụ tee ọta mmanụ.
6 N’ihi na Jehova gwara m, sị:
“Gaa, dowe onye nche ka ọ na-ekwu ihe ọ na-ahụ.”
7 Onye nche ahụ hụkwara ndị nọ n’ụgbọ agha nke ịnyịnya abụọ na-adọkpụ,Hụkwa ụgbọ agha nke jakị na-adọkpụ,Na ụgbọ agha nke kamel na-adọkpụ.
O leruru anya ala, geekwa ntị nke ọma.
8 O tiziri mkpu ka ọdụm, sị:
“Jehova, m na-eguzo n’ụlọ nche mgbe niile n’ehihie,Na-eguzokwa n’ebe m na-anọ eche nche n’abalị ọ bụla.+
9 Legodị ndị na-abịa:
Ha nọ n’ụgbọ ịnyịnya agha nke ịnyịnya abụọ na-adọkpụ na-abịa.”+
O kwukwara, sị:
“Babịlọn adaala! Ọ daala!+
A kụọla arụsị ya niile a pịrị apị, ndị bụ́ chi ya, righirighi, ha awụsara n’ala!”+
10 Unu ndị m a na-azọ ụkwụ ka à na-azọcha ọka,Ndị dịkwa ka ọka* si n’ebe m na-azọcha ọka,+Akọọrọla m unu ihe m nụrụ n’ọnụ Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel.
11 Ihe Chineke kpebiri ime Duma:*
E nwere onye nọ na Sia na-ajụ m,+ sị:
“Onye nche, chi ọ̀ bọwala?
Onye nche, chi ọ̀ bọwala?”
12 Onye nche asị:
“Chi abọwala, chi ga-ejikwa.
Ọ bụrụ na unu chọrọ ịjụ ajụjụ, jụwanụ.
Bịanụ ọzọ.”
13 Ihe Chineke kpebiri ime ọzara:
Ndị Didan, ndị ji kamel ha na-aga njem,Unu ga-arahụ n’oké ọhịa dị n’ọzara.+
14 Ndị bi na Tima,+Kuterenụ onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri,Wetakwaranụ onye na-agba ọsọ ndụ nri ka o rie.
15 Ha gbara ọsọ n’ihi mma agha, n’ihi mma agha a mịpụtara amịpụta,N’ihi ụta e kwere ekwe nakwa n’ihi otú agha si kpụrụ ọkụ n’ọnụ.
16 Jehova gwara m, sị: “Tupu otu afọ agafee, ihe niile mere ka Kida dịrị ebube+ ga-ala n’iyi. A ga-agụ otu afọ a otú onye e goro ọrụ si agụ oge.*
17 Ndị na-agba ụta n’ime ndị agha Kida ga-afọzi ole na ole, n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke Izrel, ekwuola ya.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ O nwere ike ịbụ na Babịlonia oge ochie.
^ O nwere ike ịbụ Babịlọn.
^ Na Hibru, “ka úkwù na-egbu m ezigbo mgbu.”
^ Na Hibru, “nwa.”
^ Duma pụtara “Idere Duu.”
^ Ma ọ bụ “A ga-agụ otu afọ a otú onye e goro ọrụ si asa anya na mmiri agụ oge”; ya bụ, ọ ga-abụrịrị otu afọ ahụ.