Aịzaya 19:1-25

  • Ihe Chineke kpebiri ime Ijipt (1-15)

  • Ndị Ijipt ga-amara Jehova (16-25)

    • A ga-arụrụ Jehova ebe ịchụàjà n’Ijipt (19)

19  Ihe Chineke kpebiri ime Ijipt:+ Jehova nọ n’elu ígwé ojii nke ji ọsọ na-agbadata n’Ijipt. Chi na-abaghị uru ndị Ijipt na-efe ga-ama jijiji n’ihi ya.+ Obi ga-awụnyekwa ndị Ijipt n’afọ n’obodo ha.   “M ga-eme ka ndị Ijipt lụso ndị Ijipt agha. Ha ga-alụso ibe ha agha. Nwanne ga-alụso nwanne ya agha. Mmadụ ga-alụsokwa onye agbata obi ya agha,Obodo ga-alụso obodo ibe ya agha. Eze ga-alụsokwa eze ibe ya agha.   M ga-etigharị ndị Ijipt anya,Kụghasịakwa atụmatụ ha.+ Ha ga-agakwuru chi ndị na-abaghị uru,Ndị na-eme anwansi, ndị na-agba afa, na ndị na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.+   M ga-enyefe ndị Ijipt n’aka nna ukwu dị obi ọjọọ. Eze dị aka ike ga na-achịkwa ha.”+ Ọ bụ ezi Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru ihe a.   Oké osimiri ga-ata. Osimiri ga-atakwa, ala ya akpọọ nkụ.+   Osimiri dị iche iche ga na-esi ísì. Ọwa mmiri niile ndị na-asọnye n’osimiri Naịl dị n’Ijipt ga-ata, ala ha akpọọ nkụ. Ahịhịa amị na achara ga-erekasịkwa.+   Ihe ndị a kụrụ n’akụkụ Osimiri Naịl nakwa n’ọnụ ya ga-akpọnwụ. Ala niile a kụrụ mkpụrụ n’akụkụ Osimiri Naịl+ ga-akpọkwa nkụ.+ Ifufe ga-efesasị ihe a kụrụ na ha, ha agaghịzi adị.   Ndị ọkụ azụ̀ ga-eru uju. Ndị niile na-atụnye nko azụ̀ n’Osimiri Naịl ga-eru uju. Ndị na-agbasakwa ụgbụ azụ̀ n’elu ya ga-adịzi ole na ole.   Ihere ga-eme ndị na-eji ogho ekwe ákwà.+ Ihere ga-emekwa ndị na-ekwe ákwà ọcha. 10  Obi ga-agbawa ndị ya na-akpa ákwà. Obi agaghịkwa adị ndị ọrụ niile e goro ego mma. 11  Ndị isi Zoan+ dị nzuzu. Ndụmọdụ nke ndị kacha mara ihe n’ime ndị ndụmọdụ Fero anaghị enwe isi na ọdụ.+ Olee otú onye ọ bụla n’ime unu ga-esi asị Fero: “Abụ m nwa ndị ma ihe,Nwa ndị eze oge ochie”? 12  Fero, oleezi ebe ndị gị ma ihe nọ?+ Ka ha kọọrọ gị ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kpebiri ime Ijipt ma ọ bụrụ na ha ma. 13  Ndị isi Zoan ezuzuola nzuzu. A ghọgbuola ndị isi Nọf.*+ Ndị isi ndị Ijipt eduhiela ndị Ijipt. 14  Jehova etigharịala ha anya.+ Ndị isi ahụ eduhiela ndị Ijipt n’ihe ọ bụla ha na-eme,Otú ahụ onye mmanya na-egbu si adagharị na-azọ ụkwụ n’agbọ ọ gbọrọ. 15  E nweghị ihe ndị Ijipt ga-emeli,Ma onyeisi ma onye ọdụ, ma alaka osisi ma achara. 16  N’oge ahụ, ndị Ijipt ga-adị ka ụmụ nwaanyị. Ha ga na-ama jijiji, ụjọ ana-atụkwa ha n’ihi aka Jehova nke ụsụụ ndị agha na-atụ ha iji menye ha egwu.+ 17  Ala Juda ga-emenye ndị Ijipt ụjọ. Ụjọ ga-ejide ha ma a kọọrọ ha ya, ebe ọ bụ na ha ma ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kpebiri ime ha.+ 18  N’oge ahụ, obodo ise dị n’Ijipt ga na-asụ asụsụ ndị Kenan,+ ṅụọkwara Jehova nke ụsụụ ndị agha iyi na ha ga na-efe naanị ya. A ga-akpọ otu n’ime ha Obodo Ntida. 19  N’oge ahụ, a ga-arụrụ Jehova ebe ịchụàjà n’etiti ala ndị Ijipt, rụọkwara Jehova ogidi n’ókè Ijipt. 20  Ha ga-abụ ihe ga-eme ka ndị mmadụ na-echeta Jehova nke ụsụụ ndị agha n’Ijipt. Ha ga-arịọkwa Jehova ka ọ napụta ha n’aka ndị na-emegbu ha. Ọ ga-ezigakwara ha onye nzọpụta, bụ́ onye ukwu, onye ga-anapụta ha. 21  N’oge ahụ, Jehova ga-eme ka ndị Ijipt mara ya. Ndị Ijipt ga-amarakwa Jehova. Ha ga-achụrụ ya àjà, nyekwa ya onyinye. Ha ga-ekwe Jehova nkwa, mezuokwa ya. 22  Jehova ga-ata ndị Ijipt ahụhụ.+ Ọ ga-eti ha ihe, gwọọkwa ha. Ha ga-alọghachikwute Jehova. Ọ ga-anabata arịrịọ ha, gwọọkwa ha. 23  N’oge ahụ, a ga-enwe okporo ụzọ+ ga-esi Ijipt gaa Asiria. Ndị Asiria ga-abata n’Ijipt, ndị Ijipt abatakwa n’Asiria. Ndị Ijipt na ndị Asiria ga na-efe Chineke. 24  N’oge ahụ, ndị Izrel ga-emezu ndị Ijipt na ndị Asiria atọ.+ A ga-ejikwa ha gọzie ụwa, 25  n’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-agọzi ha, sị: “Agọziela m ndị Ijipt, bụ́ ndị m, gọzie ndị Asiria, bụ́ ọrụ aka m, gọziekwa ndị Izrel, bụ́ ndị nke m.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Memfis.”