Aịzaya 18:1-7
-
Ihe a ga-eme ndị Etiopia (1-7)
18 Ala ihe juru na ya bụ ụkpara ndị na-eme ụzụ ga-ata ahụhụ,Ya bụ, ala dị nso n’osimiri ndị dị n’Etiopia.+
2 Ọ bụ ya na-ezi ndị mmadụ ka ha si n’oké osimiriJiri ụgbọ mmiri ndị e ji ahịhịa papaịrọs rụọ gaa ebe ọ gwara ha.
Ọ gwara ha, sị: “Unu ndị ozi nwere ụkwụ ọsọ,Gakwurunụ mba e nwere ndị toro ogologo na ndị ahụ́ ha na-akwọ mụrụmụrụ,Ndị a na-atụ egwu n’ebe niile,+Mba siri ezigbo ike, nke na-emerikwa ndị ọzọ,Ndị osimiri buuru ala ha.”
3 Unu niile ndị bi n’elu ala na unu ndị bi n’ụwa.
Unu ga-ahụ ihe yiri ihe na-agba àmà e gwunyere n’elu ugwu.
Unu ga-anụkwa ụda nke na-ada ka mgbe a na-afụ opi.
4 Jehova gwara m, sị:
“M ga-anọ jụụ na-ele ebe m bi anya.*
Ọ ga-adị ka oké okpomọkụ nke na-adị ma anwụ chawa.
Ọ ga-adịkwa ka igirigi nke na-ada mgbe a na-ewe ihe ubi n’ọkọchị.
5 N’ihi na mgbe okooko osisi tozuru okè, mkpụrụ vaịn ebido chawa,Tupu e wewe ihe ubi,Mmadụ ga-ejikwa mma e ji akwa osisi gbupụ ntakịrị alaka ya,Gbupụkwa ome ya, chịfuo ha.
6 A ga-ahapụ ozu ha ka nnụnụ na-eri anụ rie ha,Hapụkwa ha ka anụ ọhịa ndị dị n’ụwa rie ha.
Nnụnụ na-eri anụ ga-anọ n’elu ha n’ọkọchị,Anụ ọhịa niile dị n’ụwa ga-anọkwa n’elu ha n’oge a na-ewe ihe ubi.
7 N’oge ahụ, a ga-ewetara Jehova nke ụsụụ ndị agha onyinye.
Ndị ga-eweta ya bụ mba e nwere ndị toro ogologo na ndị ahụ́ ha na-akwọ mụrụmụrụ,Ndị a na-atụ egwu n’ebe niile,Mba siri ezigbo ike, nke na-emerikwa ndị ọzọ,Ndị osimiri buuru ala ha.
Ha ga-eweta onyinye ahụ n’Ugwu Zayọn, ebe a na-anọ eto aha Jehova nke ụsụụ ndị agha.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ O nwere ike ịbụ, “M ga-anọ jụụ nọrọ ebe m bi na-ele anya.”