Aịzaya 17:1-14
17 Ihe Chineke kpebiri ime Damaskọs:+
“Damaskọs agaghịzi abụ obodo.
Ọ ga-abụzi ebe e bibiri ebibi.+
2 Ndị niile bi n’obodo ndị dị n’Aroa+ ga-agbapụcha.
Ebe ndị ahụ ka ìgwè anụ ga na-amakpuzi.
E nweghịkwa onye ga-emenye ha ụjọ.
3 Obodo ndị a rụsiri ike agaghịzi adị n’Ifrem.+
Alaeze dị na Damaskọs agaghịkwa adị.+
Ndị Siria fọrọnụGa-adị ebube otú ndị Izrel dị.” Ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru ihe a.
4 “N’oge ahụ, a ga-eme ka Jekọb ghara ịdịcha ebube.
A ga-emekwa ka ọ taa ahụ́.
5 Ọ ga-adị ka mgbe onye na-ewe ihe ubi na-achịkọta ọka* kwụ ọtọ,Mgbe o jikwa aka ya na-ewekọta ụyọkọ ọka.
Ọ ga-adịkwa ka mgbe mmadụ na-atụtụkọta ọka ndị a hapụrụ n’ubi dị na Ndagwurugwu Refeyim.+
6 Naanị ihe ga-afọ bụ ihe ndị a hapụrụ n’ubi,Dị ka mgbe a kụtuchara mkpụrụ dị n’osisi oliv:
Naanị mkpụrụ oliv abụọ ma ọ bụ atọ chara acha afọdụ n’alaka ya nke dị n’elu elu,Naanị mkpụrụ anọ ma ọ bụ ise afọdụ n’alaka ya ndị na-amị mkpụrụ.”+ Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru ihe a.
7 N’ụbọchị ahụ, mmadụ ga-atụkwasị Onye kere ya obi, na-atụkwa anya ka Onye Nsọ Izrel nyere ya aka.
8 Ọ gaghị atụkwasị ebe ịchụàjà o ji aka ya rụọ obi.+ Ọ gaghịkwa atụ anya ka ihe mkpịsị aka ya mere nyere ya aka, ma ogwe osisi arụsị* ma ihe ndị e ji adọsa insens.
9 N’oge ahụ, obodo ya ndị a rụsiri ike ga-adị ka ụlọ ndị a hapụrụ n’oké ọhịa.+
Ha ga-adịkwa ka alaka a hapụrụ n’ihi ndị Izrel.
Ala ya agaghịzi na-eme nri.
10 N’ihi na o chefuola Chineke+ zọpụtara ya.
O chetaghị Oké Nkume,+ bụ́ ebe ya a rụsiri ike.
Ọ bụ ya mere o ji kụọ osisi mara mma n’ubi,Kụọkwa osisi ndị mba ọzọ* na ya.
11 N’ehihie, ọ gbara ubi ya ogige nke ọma.
N’ụtụtụ, o mere ka mkpụrụ ọ kụrụ puo.
Ma, o nweghị ihe a ga-eweta n’ubi ahụ mgbe ọ na-arịa ezigbo ọrịa nakwa mgbe ya na ihe mgbu na-enweghị ngwọta na-alụ.+
12 Geenụ ntị! Ọtụtụ ndị na-agba aghara.
Ha na-agba aghara ka ebe oké osimiri na-amali elu.
Mba dị iche iche na-emekwa mkpọtụ.
Ha na-eme mkpọtụ ka ebili mmiri.
13 Mba dị iche iche ga-eme mkpọtụ ka ebili mmiri.
Chineke ga-abara ha mba, ha agbaga ebe dị anya.
A ga-achụkwa ha ọsọ otú ifufe si ebupụ mkpo ọka dị n’ugwuNakwa otú oké ifufe si eme ka ahịhịa ogwu na-agba gburugburu.
14 Mgbe chi jiri, a ga-enwe ọdachi.
Tupu chi abọọ, ndị iro agaghịzi adị.
Ihe a ka a ga-eme ndị meriri anyịNakwa ndị na-ebukọrọ ihe anyị.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “Dowekwa chi ndị mba ọzọ.”