Aịzaya 16:1-14
-
Ihe ndị ọzọ Chineke kpebiri ime ndị Moab (1-14)
16 Sinụ Sila kpụtara onye na-achị ala a ebule.
Kpụtanụ ya n’ugwu Zayọn.
Sinụ n’ụzọ ala ịkpa kpụta ya.
2 Otú ahụ ọ na-adị nnụnụ a chụpụrụ n’akwụ́ ya+Ka ọ ga-adị ndị Moab n’ebe a na-eji ụkwụ agafe mmiri Anọn.+
3 “Kwuo ihe a ga-eme. Mee ihe e kwuru na a ga-eme.
Mee ka ndò gị nke dị ka ọchịchịrị gbara n’abalị kpuchie ndị mmadụ n’etiti ehihie.
Zoo ndị a chụsara achụsa. Enyefekwala ndị na-agba ọsọ n’aka ndị na-achụ ha.
4 Moab, ka ndị m a chụsara achụsa biri na gị.
Bụrụ ebe ha ga-agbaba zoo n’ihi onye na-ebibi ihe.+
Onye na-emegbu ndị mmadụ ga-ala n’iyi.
A ga-akwụsị ibibi ihe.
A ga-ebibi ndị na-azọgbu ndị ọzọ, ha agharazie ịnọ n’ụwa.
5 Otu eze nke si n’ezinụlọ Devid ga-anọdụ n’ocheze. O nweghịkwa aka ga-akpa ọchịchị ya.
Ọ ga na-erube isi, jirikwa ịhụnanya na-achị.+
Ọ ga na-ekpe ikpe ziri ezi, na-emekwa ihe dị mma n’egbughị oge.”+
6 Anyị anụla gbasara nganga ndị Moab na-akpa. Ha dị ezigbo mpako.+
Anyị anụkwala gbasara mpako ha na nganga ha na ezigbo iwe ha na-ewe.+
Ma, ọnụ ha na-etu bụ na nkịtị.
7 Ndị Moab ga-eti mkpu ákwá n’ihi ihe ga-eme ha.
Ha niile ga-eti mkpu ákwá.+
Ndị e tiri ihe ga-ebe ákwá n’ihi keeki mkpụrụ vaịn kpọrọ nkụ si Kia-hareset.+
8 Ubi vaịn ndị dị na Heshbọn+ akpọnwụọla.
Osisi vaịn dị na Sibma akpọnwụọkwala.+
Ndị na-achị mba dị iche iche azọjiela alaka ya ndị nwere ọmarịcha mkpụrụ vaịn.
Alaka ndị ahụ gbasara ruo Jeza.+
Ha gbasara ruo n’ala ịkpa.
Ha gbasara ruodị n’oké osimiri.
9 Ọ bụ ya mere m ga-eji beere osisi vaịn dị na Sibma ákwá otú m beere Jeza.
M ga-eji anya mmiri m dee unu, Heshbọn na Iliele,+N’ihi na unu akwụsịla mkpu unu na-eti n’oge mkpụrụ osisi mịịrị unu n’ọkọchị nakwa n’oge unu na-ewe ihe ubi.*
10 Ndị nọ ebe a kụrụ mkpụrụ osisi ga-akwụsị inwe obi ụtọ na ịṅụrị ọṅụ.
O nweghị onye na-abụ abụ ma ọ bụ na-eti mkpu ọṅụ n’ubi vaịn.+
O nweghị onye na-azọcha mkpụrụ vaịn ka mmanya gbapụta n’ebe a na-azọcha ya.
N’ihi na emeela m ka a kwụsị iti mkpu.+
11 Ọ bụ ya mere obi m ji ama jijiji n’ihi Moab,+Otú ụbọ akwara si ama jijiji.
Obi na-akụkwa m kpum kpum n’ihi Kia-hareset.+
12 Ọ bụrụgodị na ndị Moab na-aga efe chi ha n’ebe dị elu ruo mgbe ike gwụrụ ha, na-agakwa ekpe ekpere n’ụlọ arụsị ha, o nweghị uru ọ ga-abara ha.+
13 Ihe a ka Jehova kwuburu gbasara Moab.
14 Ma ugbu a, Jehova kwuru, sị: “Moab dị ebube, ma a ga-eji ọgba aghara na-enweghị atụ menye ya ihere tupu afọ atọ agafee. A ga-agụ afọ atọ a otú onye e goro ọrụ si agụ oge.* Ọ bụkwa mmadụ ole na ole na-adịghị ike ga-afọ na Moab.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ O nwere ike ịbụ, “N’ihi na a na-etizi mkpu agha maka mkpụrụ osisi mịịrị unu n’oge ọkọchị nakwa n’ihi na unu na-ewe ihe ubi.”
^ Ma ọ bụ “A ga-agụ afọ atọ a otú onye e goro ọrụ si asa anya na mmiri agụ oge”; ya bụ, ọ ga-abụrịrị afọ atọ ahụ.