Aịzaya 15:1-9

  • Ihe Chineke kpebiri ime ndị Moab (1-9)

15  Ihe Chineke kpebiri ime Moab:+ Aa,+ bụ́ obodo dị na Moab, adaala jụụ,N’ihi na e bibiela ya n’otu abalị. Kia,+ bụ́ obodo dị na Moab, adaakwala jụụ,N’ihi na e bibiela ya n’otu abalị.   Ha agaala n’Ụlọ Arụsị nakwa na Daịbọn,+N’ebe ndị dị elu, ka ha bee ákwá. Moab na-ebesi ákwá ike n’ihi ihe mere Nibo+ na Medeba.+ Isi ndị niile nọ n’ime ya kwọchara akwọcha.+ A kpụrụ afụ ọnụ ọ bụla akpụ.+   Ha yi ákwà iru uju nọrọ n’okporo ámá ndị dị n’obodo ha. Ha nọ n’ámá obodo ha nakwa n’elu ụlọ ndị dị n’obodo ha na-eti mkpu ákwá. Ha begidere ákwá tụbọọ.+   Heshbọn na Iliele+ na-ebesi ákwá ike. Ndị nọ na Jehaz na-anụchadị olu ha.+ Ọ bụ ya mere ndị agha Moab ji na-eti mkpu. Ha* na-ama jijiji.   Obi agbawaala m n’ihi ihe mere Moab. Ndị si na Moab gbapụ gbaruchara Zoa+ na Eglat-shelaịshiya.+ Ha beere ákwá na-agbago Luhit. Ha na-ebesi ákwá ike maka ọdachi ahụ ka ha na-aga Họroneyim.+   Mmiri Nimrim ataala. Ahịhịa ndụ akpọnwụọla,Ahịhịa adịghịzi. E nweghịzi ihe na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ.   Ọ bụ ya mere ha ji na-eburu akụnụba ha na ihe fọrọ n’ebe ha na-akwasa ihe. Ha na-agafe ndagwurugwu osisi pọpla juru.   Ndị nọ n’obodo niile dị na Moab na-anụ mkpu ákwá a na-eti na ya.+ Ndị nọ n’Egleyim na-anụ mkpu ákwá a. Ndị nọ na Bia-ilim na-anụkwa mkpu ákwá a.   Mmiri Daịmọn bụzi ọbara ọbara. Ihe ọzọ so n’ihe Chineke ga-eme ndị Daịmọn bụNa ọdụm ga-adọri ma ndị Moab gbapụrụ agbapụMa ndị fọdụrụ n’ala ha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ha.”