Aịzaya 10:1-34

  • Ihe Chineke ga-eme ndị Izrel (1-4)

  • Chineke ga-eji ndị Asiria gosi na iwe ji ya (5-11)

  • Ahụhụ a ga-ata ndị Asiria (12-19)

  • Ndị fọrọ n’ezinụlọ Jekọb ga-alọghachi (20-27)

  • Chineke ga-ekpe ndị Asiria ikpe (28-34)

10  Ndị na-eti iwu ndị na-enye ndị ọzọ nsogbuNakwa ndị na-ede iwu ha ji emegbu ndị ọzọ ga-ata ahụhụ.+   Ha na-eme ihe ndị a iji mee ka ndị ogbenye ghara inweta ihe ruuru ha,Na iji kpee ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha so ná ndị m ikpe mkpegbu,+Nakwa iji weghara ihe ụmụ nwaanyị isi mkpe,Bukọrọkwa ihe ụmụ na-enweghị nna.*+   Gịnị ka unu ga-eme n’ụbọchị a ga-elebara unu anya,*+Mgbe a ga-esi n’ebe dị anya bịa bibie unu?+ Ònye ka unu ga-agbakwuru ka o nyere unu aka?+ Ònyekwa ka unu ga-ahapụrụ akụ̀* unu?   Ụfọdụ n’ime unu ga-eso ndị mkpọrọ hulata ala. A ga-egbukwa ndị fọrọnụ. N’ihi isi ha na-enupụ, iwe ya adajụbeghị,Kama ọ ka welitere aka ka ọ taa ha ahụhụ.+   O kwuru, sị: “Lee onye Asiria,+Onye bụ́ ụtarị m ga-eji egosi na iwe ji m.+ M ga-ejikwa mkpara o ji n’aka taa ndị mmadụ ahụhụ.   M ga-eziga ya ka ọ lụso mba kwụsịrị ife Chineke agha,+Ndị kpasuru m ezigbo iwe. M ga-agwakwa ya ka ọ kwata ọtụtụ ihe, bukọrọ ọtụtụ ihe,Zọtọọkwa ebe ahụ, ya adị ka apịtị dị n’okporo ámá.+   Ma, ọ gaghị achọ ime ihe a,Obi ya agaghịkwa abụ ime ya,N’ihi na ihe dị ya n’obi bụ ịla ihe n’iyiNakwa ibibi ọtụtụ mba, ọ bụghị mba ole na ole.   N’ihi na ọ ga-asị,‘Ọ̀ kwa ndị isi niile na-ejere m ozi bụcha ndị eze?+   Ọ̀ kwa Kalno+ dị ka Kakemish?+ Ọ̀ kwa Hemat+ dị ka Apad?+ Ọ̀ kwa Sameria+ dị ka Damaskọs?+ 10  M meriela alaeze ndị na-efe chi dị iche iche na-abaghị uru,Alaeze ndị arụsị a pịrị apị ha na-efe dị ọtụtụ karịa nke dị na Jeruselem na Sameria.+ 11  Gịnị ga-egbochi m ime Jeruselem na arụsị ndị dị na yaIhe m mere Sameria na chi dị iche iche na-abaghị uru dị na ya?’+ 12  “Jehova rụchaa ọrụ niile ọ na-arụ n’Ugwu Zayọn nakwa na Jeruselem, ọ ga-ata eze Asiria ahụhụ maka na ọ dị mpako, onwe ya na-ebukwa ya isi.+ 13  Ọ sịkwara,‘Ọ bụ ike mNa amamihe m ka m ga-eji eme ihe a, n’ihi na ama m ihe. M ga-ewepụ ókè obodo dị iche iche,+Kwakọrọkwa akụ̀ ha.+ M ga-emeri ndị bi na ha otú dike na-esi emeri obodo.+ 14  M ga-ebukọrọ akụ̀ ndị dị iche iche n’egbughị oge,Otú ahụ mmadụ na-ewere ihe dị n’akwụ́ nnụnụ n’egbughị oge. M ga-achịkọrọ ihe niile dị n’ụwa,Otú mmadụ si achịrị àkwá a hapụrụ ahapụ. E nweghị nnụnụ ga na-efegharị nku ya. E nweghịkwa nke ga-emeghe ọnụ ya ma ọ bụ bee ubé.’” 15  Anyụike ọ̀ ga-anyara onye ji ya na-egbutu ihe isi? Mma e ji akwọ osisi ọ̀ ga-eche na ya ka onye ji ya akwọ osisi? Mkpara+ ò nwere ike ịna-efegharị onye ji ya? Ka ụtarị ò nwere ike ibuli onye ji ya elu? 16  N’ihi ya, ezi Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha,Ga-eme ka ndị buru ibu n’obodo ahụ* taa ahụ́.+ Ndị Asiria agaghịzi adị ebube. Ha ga-adị ka ihe ọkụ repịara.+ 17  Ìhè na-enwu n’Izrel+ ga-aghọ ọkụ.+ Onye Nsọ Izrel ga-aghọkwa ire ọkụ. Ọkụ a ga-enwusi ike ma repịa ahịhịa na ogwu n’ala ndị Asiria n’otu ụbọchị. 18  Chineke ga-ebibikwa ọmarịcha oké ọhịa ha na ebe ha kụrụ mkpụrụ osisi dị iche iche. Ọ ga-adị ka mgbe ọrịa mere mmadụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma.+ 19  Osisi ndị fọrọ n’oké ọhịa haGa-adịzi ole na ole nke na nwatakịrị ga-agụtali ole ha dị. 20  N’ụbọchị ahụ, ndị fọrọ n’IzrelNa ndị ezinụlọ Jekọb aka na-akpaghịAgaghịzi atụkwasị mba ndị na-alụso ha ọgụ obi.+ Kama, ha ga-atụkwasị Jehova,Bụ́ Onye Nsọ Izrel, obi, na-erubekwara ya isi. 21  Ọ bụ naanị ndị fọrọnụ,Ya bụ, ndị fọrọ n’ezinụlọ Jekọb, ga-alọghachikwute Chineke bụ́ Dike.+ 22  Ndị Izrel, ọ bụ eziokwu na unu dị ọtụtụKa ájá dị n’oké osimiri,Naanị ndị fọrọ n’ime unu ga-alọta.+ Chineke ekpebiela na ọ ga-ebibi unu.+ Ihe a o kpebiri ime unu* zikwara ezi.+ 23  Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, ga-ebibi unuOtú o kpebiri ime n’obodo unu niile.+ 24  Ọ bụ ya mere Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, ji kwuo, sị: “Ndị m, ndị bi na Zayọn, unu atụla egwu onye Asiria ahụ na-apịabu unu ụtarị, onye na-ewelikwa mkpara ya elu ka o jiri ya taa unu ahụhụ+ otú ndị Ijipt mere unu.+ 25  N’oge na-adịghị anya, m ga-akwụsị iwesa unu iwe. M ga-ewesawazi ndị Asiria iwe, laakwa ha n’iyi.+ 26  Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-ewere ụtarị pịa ha,+ otú o mere mgbe o meriri ndị Midian n’akụkụ oké nkume Oreb.+ Ọ ga-agbatị mkpara ya n’elu oké osimiri, weliekwa ya elu otú o mere ndị Ijipt.+ 27  “N’ụbọchị ahụ, a ga-ebutu ibu eze Asiria bukwasịrị n’ubu unu.+ A ga-ewepụkwa yok ya dị n’olu unu.+ A ga-agbajikwa yok ahụ+ n’ihi mmanụ.”* 28  Ọ lụsola Ayat agha.+ O sila na Migrọn gafee. O busakwala ibu ya na Mikmash.+ 29  O sila n’ebe a na-eji ụkwụ agafe mmiri gafee. Ọ rahụrụ na Giba.+ Ndị Rema na-ama jijiji. Ndị Gibia,+ bụ́ ndị obodo Sọl, agbaakwala ọsọ.+ 30  Ndị Galịm, tisienụ mkpu ike. Ndị Leisha, geenụ ntị. Ndị Anatọt, unu ga-atagbu onwe unu n’ahụhụ.+ 31  Ndị Madmina agbaala ọsọ. Ndị Gibịm agala zoo. 32  Ọ ga-akwụsị na Nọb taa.+ Ọ na-echere ugwu Zayọn,Ya bụ, ugwu Jeruselem, aka mgba. 33  Ezi Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha,Na-egbukapụsị alaka osisi ka ha daa gbajisịa.+ Ọ na-egbutukwa osisi ndị kacha too ogologo,Na-emekwa ka ndị dị elu dị ala. 34  O ji anyụike* na-egbutu obere osisi ndị dị n’oké ọhịa. Onye dị ike ga-emekwa ka osisi ndị dị na Lebanọn daa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ụmụ na-enweghị nne na nna.”
Ma ọ bụ “a ga-ata unu ahụhụ.”
Ma ọ bụ “ebube.”
Ya bụ, ndị Asiria.
Ma ọ bụ “Ahụhụ a o kpebiri ịta unu.”
Mmanụ a nwere ike ịbụ ụdị nke e ji ete ndị eze mmanụ ma ọ bụkwanụ ụdị nke a na-agbanye na mpanaka.
Ma ọ bụ “ngwá ọrụ e ji ígwè kpụọ.”