Samuel nke Abụọ 2:1-32

  • Devid ghọrọ eze Juda (1-7)

  • Ish-boshet ghọrọ eze Izrel (8-11)

  • Agha ezinụlọ Devid na ezinụlọ Sọl lụrụ (12-32)

2  Mgbe e mechara, Devid jụrụ Jehova,+ sị: “Ọ̀ bụ m gaa n’otu n’ime obodo ndị dị na Juda?” Jehova asị ya: “Gawa.” Devid asị: “Olee ebe m ga-aga?” Ya asị: “Gaa Hebrọn.”+  Devid wee kpọrọ ndị nwunye ya abụọ gawa, ya bụ, Ahịnoam+ nwaanyị Jezril na Abigel+ onye Kamel, onye bụ́bu nwunye Nebal.  Devid kpọkwa ụmụ nwoke ya na ha nọ,+ onye nke ọ bụla na ezinụlọ ya, ha ebiri na Hebrọn na obodo ndị dị ya nso.  Ndị Juda bịakwara tee Devid mmanụ ebe ahụ ka ọ bụrụ eze Juda.+ Ha gwara Devid, sị: “Ọ bụ ndị Jebesh-gilied liri Sọl.”  N’ihi ya, Devid ziri ndị gara gwa ndị Jebesh-gilied, sị: “Ka Jehova gọzie unu, n’ihi na olili+ unu liri Sọl, bụ́ onyenwe unu, gosiri na unu hụrụ ya n’anya.*  Ka Jehova na-egosikwa unu na ọ hụrụ unu n’anya* mgbe niile. M ga-emekwara unu ihe ọma n’ihi ihe a unu mere.+  Ma, dịnụ ike, obi siekwa unu ike, ebe ọ bụ na Sọl onyenwe unu anwụọla, ndị Juda eteekwala m mmanụ ka m bụrụ eze ha.”  Ma Abna+ nwa Nee, bụ́ onyeisi ndị agha Sọl, kpọọrọ Ish-boshet+ nwa Sọl gaa Mahaneyim,+  meekwa ya eze ka ọ na-achị ndị Gilied,+ ndị Ashọraịt, ndị Jezril,+ ndị Ifrem,+ ndị Benjamin, nakwa ndị Izrel niile. 10  Ish-boshet, nwa Sọl, dị afọ iri anọ mgbe ọ malitere ịchị Izrel. Ọ chịkwara afọ abụọ. Ma, ndị Juda kwadoro Devid.+ 11  Devid nọkwa na Hebrọn chịa ndị Juda afọ asaa na ọnwa isii.+ 12  Ka oge na-aga, Abna nwa Nee si na Mahaneyim+ gaa Gibiọn,+ ya na ndị na-ejere Ish-boshet, nwa Sọl, ozi. 13  Joab+ nwa Zeruya+ na ndị na-ejere Devid ozi gakwara ebe ahụ, ha na Abna hà ezute n’akụkụ ọdọ mmiri Gibiọn. Ndị nke a nọ ọdụ n’otu akụkụ ọdọ mmiri ahụ, ndị nke ọzọ anọrọ ọdụ n’akụkụ nke ọzọ nke ọdọ mmiri ahụ. 14  N’ikpeazụ, Abna sịrị Joab: “Ka ụmụ okorobịa ndị a bilie, ka ha lụọ ọgụ n’ihu anyị.” Joab asị: “Ngwanụ, ka ha bilie.” 15  Ìgwè abụọ ahụ wee bilie, ìgwè nke ọ bụla ahọpụta ndị ga-alụrụ ha ọgụ, ha apụtatụ ebe ihu. Mmadụ iri na abụọ bụ ndị nke Benjamin na Ish-boshet, nwa Sọl, mmadụ iri na abụọ ọzọ abụrụ ndị na-ejere Devid ozi. 16  Ha jidekwara ibe ha n’isi, onye nke ọ bụla ana-ama onye ya na ya na-alụ ọgụ mma n’akụkụ, ha niile anwụọ. Ọ bụ ya mere e ji kpọọ ebe ahụ Helkat-hazurim. Ọ dị na Gibiọn. 17  Ọgụ ahụ bịara sie ezigbote ike n’ụbọchị ahụ. Ma n’ikpeazụ, ndị na-ejere Devid ozi meriri Abna na ndị Izrel ndị ọzọ. 18  Ụmụ Zeruya+ atọ ndị nwoke nọ ebe ahụ. Ha bụ Joab,+ Abishaị,+ na Asahel.+ Asahel na-awụ ọsọ ka ele. 19  Ọ chụwara Abna. O kweghịkwa akwụsị ịchụ ya. 20  Mgbe Abna lere anya n’azụ, ọ jụrụ Asahel, sị, “Asahel, ọ̀ bụ gịnwa?” Ya asị, “Ọ bụ m.” 21  Abna asị ya: “Kwụsị ịchụ m ma chụwa otu n’ime ụmụ okorobịa ndị ahụ. I jide ya, gị ewere ihe ọ bụla o ji.” Ma Asahel ekweghị akwụsị ịchụ ya. 22  Abna gwakwara Asahel ọzọ, sị: “Kwụsị ịchụ m, ma ọ́ bụghị ya, m ga-egbu gị. M gbuo gị, oleezi ihu m ga-eji na-ele Joab nwanne gị?” 23  Ma ọ jụrụ ịkwụsị. Abna wee maa ya isi ube n’afọ,+ ube ahụ esi ya n’azụ pụta, ya adaa, nwụọkwa ozugbo. Onye rute ebe ahụ ọ dara nwụọ, ya akwụsị, nọtụ obere, gawakwa. 24  Joab na Abishaị chụwakwara Abna. Ka anyanwụ na-ada, ha rutere n’ugwu Ama, nke chere Gaya ihu n’ụzọ e si aga ala ịkpa Gibiọn. 25  Ndị Benjamin wee zukọọ ebe ahụ Abna nọ, ha abụrụ otu ìgwè ma guzoro n’elu otu ugwu. 26  Abna wee kpọọ Joab, sị ya: “Ànyị ga-eji mma agha na-egburịta ibe anyị ruo mgbe ebighị ebi? Ọ̀ bụ na ị maghị na naanị ihe ọ ga-akpatara anyị niile bụ obi mgbawa? Olee mgbe ọ ga-eru gị agwa ndị nke gị ka ha kwụsị ịchụ ụmụnne ha?” 27  Joab asị: “Eji m ezi Chineke dị ndụ na-aṅụ iyi na a sị na i kwughị okwu, ndị nke m agaraghị akwụsị ịchụ ụmụnne ha ruo n’ụtụtụ.” 28  Joab wee fụọ opi, ndị agha ya akwụsị ịchụ ndị Izrel, ọgụ ahụ akwụsịkwa. 29  Abna na ndị ya na ha so ji abalị ahụ niile gara ije si n’Araba+ gafee Osimiri Jọdan, gafeekwa ndagwurugwu ya niile, rutezie Mahaneyim.+ 30  Mgbe Joab kwụsịrị ịchụ Abna, ọ kpọkọtara ndị nke ya niile. Ndị nwụrụnụ n’ime ndị na-ejere Devid ozi dị mmadụ iri na itoolu, n’agụnyeghị Asahel. 31  Ma ndị na-ejere Devid ozi meriri ndị Benjamin bụ́ ndị nke Abna. Ha gburu narị mmadụ atọ na iri isii (360) n’ime ha. 32  Ha buuru Asahel+ gaa Betlehem, lie ya ebe e liri nna ya.+ Joab na ndị ya na ha so jikwa abalị ahụ niile gaa ije ma ruo Hebrọn+ mgbe chi bọrọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “unu gosiri ya ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “na-egosikwa unu ịhụnanya pụrụ iche.”