Samuel nke Abụọ 19:1-43

  • Devid ruuru Absalọm uju (1-4)

  • Joab baara Devid mba (5-8a)

  • Devid laghachiri Jeruselem (8b-15)

  • Shimiaị rịọrọ Devid ka ọ gbaghara ya (16-23)

  • Devid chọpụtara na aka Mefiboshet dị ọcha (24-30)

  • Devid gọziri Bazilaị (31-40)

  • Ebo iri n’Izrel wesara ebo Juda iwe (41-43)

19  A kọọrọ Joab, sị: “Eze na-ebe ákwá, na-erukwara Absalọm uju.”+  N’ụbọchị ahụ, mmadụ niile kwụsịrị ịṅụrị ọṅụ na ha meriri, na-eruzi uju, n’ihi na ha nụrụ na eze nọ na-eru uju ọnwụ nwa ya.  Ahụ́ jụziri ndị gara agha ahụ oyi ka ha na-abata n’obodo+ n’ụbọchị ahụ, otú ọ na-ajụ ndị agha ihere na-eme maka na ha gbara ọsọ n’ihu agha.  Eze kpuchikwara ihu ya, na-ebe ákwá, na-etikwa mkpu, sị: “Absalọm nwa m! Absalọm nwa m, nwa m!”+  Joab gakwuziiri eze n’ụlọ ọ nọ, sị ya: “I menyela ndị niile na-ejere gị ozi ihere taa. Ọ bụ ha zọrọ gị ndụ taa, zọọkwa ụmụ gị ndị nwoke+ na ụmụ gị ndị nwaanyị+ na ndị nwunye gị nakwa ndị iko gị.+  Ị hụrụ ndị kpọrọ gị asị n’anya, kpọọkwa ndị hụrụ gị n’anya asị. I meela ka o doo anya taa na ndị i mere ndị isi nakwa ndị na-ejere gị ozi abaraghị gị uru ọ bụla, n’ihi na m ma na obi gaara adị gị mma ma a sị na Absalọm dị ndụ taa, anyịnwa anwụchaa.  Ugbu a, bilie, pụọ n’èzí gwa ndị na-ejere gị ozi okwu ga-agba ha ume, n’ihi na m ji aha Jehova na-aṅụ iyi na ọ bụrụ na ị pụghị, o nweghịzi onye gị na ya ga-anọ n’abalị a. Ọ ga-adịkwara gị njọ karịa ihe niile merela gị kemgbe ị bụ nwata ruo ugbu a.”  Eze wee bilie gaa nọrọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ. A gwakwara mmadụ niile, sị: “Eze nọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ámá.” Ha niile abịa n’ihu eze. Ma onye ọ bụla n’ime ndị Izrel ndị nke ọzọ gbalara n’ụlọ ya.+  Ebo niile n’Izrel nọ na-eserịta okwu, na-asị: “Eze napụtara anyị n’aka ndị iro anyị.+ Ọ napụtara anyị n’aka ndị Filistia. Ma ugbu a, ọ gbapụla n’ala a n’ihi Absalọm.+ 10  Ma Absalọm, onye anyị tere mmanụ ka ọ chịwa anyị,+ anwụọla n’agha.+ Gịnịzi mere na o nweghị mbọ anyị na-agba ịga kpọlata eze?” 11  Eze Devid ziri Zedọk+ na Abayata+ bụ́ ndị nchụàjà ozi, sị: “Gwanụ ndị okenye Juda,+ sị, ‘Ebo ndị ọzọ niile n’Izrel eziela eze ka ọ lọta n’ụlọ ya. Gịnị mere ununwa ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ga-ezi eze ka ọ lọta n’ụlọ ya? 12  Unu bụ ụmụnne m. Mụ na unu bụkwa otu ọbara.* Gịnịzi mere unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ga-ezi eze ka ọ lọta?’ 13  Gwakwanụ Amesa,+ sị, ‘Ọ̀ bụ na mụ na gị abụghị otu ọbara? Ka Chineke taa m ahụhụ, ka ọ tasiekwa m ahụhụ ike ma ọ bụrụ na mụ emeghị gị onyeisi ndị agha m ka ị nọchie Joab si ugbu a gawa.’”+ 14  Otú a ka o si nweta obi ndị Juda niile, ha ezie eze, sị: “Gị na ndị niile na-ejere gị ozi lọtawa.” 15  Eze wee lawa. Mgbe o ruru n’Osimiri Jọdan, ndị ebo Juda bịara na Gilgal+ ka ha zute ya nakwa ka ha duru ya gafee Osimiri Jọdan. 16  Shimiaị+ nwa Gira, onye Bahurim dị n’ebo Benjamin, mere ngwa ngwa soro ndị Juda gaa izute Eze Devid. 17  Otu puku (1,000) ụmụ nwoke, ndị si n’ebo Benjamin, sokwa ya. Zaịba+ onye na-ejere ndị ezinụlọ Sọl ozi na ụmụ ya ndị nwoke iri na ise, na mmadụ iri abụọ na-ejere ya ozi, emeelarị ọsọ ọsọ buru eze ụzọ ruo n’Osimiri Jọdan. 18  Ọ* gafere ebe a na-eji ụkwụ agafe mmiri ka o nwee ike dufeta ezinụlọ eze, meekwara eze ihe ọ bụla ọ chọrọ. Ma mgbe eze na-achọ ịgafe Osimiri Jọdan, Shimiaị nwa Gira daara ya n’ala. 19  Ọ sịrị eze: “Ka onyenwe m gbaghara m mmehie m. Echetakwala ihe ọjọọ ohu gị mere+ ụbọchị ahụ onyenwe m eze si na Jeruselem pụọ. Biko, ka eze ghara iburu ya n’obi. 20  Mụnwa bụ́ ohu gị ma nke ọma na ihe m mere adịghị mma. Ọ bụ ya mere m ji bụrụ onye mbụ si n’ụlọ Josef niile bịa izute onyenwe m eze.” 21  Ozugbo ahụ, Abishaị+ nwa Zeruya+ asị: “Ọ̀ bụ na e kwesịghị igbu Shimiaị maka iyi ọ kpọrọ onye Jehova tere mmanụ?”+ 22  Ma Devid sịrị: “Olee otú ihe a si gbasa unu, ụmụ Zeruya,+ nke mere unu ji achọ taa ka e mee ihe m na-achọghị? È kwesịrị igbu onye ọ bụla taa n’Izrel? Ọ̀ bụ na mụ abụrụghachibeghị eze Izrel taa?” 23  Eze sịziri Shimiaị: “Ị gaghị anwụ.” Ọ ṅụkwaara ya iyi.+ 24  Mefiboshet+ nwa nwa Sọl bịakwara izute eze. Malite ụbọchị eze pụrụ ruokwa ụbọchị ọ lọtara n’udo, Mefiboshet asaghị ụkwụ ya. Ọ kpụghịkwa afụ ọnụ ya. Ọ saghịkwa uwe ya mmiri. 25  Mgbe ọ bịara izute eze na Jeruselem,* eze jụrụ ya, sị: “Mefiboshet, gịnị mere na i soghị m gbapụ?” 26  Ya asị: “Onyenwe m eze, ị manụ na ohu gị dara ngwọrọ.+ M gwara onye na-ejere m ozi ka o dokwasịrị m ihe m ji anọkwasị n’elu jakị m ka m gbara ya soro eze gbapụ. Ma ọ ghọgburu m.+ 27  Ọ bịara n’ihu gị onyenwe m eze, ghagide mụnwa bụ́ ohu gị ụgha.+ Ma, onyenwe m eze dị ka mmụọ ozi nke ezi Chineke. N’ihi ya, mee ihe dị mma n’anya gị. 28  Gịnwa bụ́ onyenwe m eze gaara egbu mmadụ niile nọ n’ezinụlọ nna m ma a sị na ị chọrọ. Ma, ị kpọtara ohu gị ka m soro ná ndị gị na ha na-erikọ nri.+ Oleezi ihe mere m ga-eji rịọ eze ka o meere m ihe ọzọ?” 29  Ma eze sịrị ya: “O zuola. Ekpebiela m na gị na Zaịba ga-eke ala ahụ.”+ 30  Mefiboshet asị eze: “Ya werechaa ya. Otú a onyenwe m eze lọtara n’ụlọ ya n’udo ezuorola m.” 31  Bazilaị+ onye Gilied sikwa Rogilim bịa zute eze ebe dị nso n’Osimiri Jọdan. Ọ bịara ka o duruo ya n’Osimiri Jọdan. 32  Bazilaị emeela ezigbo agadi. Ọ dị afọ iri asatọ. Ọ bụkwa ya nọ na-enye eze nri mgbe ọ nọ na Mahaneyim,+ n’ihi na ọ bara ezigbo ọgaranya. 33  Eze sịrị Bazilaị: “Soro m ka anyị laa Jeruselem. Mụ na gị ga na-erikọkwa nri ebe ahụ.”+ 34  Ma Bazilaị sịrị eze: “Ọ̀ fọkwaaranụ m afọ ole ná ndụ mere m ga-eji soro eze lawa Jeruselem? 35  Adị m afọ iri asatọ taa.+ M̀ ga-amatali ihe bụ́ ihe ọma na ihe bụ́ ihe ọjọọ? Mụnwa, bụ́ ohu gị, m̀ ka nwere ike ịma otú ihe m riri na ihe m ṅụrụ si atọ? M̀ ka ga-anụli olu ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-abụ abụ?+ Gịnịzi mere ohu gị ga-eji mee ka ibu onyenwe m eze bu hikwuo nne? 36  Eze, i kwesịghị ịkwụ m ụgwọ ọ bụla. M duruhaala gị n’Osimiri Jọdan, o zuorola m. 37  Biko, hapụ ohu gị ka ọ lawa. Ka m nọrọ n’obodo m nwụọ n’akụkụ ebe e liri nne m na nna m.+ Ma, lekwa Kimham ohu gị.+ Ka o soro gị lawa, onyenwe m eze. Meekwara ya ihe ọ bụla dị gị mma.” 38  Eze wee sị: “Kimham ga-eso m laa. M ga-emekwara ya ihe dị gị mma. M ga-emere gị ihe ọ bụla ị chọrọ ka m meere gị.” 39  Mmadụ niile wee malite ịgafe Osimiri Jọdan. Mgbe eze na-agafe, o susuru Bazilaị ọnụ,*+ gọziekwa ya. Bazilaị laghachikwara obodo ya. 40  Mgbe eze gafere osimiri ahụ ruo Gilgal,+ Kimham so ya gafee. Ndị Juda niile nakwa ọkara ndị Izrel sokwa eze gafee.+ 41  Ndị Izrel niile mechakwara bịakwute eze, jụọ ya, sị: “Gịnị mere ụmụnne anyị ndị Juda ji bịa na nzuzo duru Eze Devid na ezinụlọ ya na ndị niile na-ejere ya ozi gafee Osimiri Jọdan?”+ 42  Ndị Juda niile asị ndị Izrel ndị ọzọ: “Ọ bụ n’ihi na eze bụ onye ikwu anyị.+ Oleekwanụ ihe unu na-ewere iwe n’ihe a? Ò nweela ihe si n’akpa eze anyị riri? Ka è nyere anyị onyinye maka ya?” 43  Ma, ndị Izrel ndị ọzọ sịrị ndị Juda: “Anyị dị ebo iri. N’ihi ya, anyị ka unu nwere Devid. Gịnịzi mere unu ji lelịa anyị anya? Ọ bụ anyị kwesịrị ịbụ ndị mbụ ga-aga kpọlata eze anyị.” Ma ọnụ ndị Juda bịara karịa nke ndị Izrel ndị ọzọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “otu ọkpụkpụ na otu anụ ahụ́.”
O nwere ike ịbụ, “Ha.”
O nwere ike ịbụ, “Mgbe o si na Jeruselem bịa izute eze.”
Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.