Samuel nke Abụọ 11:1-27

  • Devid na Bat-shiba kwara iko (1-13)

  • Devid kpara nkata ka e gbuo Yuraya (14-25)

  • Devid kpọọrọ Bat-shiba lụwa (26, 27)

11  Ná mmalite afọ, n’oge ndị eze na-eji aga agha, Devid ziri Joab na ndị na-ejere ya ozi nakwa ndị agha niile e nwere n’Izrel ka ha gaa gbuo ndị Amọn. Ha nọchibidokwara Raba.+ Ma Devid nọ na Jeruselem.+  Ná mgbede otu ụbọchị, Devid biliri n’àkwà* ya, na-ejegharị n’elu ụlọ n’obí ya. Ọ nọkwa n’elu ụlọ ahụ hụ otu nwaanyị na-asa ahụ́. Nwaanyị ahụ makwara ezigbo mma.  Devid wee zie mmadụ ka ọ gaa jụta onye nwaanyị ahụ bụ. Onye ahụ asị ya: “Nwaanyị ahụ bụ Bat-shiba+ nwa Elayam,+ nwunye Yuraya+ onye Het.”+  Mgbe e mechara, Devid ziri ndị mmadụ ka ha gaa kpọta ya.+ Nwaanyị ahụ bịakwutekwara ya, ya na ya edinaa.+ (Ihe a mere oge nwaanyị a na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha.*)+ Nwaanyị a mechakwara laghachi n’ụlọ ya.  O mechara dị ime, ziekwa Devid na ya dị ime.  Devid wee zie Joab, sị: “Zitere m Yuraya onye Het.” Joab wee zie Yuraya ka ọ gaa hụ Devid.  Mgbe Yuraya bịakwutere Devid, ọ jụrụ ya otú Joab na ndị agha Izrel mere nakwa otú agha si aga.  Ọ gwaziri Yuraya, sị: “Gaa zuo ike n’ụlọ gị.”* Mgbe Yuraya si n’ụlọ eze pụọ, e ji onyinye* eze sị ka e nye ya sochie ya azụ.  Ma, Yuraya alaghị n’ụlọ ya. Kama o so ndị ọzọ niile na-ejere onyenwe ya ozi hie n’ebe e si abanye n’ụlọ eze. 10  A gwaziri Devid, sị: “Yuraya alaghị n’ụlọ ya.” Devid asị Yuraya: “Ọ̀ kwa i si esi bata? Gịnị mere na ị laghị n’ụlọ gị?” 11  Yuraya asị Devid: “Igbe Chineke,+ ndị Juda, na ndị Izrel ndị ọzọ nọ n’ụlọ ndò, onyenwe m Joab na ndị na-ejere ya ozi makwara ụlọikwuu ha n’ọhịa. Oleezi otú m ga-esi gaa n’ụlọ m ka m rie ihe, ṅụọkwa mmanya nakwa ka mụ na nwunye m dinaa?+ Ana m aṅụrụ gị iyi na m gaghị eme ihe a!” 12  Devid gwaziri Yuraya, sị: “Nọkwuo ebe a taa, echi m ga-ahapụ gị ka ị gawa.” Yuraya wee nọrọ na Jeruselem n’ụbọchị ahụ, nọrọkwa chi abọọ. 13  Devid kpọkwara ya ka ọ bịa soro ya rie ihe, ṅụọkwa mmanya. Mgbe ọ bịara, o mere ka ọ ṅụfee mmanya ókè. Ma mgbe chi jiri, ọ laghị n’ụlọ ya, kama, ọ gara soro ndị na-ejere onyenwe ya ozi hie, dinara ebe ọ na-adị edina. 14  Mgbe chi bọrọ, Devid deere Joab akwụkwọ ozi ma nye ya Yuraya ka o nye ya. 15  Ihe o dere n’akwụkwọ ozi ahụ bụ: “Ziga Yuraya n’ihu agha, ebe agha kpụ ọkụ n’ọnụ, hapụkwanụ ya ebe ahụ laa azụ ka e nwee ike gbuo ya.”+ 16  Mgbe Joab na ndị agha ya gbara obodo ahụ gburugburu ka ha lụso ya agha, o zigara Yuraya ebe ọ ma na ndị bụ́ dike n’agha nọ. 17  Mgbe ụmụ nwoke obodo ahụ pụtara ka ha lụso Joab agha, ha gburu ụfọdụ ndị na-ejere Devid ozi. Yuraya onye Het sokwa ná ndị ha gburu.+ 18  Joab zikwara mmadụ ka ọ gaa kọọrọ Devid ihe niile gbasara agha ahụ. 19  Ọ gwara onye ahụ, sị: “Ị kọchaara eze ihe niile gbasara agha a, 20  o nwere ike iwe iwe. O nwekwara ike ịjụ gị, sị, ‘Gịnị mere unu ji ruo obodo ahụ ezigbo nso mgbe unu na-alụso ya agha? Ùnu amaghị na ha ga-anọ n’elu mgbidi na-agba unu ụta? 21  Ònye gburu Abimelek+ nwa Jerubeshet?+ Ọ́ bụghị otu nwaanyị nke nọ n’elu mgbidi na Tibez ji nkume e ji egwe nri tụgbuo ya? Gịnị mere unu ji ruo mgbidi ahụ ezigbo nso?’ Gwazie ya sị, ‘Yuraya onye Het na-ejere gị ozi so ná ndị nwụrụ.’” 22  Onye ahụ Joab ziri ozi gara zie Devid ihe niile Joab ziri ya. 23  Ọ gwara Devid, sị: “Ndị ahụ bịara kara anyị ike. Ha bịara lụso anyị agha n’ọhịa. Ma anyị chụghachiri ha azụ, chụrụ ha ruo n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ. 24  Ndị na-agba ụta wee nọrọ n’elu mgbidi na-agba ndị na-ejere gị ozi ụta. Ụfọdụ n’ime ndị na-ejere eze ozi nwụkwara. Yuraya onye Het na-ejere gị ozi sokwa ná ndị nwụrụ.”+ 25  Devid asị ya: “Gwa Joab ka ọ ghara isogbu onwe ya maka ihe a merenụ, n’ihi na o nweghị onye na-enweghị ike ịnwụ n’agha. Gwakwa ya ka ọ lụsie agha ike ma merie obodo ahụ.+ Gbaakwa ya ume.” 26  Mgbe nwunye Yuraya nụrụ na Yuraya di ya anwụọla, ọ malitere iruru ya uju. 27  Ozugbo oge iruru ya uju gachara, Devid ziri ozi ka a kpọta nwunye Yuraya, a kpọta ya n’ụlọ ya, ya aghọọ nwunye ya,+ mechaakwa mụọrọ ya nwa nwoke. Ma ihe a Devid mere were Jehova ezigbo iwe.*+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
O nwere ike ịbụ mgbe oge ọ nọ ná nsọ ka gachara.
Na Hibru, “Gaa saa ụkwụ n’ụlọ gị.”
Ya bụ, onyinye mmadụ na-enye onye bụ́ nnukwute ọbịa ya.
Na Hibru, “dị njọ n’anya Jehova.”