Ndị Eze nke Abụọ 4:1-44

  • Ịlaịsha mere ka mmanụ nwaanyị isi mkpe mụbaa (1-7)

  • Nwaanyị Shunem lere Ịlaịsha ọbịa (8-16)

  • E ji nwa nwoke kwụọ otu nwaanyị ụgwọ ihe ọma o mere, nwa ahụ emechaa nwụọ (17-31)

  • Ịlaịsha kpọlitere nwa ahụ nwụrụ anwụ (32-37)

  • Ịlaịsha mere ka ofe dị mma ọrịra (38-41)

  • Ịlaịsha mere ka achịcha mụbaa (42-44)

4  Nwunye otu n’ime ụmụ ndị amụma+ gwara Ịlaịsha, sị: “Di m bụ́ ohu gị anwụọla. O dokwara gị anya na ọ na-atụ egwu Jehova+ mgbe ọ nọ ndụ. Ma ugbu a, onye anyị ji ụgwọ abịala ka ọ kpọrọ ụmụ m abụọ ka ha gbawara ya ohu.”  Ịlaịsha asị ya: “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị? Gwa m, gịnị ka i nwere n’ụlọ?” Ya asị: “Ohu gị nwaanyị enweghị ihe ọ bụla n’ụlọ ma e wezụga otu ite mmanụ.”+  Ịlaịsha asị ya: “Gaa na nke ndị agbata obi gị niile rịọta ha ite ndị ihe na-adịghị. Nata ha ole ọ bụla ị ga-anatali ha.  Ị lọta, gị na ụmụ gị banye n’ụlọ mechie ụzọ. Gbanyewenụ mmanụ n’ite ndị ahụ niile, dọsakwanụ ndị juru n’ọnụ iche.  Nwaanyị ahụ lawakwara. Mgbe ya na ụmụ ya banyere n’ụlọ mechie ụzọ, ha nọ na-ewetara ya ite ndị ha rịọtara, ya ana-agbanye mmanụ na ha.+  Mgbe ite ndị ahụ juru n’ọnụ, ọ gwara otu n’ime ụmụ ya, sị: “Wetara m ite ọzọ.”+ Ma ọ sịrị ya: “E nweghịzi ite dịnụ.” Mgbe o kwuchara ihe a, mmanụ ahụ kwụsịrị ịgbapụta.+  Ọ gakwara kọọrọ onye nke ezi Chineke, ya asị: “Gaa ree mmanụ ahụ, kwụọ ụgwọ i ji. Gị na ụmụ gị jirikwa ego fọrọnụ na-eri nri.”  O nwere otu ụbọchị Ịlaịsha gara Shunem,+ otu nwaanyị a ma ama ebe ahụ arịọ ya ka o rie nri na nke ya.+ Ọ na-abụzi mgbe ọ bụla ọ na-agafe, ya abanye ebe ahụ rie nri.  Nwaanyị ahụ mechara gwa di ya, sị: “O doro m anya na nwoke a na-agafe ebe a mgbe niile bụ onye nsọ na-ejere Chineke ozi. 10  Biko, ka anyị rụọ otu obere ọnụ ụlọ n’elu ụlọ a+ ma dọwa otu àkwà,* otu tebụl, otu oche, na otu ihe e ji adọsa ọkụ* ebe ahụ. Mgbe ọ bụla ọ bịara na nke anyị, o nwere ike gaa nọrọ ebe ahụ.”+ 11  Otu ụbọchị, Ịlaịsha gara ebe ahụ, banye n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu ụlọ ka o dinara ala. 12  Ma ọ sịrị Gehezaị+ bụ́ onye na-ejere ya ozi: “Kpọọrọ m nwaanyị Shunem ahụ.”+ Gehezaị agaa kpọọ ya, ya abịakwute Ịlaịsha. 13  Ịlaịsha asị Gehezaị: “Biko, gwa ya, sị, ‘Ị gbaalara anyị nnukwu mbọ.+ Gịnị ka anyị ga-emere gị?+ Ò nwere ihe m ga-agwara gị eze+ ma ọ bụ onyeisi ndị agha?” Nwaanyị ahụ asị: “Mba, enweghị m nsogbu ọ bụla, n’ihi na mụ na ndị m bi.” 14  Ịlaịsha asị: “Gịnịzi ka a ga-emere ya?” Gehezaị asị: “Ọ mụtaghị nwa,*+ di ya emeekwala agadi.” 15  Ya asị ya ozugbo ahụ: “Kpọọ ya.” Ya agaa kpọọ ya, nwaanyị ahụ abịa guzoro n’ọnụ ụzọ. 16  Ịlaịsha asị: “N’ụdị oge a n’afọ ọzọ, ị ga-amụ nwa nwoke.”+ Ma ọ sịrị: “Mbanụ, nna m ukwu, ị bụ onye nke ezi Chineke, agharala nwaanyị na-ejere gị ozi ụgha.” 17  Ma, nwaanyị ahụ mechara dịrị ime, mụọkwa nwa nwoke n’ụdị oge ahụ n’afọ sochiri ya, otú Ịlaịsha gwara ya. 18  Nwata ahụ nọkwa na-eto. Ma otu ụbọchị, ọ gakwuuru nna ya ebe ya na ndị na-ewe ihe ubi nọ. 19  Ọ nọkwa na-asị nna ya: “Isi m o, isi m o!” Nna ya asị onye na-ejere ya ozi: “Kugara ya nne ya.” 20  O wee kugara ya nne ya, nne ya ekuru ya ruo mgbe ọ nwụrụ+ n’ehihie. 21  O kukwaara ya gbagoo elu, nyiwe ya n’àkwà* onye nke ezi Chineke,+ mechie ụzọ pụọ. 22  Ọ kpọkwara di ya, sị: “Biko, gwa otu n’ime ndị na-ejere anyị ozi ka ọ bịa, kpụtakwara m otu n’ime jakị anyị ka m gbara ya gakwuru onye nke ezi Chineke ma lọghachi.” 23  Ma ọ sịrị: “Gịnị mere i ji chọọ ịga hụ ya taa? Taa abụghị ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ,+ ọ bụghịkwa ụbọchị izu ike.” Ma, nwaanyị ahụ sịrị: “Nsogbu adịghị.” 24  O wee dowe ihe ọ ga-eji nọrọ n’elu jakị ma sị onye na-ejere ya ozi: “Gbara gawa ọsọ ọsọ. Ejikwala maka m gbawa nwayọọ nwayọọ, ọ gwụla ma m̀ gwara gị jiri nwayọọ.” 25  Otú a ka o si gawa na nke onye nke ezi Chineke n’Ugwu Kamel. Ozugbo onye nke ezi Chineke hụrụ ya mgbe ọ ka nọ ebe dị anya, ọ gwara Gehezaị, bụ́ onye na-ejere ya ozi, sị: “Lee nwaanyị Shunem ka ọ na-abịa. 26  Biko, gbara gakwuru ya ma jụọ ya, sị, “Ahụ́ ọ̀ dịkwa gị? Ahụ́ ọ̀ dịkwa di gị? Ahụ́ ọ̀ dịkwa nwa gị?’” Nwaanyị ahụ asị: “Nsogbu adịghị.” 27  Mgbe ọ bịakwutere onye nke ezi Chineke n’ugwu ahụ, o jidere ya n’ụkwụ+ ozugbo, Gehezaị abịa ka ọ kwapụ ya, ma onye nke ezi Chineke sịrị: “Hapụ ya, n’ihi na o nwere ihe na-enye ya nsogbu n’obi. Ma, amaghị m ihe ọ bụ, maka na Jehova agwaghị m ya.” 28  Nwaanyị ahụ asị ya: “Ò nwere mgbe m rịọrọ onyenwe m ka o nye m nwa? Ọ̀ kwa m gwara gị, sị, ‘Emela ka m tụwa anya ihe na-agaghị eme eme’?”+ 29  Ịlaịsha sịrị Gehezaị ozugbo ahụ: “Kesie ákwà gị ike n’úkwù,+ werekwa mkpara m gawa n’ụlọ nwaanyị a. Ọ bụrụ na ị hụ onye ọ bụla n’ụzọ, ekelela ya. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla ekelee gị, atụpụrụla ya ọnụ. Ị garuo, tụkwasị mkpara m n’ihu nwatakịrị nwoke ahụ.” 30  Nne nwa ahụ asị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi na agaghị m ahapụ gị.”+ Ihe a meziri ka o bilie soro ya gawa. 31  Ma, Gehezaị bu ha ụzọ gawa. Mgbe o ruru, ọ tụkwasịrị mkpara ahụ n’ihu nwa ahụ, ma nwa ahụ ekwughị okwu, o meghịkwa ụṅara.+ Gehezaị laghachiri hụ Ịlaịsha ma gwa ya, sị: “Nwa ahụ etetaghị.” 32  Mgbe Ịlaịsha batara n’ụlọ ahụ, ọ hụrụ ozu nwa ahụ n’elu àkwà* ya.+ 33  Ọ banyere, mechie ụzọ. Naanị ha abụọ nọkwa n’ọnụ ụlọ ahụ, ya amalite ịrịọ Jehova ka o nyere ya aka.+ 34  Ọ gara dinara n’elu nwata ahụ, ọnụ ya adịrị n’ọnụ nwata ahụ, anya ya adịrị n’anya ya, ọbụ aka ya adịrịkwa n’ọbụ aka ya, ya agbatịa onwe ya n’elu ya, ahụ́ nwata ahụ ebido kpowe ọkụ.+ 35  Ọ nọkwa na-agagharị n’ụlọ ahụ, ya gaa ebe a, ya agaa ebe a. O sikwa n’àkwà ahụ bilie, gbatịakwa onwe ya ọzọ n’elu nwa ahụ, nwa ahụ ezee uzere ugboro asaa, meghee anya ya.+ 36  Ịlaịsha kpọkwara Gehezaị, sị ya: “Kpọọ nwaanyị Shunem ahụ.” Ya akpọọ ya, nwaanyị ahụ abịakwute ya. Ịlaịsha asị ya: “Kpọrọ nwa gị.”+ 37  Nwaanyị ahụ wee bata, gbuo ikpere n’ala n’ihu ya, kpọọ isiala, ma kpọrọ nwa ya pụọ. 38  Mgbe Ịlaịsha laghachiri Gilgal, ụnwụ dị n’ala ahụ.+ Ka ụmụ ndị amụma+ nọ ọdụ n’ihu ya, ọ gwara onye na-ejere ya ozi,+ sị: “Sinye nnukwu ite n’ọkụ ma siere ụmụ ndị amụma ofe.” 39  Otu n’ime ha gawara n’ọhịa ka ọ ghọrọ mkpụrụ malo, ma ọ hụrụ aṅara ọhịa, ghọwa ya, ghọjuo uwe ya. Mgbe ọ lọtara, o biri ha wụnye n’ite ofe, ma ọ maghị ihe ha bụ. 40  Ha mechara kupụtara ya ụmụ ndị amụma ka ha rachaa, ma ozugbo ha ratụrụ ofe ahụ, ha tiri mkpu, sị: “Onye nke ezi Chineke, nsí dị n’ite a.” O kweghị ha ọrịra. 41  Ịlaịsha asị ha: “Kpoterenụ m ntụ ọka.” Mgbe ha kpotere ya, ọ wụnyere ya n’ite ahụ, sị: “Kupụtaranụ ya ụmụ ndị amụma ka ha rachaa.” O nweghịzi ihe na-egbu egbu dị n’ite ahụ.+ 42  Otu nwoke mechara si Bel-shalisha+ bịa. O buteere onye nke ezi Chineke ogbe achịcha iri abụọ e ji ọka bali mee.+ Ọka bali a si ná mkpụrụ mbụ kara aka. O butekwaara ya otu akpa ọka bali ọhụrụ.+ Ịlaịsha asị ya: “Bunye ya ndị a ka ha rie.” 43  Ma, onye na-ejere ya ozi sịrị: “Ọ̀ bụ obere ihe a ka m ga-ebunye otu narị (100) ụmụ nwoke?”+ Ya asị ya: “Bunye ha ya ka ha rie, n’ihi na Jehova kwuru, sị, ‘Ha ga-eri ya rijuo afọ, ya afọkwa.’”+ 44  O bupụtaziiri ha ya, ha erie, rijuo afọ, ya afọkwa+ otú Jehova kwuru.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Na Hibru, “nwa nwoke.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “ihe ndina.”