Ndị Eze nke Abụọ 19:1-37

  • Hezekaya si n’aka Aịzaya rịọ Chineke ka o nyere ya aka (1-7)

  • Senakerib bara mba ihe ha ga-eme ndị bi na Jeruselem (8-13)

  • Ekpere Hezekaya kpere (14-19)

  • Aịzaya gwara Hezekaya ihe Chineke kwuru (20-34)

  • Otu mmụọ ozi gburu ndị Asiria dị 185,000 (35-37)

19  Ozugbo Eze Hezekaya nụrụ ihe a, ọ dọwara uwe ya, chịrị ákwà iru uju kpuchie onwe ya ma banye n’ụlọ Jehova.+  Ọ gwaziri Elayakim, bụ́ onye na-elekọta ezinụlọ* ya, Shebna bụ́ odeakwụkwọ, na ndị okenye bụ́ ndị nchụàjà, ka ha gakwuru Aịzaya onye amụma+ bụ́ nwa Emọz. Ha niile ji ákwà iru uju kpuchie onwe ha.  Mgbe ha garuru, ha sịrị ya: “Hezekaya sịrị anyị gwa gị, sị, ‘Taa bụ ụbọchị nsogbu na nke ịba mba* nakwa nke imenye ihere, n’ihi na anyị dị ka nwaanyị ime na-eme, nke ike ịmụpụta nwa na-adịghị.+  O nwere ike bụrụ na Jehova bụ́ Chineke gị nụrụ ihe niile Rabshake kwuru, onye eze Asiria onyenwe ya ziri ka ọ bịa kwaa Chineke dị ndụ emo.+ Jehova bụ́ Chineke gị ga-atakwa ya ahụhụ maka ihe ndị ahụ ọ nụrụ. N’ihi ya, kpeere anyịnwa fọrọ n’obodo a ekpere.’”+  Mgbe ndị na-ejere Eze Hezekaya ozi zichara Aịzaya ozi a,+  Aịzaya sịrị ha: “Gwanụ onyenwe unu, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “Atụla egwu+ maka nkwulu a ị nụrụ ndị na-ejere eze Asiria ozi kwuluru m.+  M ga-eme ka otu ihe gbata ya n’obi.* Ọ ga-anụkwa otu akụkọ ga-eme ka ọ laghachi n’obodo ya. M ga-eme ka e jiri mma agha gbuo ya ebe ahụ.”’”+  Mgbe Rabshake nụrụ na eze Asiria esila na Lekish+ pụọ, ọ laghachiri ma hụ ka ọ na-alụso ndị Libna agha.+  Mgbe eze Asiria nụrụ na Teheka eze Etiopia abịala ịlụso ya agha, o ziri ndị mmadụ ka ha gaa ọzọ na nke Hezekaya.+ Ọ sịrị ha: 10  “Gwanụ Hezekaya eze Juda, sị, ‘Ekwela ka Chineke gị, onye ị tụkwasịrị obi, duhie gị, na-asị: “A gaghị enyefe Jeruselem n’aka eze Asiria.”+ 11  Ọ̀ kwa ị nụla otú ndị eze Asiria si bibie obodo niile?+ Ọ̀ bụzi gị ka a ga-anapụta? 12  Chi mba dị iche iche nna nna m hà bibiri, hà napụtara ha? Olee ebe ndị Gozan, ndị Heran,+ ndị Rizef, na ndị Iden, bụ́ ndị biri na Tel-asa, nọ? 13  Ebee ka eze ndị Hemat, eze ndị Apad, eze obodo ndị dị na Sefaveyim, eze ndị Hina, na eze ndị Iva nọ?’”+ 14  Hezekaya wee nata ndị ahụ bịara izi ya ozi akwụkwọ ozi ndị ha ji bịa, gụọkwa ha. Ọ gaziri n’ụlọ Jehova gbasaara ha* Jehova.+ 15  Hezekaya malitekwara ikpe ekpere+ gwa Jehova, sị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel, onye nọ n’ocheeze dị n’elu* ndị cherob,+ naanị gị bụ ezi Chineke nke alaeze niile dị n’ụwa.+ Ọ bụ gị kere eluigwe na ụwa. 16  Jehova, biko, tọọ ntị n’ala nụrụ ihe a.+ Jehova, biko, meghee anya gị+ hụrụ ihe a, nụrụkwa ihe Senakerib ziri ndị mmadụ ka ha kwuo iji kwaa Chineke dị ndụ emo. 17  Jehova, nke bụ́ eziokwu bụ na ndị eze Asiria alaala mba dị iche iche na mba nke ha n’iyi.+ 18  Ha agbaakwala chi ha ọkụ n’ihi na ha abụghị ezigbo chi,+ kama ha bụ osisi na nkume, ọrụ aka mmadụ.+ Ọ bụ ya mere ha ji nwee ike ibibi ha. 19  Ma ugbu a, Jehova bụ́ Chineke anyị, biko, napụta anyị n’aka ya, ka alaeze niile dị n’ụwa mara na ọ bụ naanị gị, Jehova, bụ Chineke.”+ 20  Aịzaya nwa Emọz wee zie ozi ka a gwa Hezekaya, sị: “Jehova, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Anụla m ihe ị rịọrọ m+ gbasara Senakerib eze Asiria.+ 21  Mụnwa bụ́ Jehova ekwuola gbasara ya, sị: “Ndị bi na Zayọn* na-eleda gị anya, na-akwa gị emo. Ndị bi na Jeruselem* na-efufere gị isi. 22  Ònye ka ị kwara emo ma kwuluo?+ Ònye ka ị baara mba,+Na-elekwa anya ọjọọ? Ọ bụ Onye Nsọ Izrel.+ 23  I si n’ọnụ ndị i ziri ozi+ kwaa Jehova emo,+ sịkwa,‘M ga-eji ọtụtụ ụgbọ ịnyịnya agha mGbagoo n’ọnụ ọnụ ugwu,N’ebe ndị dị n’ime ime Lebanọn. M ruo, m ga-egbutu osisi sida ndị toro ezigbo ogologo na osisi junipa ndị kacha mma. M ga-abanye ebe dị n’ime ime na ebe kacha bụrụ oké ọhịa. 24  M ga-egwu olulu mmiri n’ala ọzọ, ṅụọkwa mmiri ya.M ga-ejikwa ọbụ ụkwụ m mee ka iyi niile dị n’Ijipt taa.’* 25  Ọ̀ bụ na ị nụbeghị ya? Ọ dịla ezigbo anya m kpebiri ime* ihe a.+ O teela m zubere ime ya.+ Ugbu a, m ga-eme ya.+ Ị ga-ebibi obodo ndị a rụsiri ike, bibichaa ha ha aghọọ ikpo nkume.+ 26  Ndị bi na ha agaghị enyeliri onwe ha aka.Ụjọ ga na-atụ ha, ihere ana-emekwa ha. Ha ga-adị ka ihe a kụrụ n’ubi na ahịhịa ndụ.+Ha ga-adịkwa ka ahịhịa dị n’elu ụlọ, nke ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ mere ka ọ kpọnwụọ. 27  Ma ama m mgbe ị nọ ọdụ, mgbe ị na-apụ apụ, mgbe ị na-abata abata,+Nakwa mgbe ị na-ewesa m iwe,+ 28  N’ihi na amatala m na ị na-ewesa m iwe.+ Anụkwala m mbigbọ ị na-ebigbọ.+ N’ihi ya, m ga-etinye nko m n’imi gị, keekwa gị eriri m ji edu ịnyịnya+ n’agbata egbugbere ọnụ gị abụọ,M ga-eduru gị gị esi n’ụzọ i si bịa laghachi.”+ 29  “‘Lekwa ihe ị* ga-eji ama na ihe ndị a ga-emerịrị: N’afọ a, unu ga-eri ọka wit ndị puuru onwe ha.* N’afọ nke abụọ, unu ga-erikwa ọka wit ndị puuru onwe ha.+ Ma n’afọ nke atọ, unu ga-akụ ọka wit, ghọrọkwa mkpụrụ ya, kọọ ubi vaịn, riekwa ihe si na ya.+ 30  Ndị fọrọ ndụ+ ná ndị Juda ga-agbanye mgbọrọgwụ n’ala ka osisi, mịakwa mkpụrụ. 31  N’ihi na ndị fọdụrụ ga-esi na Jeruselem pụta. Ndị fọrọ ndụ ga-esikwa n’Ugwu Zayọn pụta. Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-eji ịnụ ọkụ n’obi mee ihe a.+ 32  “‘N’ihi ya, Jehova kwuru gbasara eze Asiria,+ sị: “Ọ gaghị abata n’obodo a.+Ọ gaghịkwa agba otu akụ́ n’ime ya.Ọ gaghị eji ọta bịa lụso ya agha.Ọ gaghịkwa eji ájá rụọ mgbidi ga-agba obodo a gburugburu iji lụso ya agha.+ 33  Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi,Ọ gaghịkwa abata n’obodo a.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 34  “M ga-echebe obodo a,+ zọpụtakwa ya, n’ihi aha m+Nakwa n’ihi Devid ohu m.”’”+ 35  N’abalị ahụ, mmụọ ozi Jehova gara n’ebe ndị Asiria mara ụlọikwuu gbuo otu narị puku mmadụ na puku iri asatọ na puku ise (185,000).+ Mgbe ndị mmadụ biliri n’isi ụtụtụ, ha hụrụ ozu ndị ahụ niile e gburu.+ 36  Mgbe ihe a mechara, Senakerib eze Asiria laghachiri Ninive,+ nọrọkwa ebe ahụ.+ 37  Ka ọ nọ na-akpọ isiala n’ụlọ chi ya bụ́ Nisrọk, ụmụ ya, bụ́ Adramelek na Shariza, weere mma agha gbuo ya+ ma gbaga Ararat.+ Isa-hadọn+ nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “obí.”
Ma ọ bụ “mkparị.”
Na Hibru, “E nwere mmụọ m ga-etinye n’ime ya.”
Na Hibru, “ya.”
O nwere ike ịbụ, “n’etiti.”
Na Hibru, “Ada na-amaghị nwoke bụ́ Zayọn.”
Na Hibru, “Ada bụ́ Jeruselem.”
Ma ọ bụ “ọwa mmiri niile nke Osimiri Naịl Ijipt taa.”
Na Hibru, “m mere.”
Ya bụ, Hezekaya.
Ma ọ bụ “ihe ọka wit ndị dapụrụ adapụ mịrị.”