Ndị Eze nke Abụọ 18:1-37

  • Hezekaya malitere ịchị Juda (1-8)

  • Otú e si dọrọ ndị Izrel n’agha (9-12)

  • Senakerib lụsoro Juda agha (13-18)

  • Rabshake mara Jehova aka (19-37)

18  N’afọ nke atọ n’ọchịchị Hoshia+ nwa Ịla eze Izrel, Hezekaya+ nwa Ehaz+ eze Juda malitere ịchị.  Ọ dị afọ iri abụọ na ise mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri abụọ na itoolu na Jeruselem. Aha nne ya bụ Ebaị* nwa Zekaraya.+  Ọ nọ na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova+ otú Devid nna nna ya mere.+  Ọ bụ ya wepụrụ ebe ndị dị elu,+ kụrisịa ogidi arụsị, gbutusịakwa ogwe osisi arụsị.*+ Ọ kụrisịkwara agwọ ọla kọpa Mosis kpụrụ,+ n’ihi na tupu mgbe ahụ, ndị Izrel nọ na-achụrụ ya àjà a na-esu ọkụ. Ha nọkwa na-akpọ ya arụsị agwọ ọla kọpa.*  Ọ tụkwasịrị Jehova bụ́ Chineke Izrel obi.+ E nweghị eze chịrị Juda dị ka ya, ma ndị nke chịrị mgbe ọ nwụchara ma ndị nke bu ya ụzọ chịa.  O jisiri Jehova aka ike.+ Ọ kwụsịghị iso ya. Ọ nọkwa na-edebe iwu Jehova nyere Mosis.  Jehova nọnyekwaara ya. Ọ na-akpa àgwà onye ma ihe ebe ọ bụla o jere. O nupụụrụ eze Asiria isi, jụkwa ijere ya ozi.+  O meriri ndị Filistia,+ merigide ha ruo Gaza na obodo ndị dị ya nso, malite n’ụlọ nche ruo n’obodo a rụsiri ike.*  N’afọ nke anọ n’ọchịchị Eze Hezekaya, ya bụ, n’afọ nke asaa n’ọchịchị Hoshia+ nwa Ịla eze Izrel, Shalmaniza eze Asiria bịara ịlụso Sameria agha, malitekwa ịnọchibido ya.+ 10  Ndị Asiria weghakwaara ya+ mgbe ọ fọrọ obere ka o ruo afọ atọ ha nọchibidoro ya. Ọ bụ n’afọ nke isii n’ọchịchị Hezekaya, ya bụ, n’afọ nke itoolu n’ọchịchị Hoshia eze Izrel, ka ha weghaara Sameria. 11  Eze Asiria mechakwara dọrọ ndị Izrel n’agha laa+ Asiria. Ọ hapụrụ ha ka ha biri na Hela na Hebọ, nke dị n’akụkụ osimiri Gozan, nakwa n’obodo dị iche iche ndị Midia nwe.+ 12  Ihe a mere ha maka na ha egeghị Jehova bụ́ Chineke ha ntị, kama ha nọ na-emebi ọgbụgba ndụ ya, ya bụ, iwu niile Mosis bụ́ ohu Jehova nyere.+ Ha egeghị ntị, ha erubeghịkwa isi. 13  N’afọ nke iri na anọ n’ọchịchị Eze Hezekaya, Senakerib eze Asiria+ bịara ịlụso obodo niile a rụsiri ike na Juda agha ka o weghara ha.+ 14  Hezekaya eze Juda wee zie eze Asiria ozi na Lekish, sị: “Ọ bụ m mejọrọ ihe. Laghachi, alụsola m agha. M ga-enye gị ihe ọ bụla ị ga-asị m nye gị.” Eze Asiria wee gwa Hezekaya eze Juda ka ọ kwụọ ya narị talent* ọlaọcha atọ (300) na talent ọlaedo iri atọ. 15  N’ihi ya, Hezekaya nyere ya ọlaọcha niile dị n’ụlọ Jehova nakwa ndị nke dị n’ebe a na-edowe akụ̀ n’ụlọ* eze.+ 16  N’oge ahụ, Hezekaya eze Juda wepụtara* ibo ụzọ ndị dị n’ụlọ nsọ+ Jehova, wepụtakwa awara ụzọ ndị yanwa ji ọlaedo machie,+ buru ha bunye eze Asiria. 17  Eze Asiria wee si na Lekish+ zie ndị mmadụ ka ha gaa Jeruselem hụ Eze Hezekaya.+ Ndị ahụ o ziri ozi bụ Tatan,* Rabsaris,* Rabshake,* na ọtụtụ ndị agha. Mgbe ha rutere Jeruselem, ha gara guzoro n’akụkụ okpo mmiri nke ọdọ mmiri dị n’ebe mgbago. Ọdọ mmiri ahụ dị n’ụzọ e si aga ebe ndị ọsụ ákwà na-anọ asụ ákwà.+ 18  Mgbe ha ziri ozi ka a kpọọrọ ha eze, Elayakim+ nwa Hilkaya, bụ́ onye na-elekọta ezinụlọ* eze, Shebna+ bụ́ odeakwụkwọ, na Joa nwa Esaf, bụ́ onye na-edekọ ihe, gakwuuru ha. 19  Rabshake wee sị ha: “Biko, gwanụ Hezekaya, sị, ‘Eze ukwu, bụ́ eze Asiria, sịrị: “Gịnị kara gị obi?+ 20  Ị na-asị, ‘M nwere ndị agha ga-alụ agha a. M haziekwala otú m ga-esi alụ ya.’ Ma, ihe ị na-agba bụ égbè ọnụ. Ònye ka ị tụkwasịrị obi, mere obi ji kaa gị gị enupụrụ m isi?+ 21  Ndị ị tụkwasịrị obi na ha ga-enyere gị aka bụ ndị Ijipt,+ ndị dị ka ahịhịa amị huuru ehuru, nke ọ na-abụ mmadụ jide aka, ya agbajie, dụpuo onye ahụ aka. Otú ahụ ka Fero eze Ijipt na-eme ndị niile tụkwasịrị ya obi. 22  Ọ bụrụkwanụ na unu asị m na unu tụkwasịrị Jehova bụ́ Chineke unu obi,+ ọ́ bụghị ya bụ onye Hezekaya wepụrụ ebe ndị dị elu a rụụrụ ya nakwa ebe ịchụàjà ya,+ ma gwa ndị Juda na ndị bi na Jeruselem, sị, ‘N’ihu ebe ịchụàjà nke a dị na Jeruselem ka unu ga na-akpọ isiala’?”’+ 23  Biko, gị na onyenwe m bụ́ eze Asiria tie n’aka, ka m nye gị puku ịnyịnya abụọ (2,000) lee ma mmadụ ole i nwere na-agba ịnyịnya hà ga-ezu ịgba ha.+ 24  Ebe ị tụkwasịrị ndị Ijipt obi na ha ga-enye gị ụgbọ ịnyịnya na ndị na-agba ịnyịnya, oleezi otú ị ga-esi nwee ike ịchụghachi otu gọvanọ azụ, ọ bụrụgodị otu n’ime ndị gọvanọ a na-anaghị anụ aha ha na-ejere onyenwe m ozi? 25  Ọ́ bụghị Jehova nyere m ikike ịbịa lụso obodo a agha ma bibie ya? Ọ bụ Jehova sịrị m, ‘Gaa lụso obodo a agha, bibiekwa ya.’” 26  Elayakim nwa Hilkaya na Shebna+ nakwa Joa gwaziri Rabshake,+ sị: “Biko, gwawa ndị ohu gị okwu n’asụsụ Arameik,*+ n’ihi na anyị na-anụ ya. Agwala anyị okwu n’asụsụ ndị Juu n’ihi na ndị a nọ n’elu mgbidi na-anụ ya.”+ 27  Ma Rabshake sịrị ha: “Ọ̀ bụ naanị unu na onyenwe unu ka onyenwe m ziri m ka m gwa ihe ndị a? Ndị a nọ ọdụ n’elu mgbidi sokwa. Unu na ha ga-eri nsị unu, ṅụọkwa mamịrị unu.” 28  Rabshake wee kwụrụ na-ekwu okwu n’oké olu n’asụsụ ndị Juu, sị: “Nụrụnụ ihe eze ukwu, bụ́ eze Asiria, kwuru.+ 29  Eze kwuru, sị: ‘Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu, n’ihi na ọ gaghị anapụtali unu n’aka m.+ 30  Unu ekwekwala ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị Jehova obi mgbe ọ na-agwa unu, sị: “Jehova ga-anapụtarịrị anyị. A gaghịkwa enyefe obodo a n’aka eze Asiria.”+ 31  Unu egela Hezekaya ntị, n’ihi na eze Asiria kwuru, sị: “Chịlierenụ m aka elu ka mụ na unu mee udo, onye ọ bụla n’ime unu ga na-erikwa ihe si n’osisi vaịn ya na ihe si n’osisi fig ya, na-aṅụkwa mmiri si n’olulu mmiri ya, 32  ruo mgbe m ga-abịa kpọrọ unu laa n’ala dị ka ala unu.+ Ọka,* mmanya ọhụrụ, achịcha, ubi vaịn, osisi oliv, na mmanụ aṅụ juru n’ala ahụ. Unu ga-adịrịkwa ndụ na-aga, unu agaghịkwa anwụ. Unu egekwala Hezekaya ntị, n’ihi na ọ na-arafu unu, na-asị, ‘Jehova ga-anapụta anyị.’ 33  Ò nweela chi ọ bụla n’ime chi mba dị iche iche napụtara ala ya n’aka eze Asiria? 34  Olee ebe chi niile ndị Hemat+ na ndị Apad na-efe nọ? Olee ebe chi niile ndị Sefaveyim,+ ndị Hina, na ndị Iva na-efe nọ? Hà napụtara Sameria n’aka m?+ 35  Ole nke n’ime chi niile obodo ndị a na-efe napụtara obodo ha n’aka m, nke mere Jehova ga-eji napụta Jeruselem n’aka m?”’”+ 36  Ma ha gbachiri nkịtị. Ha agwaghịkwa ya ihe ọ bụla, n’ihi na eze gwara ha, sị: “Unu atụpụrụla ya ọnụ.”+ 37  Ma Elayakim nwa Hilkaya, onye na-elekọta ezinụlọ* eze, Shebna bụ́ odeakwụkwọ, na Joa nwa Esaf, bụ́ onye na-edekọ ihe, dọwara uwe ha ma bịakwute Hezekaya, gwa ya ihe Rabshake kwuru.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ebaị bụ aha mkpọbiri Abaịja.
Ma ọ bụ “Nehushtan.”
Ya bụ, n’ebe niile, ma ebe ndị mmadụ na-ebichaghị ma ebe ndị mmadụ bijuru.
Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “n’obí.”
Na Hibru, “gbukapụrụ.”
Ma ọ bụ “onyeisi ndị agha.”
Ma ọ bụ “onyeisi ndị na-eje ozi n’obí eze.”
Ma ọ bụ “onyeisi ndị na-ebutere eze ihe ọ na-aṅụ.”
Ma ọ bụ “obí.”
Ma ọ bụ “ndị Siria.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “obí.”