Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ 11:1-47

  • Ndị Izrel niile chiri Devid eze (1-3)

  • Devid weghaara Zayọn (4-9)

  • Ndị agha Devid bụ́ ndị dike n’agha (10-47)

11  Ka oge na-aga, ndị Izrel niile zukọrọ bịakwute Devid na Hebrọn,+ sị ya: “Anyị na gị bụ otu ọbara.*+  N’oge gara aga, mgbe Sọl bụ eze, ọ bụ gị na-edu ndị Izrel aga agha.*+ Jehova bụ́ Chineke gị gwakwara gị, sị: ‘Ọ bụ gị ga-azụ ndị m Izrel dị ka atụrụ. Ọ bụkwa gị ga-abụ onye ndú ndị m Izrel.’”+  Ndị okenye niile n’Izrel wee bịakwute eze Devid na Hebrọn. Ha na ya anọrọ ebe ahụ gbaa ndụ n’ihu Jehova. Ha tekwara Devid mmanụ ka ọ bụrụ eze Izrel+ otú Jehova si n’ọnụ Samuel kwuo.+  E mechaa, Devid na ndị Izrel niile gara Jeruselem, ya bụ, Jebus,+ ebe ndị Jebus+ bi.  Ndị bi na Jebus mara Devid aka, sị ya: “I mekataghị bata ebe a.”+ Ma, Devid weghaara Zayọn, bụ́ obodo a rụsiri ike,+ nke a na-akpọzi Obodo Devid+ ugbu a.  Devid sịkwara: “Onye ọ bụla ga-ebu ụzọ lụso ndị Jebus agha ga-abụ onyeisi ndị agha.” Joab+ nwa Zeruya bukwa ụzọ gaa lụso ha agha. Ọ ghọkwara onyeisi ndị agha.  Devid wee biri n’ebe a rụsiri ike. Ọ bụ ya mere ha ji kpọọ ebe ahụ Obodo Devid.  O bidokwara ịrụ mgbidi na ihe ndị ọzọ n’obodo ahụ, ma na Milo* ma n’ebe ndị dị ya nso. Joab rụzikwara ebe ndị fọrọnụ n’obodo ahụ.  Devid nọkwa na-esikwu ike.+ Jehova nke ụsụụ ndị agha nọnyekwaara ya. 10  E nwere ndị bụ́ ndị isi ndị dike bụ́ ndị agha Devid. Ha na ndị Izrel niile kwadoro ya mgbe ọ na-achị. Ha nyere aka chie ya eze otú Jehova gwara ndị Izrel.+ 11  Ndị a bụ aha ndị dike bụ́ ndị agha Devid: Jashobiam,+ onye si n’agbụrụ Hakmọnaị, onyeisi ndị dike atọ.+ E nwere mgbe o ji ube ya gbuo narị mmadụ atọ (300) otu mgbe.+ 12  Onye na-esote ya bụ Elieza+ nwa Dodo nwa Ahohaị.+ Ọ bụ otu n’ime ndị dike atọ bụ́ ndị agha Devid. 13  Ya na Devid nọ na Pas-damim+ mgbe ha na ndị Filistia lụrụ agha. E nwere ala ọka bali juru na ya, ma ndị Izrel gbara ọsọ n’ihi ndị Filistia. 14  Ma ọ kwụụrụ n’etiti ala ahụ na-egbu ndị Filistia, napụtakwa ha ala ahụ. Otú a ka Jehova si mee ka ndị Izrel merie n’agha ahụ.*+ 15  Mmadụ atọ n’ime mmadụ iri atọ bụ́ ndị isi gakwuuru Devid n’ọgba Adọlam+ dị n’otu ugwu. Ma, ndị agha Filistia mara ụlọikwuu na Ndagwurugwu Refeyim.+ 16  N’oge ahụ, Devid nọ ebe a rụsiri ike. Ebe ndị agha Filistia na-anọ eche nche dịkwa na Betlehem. 17  Devid sịrị: “Obi ga-adị m ụtọ ma m ṅụọ mmiri si n’olulu mmiri dị nso n’ọnụ ụzọ ámá Betlehem.”+ 18  Mgbe o kwuchara ihe a, mmadụ atọ ahụ banyere ebe ndị Filistia mara ụlọikwuu, sere mmiri n’olulu mmiri ahụ dị nso n’ọnụ ụzọ ámá Betlehem, butekwara ya Devid. Ma o kweghị aṅụ ya, kama ọ wụsaara ya Jehova n’ala. 19  Ọ sịkwara: “Tụfịakwa! Agaghị m aṅụ mmiri a n’ihi na m na-atụ egwu Chineke m. Olee ihe mere m ga-eji ṅụọ ọbara ụmụ nwoke a gaara anwụ+ ebe ha gara iseta mmiri? Ha gaara anwụ n’ihi ihe a ha mere.” N’ihi ya, o kweghị aṅụ ya. Ihe a ka ndị dike atọ ahụ so ná ndị agha ya mere. 20  Abishaị+ nwanne Joab+ bụ onyeisi ndị dike atọ ọzọ. E nwere mgbe o ji ube ya gbuo narị mmadụ atọ (300). Aha ya na-edekwa ude ka nke ndị dike atọ mbụ ahụ.+ 21  A bịa ná ndị dike atọ nke ọzọ ahụ, a na-akwanyere ya ùgwù karịa mmadụ abụọ n’ime ha. Ọ bụkwa onyeisi ha, ma ọ harughị ka ndị dike atọ mbụ ahụ. 22  Benaya,+ nwa Jehoyada, bụ nwoke obi kara.* O mere ọtụtụ ihe na Kabzil.+ O gburu ụmụ nwoke abụọ Ariel onye Moab mụrụ. Ọ bụkwa ya banyere n’olulu mmiri gbuo ọdụm n’otu ụbọchị snoo na-ada.+ 23  Ọ bụkwa ya gburu otu nwoke Ijipt gbara ajọ dimkpa. Nwoke ahụ dị kubit ise n’ogologo.*+ N’agbanyeghị na nwoke Ijipt ahụ ji ube yiri okporo osisi ndị na-ekwe ákwà,+ yanwa ji mkpara gakwuru ya, napụta ya ube ya ahụ, jirikwa ya gbuo ya.+ 24  Ihe ndị a ka Benaya nwa Jehoyada mere. Aha ya na-edekwa ude ka nke mmadụ atọ ahụ bụ́ dike n’agha. 25  Ọ bụ eziokwu na a na-akwanyere ya ùgwù karịa ndị agha iri atọ ahụ bụ́ ndị isi, ọ harughị ka ndị dike atọ ahụ.+ Ma, Devid họpụtara ya ka ọ bụrụ onye nche ya. 26  Ndị a bụ ndị dike bụ́ ndị agha Devid: Asahel+ nwanne Joab, Elhenan nwa Dodo onye Betlehem,+ 27  Shamọt onye Herọraịt, Hilez onye Pelọnaịt, 28  Aịra+ nwa Ikesh onye Tekoa, Abi-iza+ onye Anatọt, 29  Sibekaị+ onye Husha, Aịlaị onye Ahohaị, 30  Meharaị+ onye Netofa, Hiled+ nwa Beana onye Netofa, 31  Aịtaị nwa Raịbaị onye Gibia nke dị n’ebo Benjamin,+ Benaya onye Piratọn, 32  Huraị onye si na ndagwurugwu* Geash,+ Abayel onye Bet-araba, 33  Azmavet onye Bahurim, Elayaba onye Shealbim, 34  ụmụ Heshem onye Gimzo, Jonatan nwa Shegi onye Hararaịt, 35  Ahayam nwa Seka onye Hararaịt, Elaịfal nwa Ọọ, 36  Hifa onye Mekira, Ahaịja onye Pelọnaịt, 37  Hezro onye Kamel, Nearaị nwa Ezbaị, 38  Joel nwanne Netan, Mibha nwa Hagraị, 39  Zilek onye Amọn, Neharaị onye Bierọt, bụ́ onye na-eburu Joab nwa Zeruya ngwá agha, 40  Aịra onye Itraịt, Gereb onye Itraịt, 41  Yuraya+ onye Het, Zebad nwa Alaị, 42  Adina nwa Shaịza onye si n’ebo Ruben. Ọ bụ ya bụ onyeisi ụmụ Ruben. Mmadụ iri atọ nọ n’okpuru ya. 43  Ndị ọzọkwa bụ Henan nwa Meaka, Joshafat onye Mitnaịt, 44  Ọzaya onye Ashtarọt, Shema na Jeayel, ụmụ Hotam onye Aroa. 45  Ndị ọzọkwa bụ Jedayel nwa Shimraị, nakwa Joha nwanne ya bụ́ onye Taịzaịt, 46  Iliel onye Mehavaịt, Jeribaị na Jọshavaya bụ́ ụmụ Elneam, Itma onye Moab, 47  Iliel, Obed, na Jaasayel onye Zoba.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “otu ọkpụkpụ na otu anụ ahụ́.”
Na Hibru, “ọ bụ gị na-edu Izrel apụ ma na-edu ha alọta.”
Hibru, “mil·loh.” Ọ pụtara “ebe e kpojuru ájá, ya adị mkputamkpu.”
Ma ọ bụ “si zọpụta ndị Izrel.”
Na Hibru, “nwa otu nwoke obi kara.”
Ọ dị ihe dị ka mita 2.23 n’ogologo (amaụkwụ 7.3). Gụọ B14.