Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị Tesalonaịka 4:1-18

  • A dọrọ aka ná ntị banyere ịkwa iko (1-8)

  • Na-ahụkwunụ ibe unu n’anya karịa otú unu na-eme (9-12)

    • ‘Unu etinyela anya n’ihe na-agbasaghị unu’ (11)

  • A ga-ebu ụzọ kpọlite ndị ha na Kraịst dị n’otu (13-18)

4  N’ikpeazụ, ụmụnna anyị, anyị akụzierela unu otú unu kwesịrị isi na-ebi ndụ dị Chineke mma,+ unu na-emekwa otú ahụ n’eziokwu. Ugbu a, anyị na-arịọ unu ma na-agba unu ume n’aha Onyenwe anyị Jizọs ka unu na-emekwu otú ahụ karịa ka unu na-eme.  N’ihi na unu ma ntụziaka* ndị anyị nyere unu n’aha Onyenwe anyị Jizọs.  N’ihi na ihe Chineke chọrọ bụ ka unu na-adị nsọ+ ma ghara ịna-akwa iko.*+  Onye ọ bụla n’ime unu kwesịrị ịma otú ọ ga-esi na-ejide ahụ́* ya,+ ka ahụ́* ya wee dị nsọ+ ma dị ùgwù,  ọ bụghị ime ka mba ndị na-amaghị Chineke,+ bụ́ ndị anyaukwu na-eme ka ha ghara ijide onwe ha ma agụụ mmekọahụ gụwa ha.+  Ka onye ọ bụla ghara ịrụsa nwanna ya arụrụala ma ọ bụ mee ya ihe ọjọọ n’ihe a, n’ihi na Jehova* na-ata ndị na-eme ihe ndị a niile ahụhụ. Anyị gwaburu unu ihe a ma dọsie unu aka ná ntị ike maka ya.  N’ihi na Chineke kpọrọ anyị ka anyị dị nsọ, ọ bụghị ka anyị biwe ndụ na-adịghị ọcha.+  N’ihi ya, onye na-eleda ndụmọdụ a anya anaghị eleda mmadụ anya, kama ọ bụ Chineke,+ onye na-enye unu mmụọ nsọ ya,+ ka ọ na-eleda anya.  Ma, ọ dịghị mkpa ka anyị detara unu akwụkwọ ozi ka unu hụ ibe unu n’anya ka ụmụnne,+ n’ihi na Chineke na-akụziri unu ka unu na-ahụ ibe unu n’anya.+ 10  N’eziokwu, unu hụrụ ụmụnna niile nọ na Masedonia niile n’anya otú ahụ. Ma anyị na-agba unu ume, ụmụnna anyị, ka unu na-ahụkwu ibe unu n’anya karịa otú unu na-eme. 11  Gbalịanụ ka unu na-ebi n’udo,+ ghara ịna-etinye anya n’ihe na-agbasaghị unu,+ kama na-arụnụ ọrụ.+ Ọ bụ ihe anyị kụziiri unu. 12  Ime otú a ga-eme ka ndị nọ n’èzí hụ na unu na-ebi ndụ dị mma,+ a gharakwa inwe ihe na-akpa unu. 13  Ụmụnna anyị, anyị chọrọ ka unu mata ihe a ga-emere ndị nwụrụ anwụ,*+ ka unu wee ghara ịna-eru uju otú ndị na-enweghị olileanya si eru.+ 14  N’ihi na ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe na Jizọs nwụrụ, e si n’ọnwụ kpọlite ya,+ anyị nwekwara okwukwe na Chineke ga-akpọlite ndị ha na Jizọs dị n’otu, bụ́ ndị nwụrụ anwụ.*+ 15  N’ihi na anyị na-agwa unu ihe Jehova* kwuru, na anyị ndị ga-adị ndụ n’oge ọnụnọ Onyenwe anyị agaghị ebu ndị nwụrụ anwụ* ụzọ gaa eluigwe; 16  n’ihi na Onyenwe anyị ga-esi n’eluigwe gbadata. Ọ ga-eji olu dara ụda kpọọ òkù, bụ́ olu onyeisi ndị mmụọ ozi,+ jirikwa opi Chineke. Ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị ha na Kraịst dị n’otu ga-ebukwa ụzọ bilie.+ 17  E mechaa, a ga-eme ka anyị ndị dị ndụ gaa n’ígwé ojii, ka anyị na ha zute Onyenwe anyị+ na mbara igwe;+ anyị na Onyenwe anyị ga-anọzi mgbe niile.+ 18  N’ihi ya, jirinụ okwu ndị a na-akasi ibe unu obi.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “iwu.”
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “arịa.”
Na Grik, “arịa.”
Gụọ A5.
Na Grik, “mata banyere ndị na-ehi ụra ọnwụ.”
Na Grik, “ndị na-ehi ụra ọnwụ.”
Gụọ A5.
Na Grik, “ndị na-ehi ụra ọnwụ.”